2 Crónicas 25
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Amazaya eze Juda
1Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze, ọ chịrị dịka eze iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Nne ya bụ Jehoadin onye Jerusalem. 2O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ma o jighị obi ya niile mee nke a. 3Mgbe alaeze guzosiri ike nʼokpuru ọchịchị ya, o gburu ndị ozi ahụ gburu eze, bụ nna ya. 4Ma o meghị ka ụmụ ha nwụọ, kama ọ gbasoro usoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe Onyenwe anyị nyere iwu sị: “Ndị mụrụ ụmụ agaghị anwụ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.”
5Amazaya kpọkọtara ndị Juda, guzo ha dịka ezinaụlọ ha si dị, kenye ha nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndị na-achị ọtụtụ narị ndị agha, bụ ndị Juda na ndị Benjamin niile. Mgbe ọ gụrụ ndị dị afọ iri abụọ maọbụ karịa ọnụ, ọ chọpụtara na ha dị narị puku ndị ikom atọ ndị tozuru iji ùbe na ọta buo agha. 6O ji narị talenti ọlaọcha gota narị puku ndị agha site nʼala Izrel.
7Ma otu onye nke Chineke bịakwutere ya, sị ya; “Eze, ka ndị agha a si Izrel ghara isonyere gị, nʼihi na Onyenwe anyị anọnyereghị ndị Izrel, ọ nọnyereghị onye ọbụla sitere nʼIfrem. 8A sịkwarị na i jiri obi dimkpa ga agha a, Chineke ga-eme ka ndị iro gị merie gị, nʼihi na Chineke bụ onye nwere ike inyere mmadụ aka maọbụ ime ka ọ sụọ ngọngọ.”
9Amazaya sịrị onye nke Chineke ahụ, “Gịnị kwanụ ka anyị ga-eme banyere narị ego talenti m kwụrụ maka ndị agha Izrel?”
Onye nke Chineke ahụ zara, “ Onyenwe anyị pụrụ inye gị karịa nke ahụ.”
10Amazaya zighachiri ndị agha Izrel ahụ azụ ka ha laa, bụ ndị a si nʼIfrem bịakwute ya. Ha were iwe nke ukwuu megide Juda, jirikwa oke iwe laghachi nʼụlọ ha.
11Amazaya duuru ndị agha ya gaa na Ndagwurugwu Nnu, ebe o gburu ndị ikom Sia dị puku iri. 12Ndị agha Juda nwudoro puku ndị ikom iri ọzọ na ndụ, duru ha gaa nʼelu nkume dị elu, si nʼebe ahụ tụda ha niile, nke mere na ha niile kụpịasịrị.
13Ma ndị agha ahụ Amazaya zilagara, ka ha ghara iso ya gaa agha, wakporo ọtụtụ obodo ndị Juda site na Sameria ruo Bet-Horon. Ha gburu puku mmadụ atọ nʼime ha, bukọrọkwa ọtụtụ ihe nkwata nʼagha, buru ha laa.
14Mgbe Amazaya sitere nʼagha ebe o gburu ọtụtụ ndị Edọm lọta, o bulatara chi nke ndị Sia. O guzobere ha dịka chi ndị nke aka ya, kpọọ isiala nye ha ma surekwa aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ha. 15Iwe Onyenwe anyị dị ukwuu megide Amazaya. O zigaara ya onye amụma, onye sịrị, “Nʼihi gịnị ka iji ajụ ase site nʼaka chi nke ndị ahụ, bụ ndị na-enweghị ike ịzọpụta ndị ha site nʼaka gị?”
16Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ ya, eze sịrị ya; “Mechie ọnụ! Ị chọrọ ịnwụ? Ole mgbe ka anyị mere gị onye na-adụ eze ọdụ?”
Ya mere, onye amụma ahụ kwụsịrị, ma sị, “Amaara m na Chineke ekpebiela ịla gị nʼiyi, nʼihi na i mere nke a ma jụkwa ige ntị na ndụmọdụ m.”
17Emesịa, mgbe Amazaya, eze Juda gbachara izu ya na ndị ndụmọdụ ya, o zigara Jehoash nwa Jehoahaz, nwa Jehu, eze Izrel ozi ịma aka, sị, “Bịa ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.”
18Ma Jehoash eze Izrel, zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda, sị; “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ zọpịa uke ahụ. 19Ị na-asị onwe gị, na i meriela Edọm, ugbu a, mpako abatala, isi a na-ebu gị. Ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?”
20Ma Amazaya egeghị ntị, nʼihi na Chineke na-akwado inyefe ya nʼaka Jehoash onye iro ha, nʼihi na ha chọrọ chi ndị Edọm gawa. 21Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha. Ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda. 22Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya. 23Jehoash, bụ eze Izrel nwudere Amazaya eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash duuru ya bịa na Jerusalem, kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii. 24Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu Chineke, nke e tinyere nʼaka Obed-Edọm ilekọta, tinyekwara akụ niile dị nʼụlọeze. Ọ dọọrọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria.
25Amazaya nwa Joash, eze Juda nọrọ ndụ afọ iri na ise, mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel nwụsịrị. 26Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amazaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel? 27Site nʼoge Amazaya gbakụtara Onyenwe anyị azụ, ha gbara izuzu imegide ya nʼime Jerusalem. Ọ gbapụrụ gbalaga Lakish, ma ha zipụrụ ndị ikom chụụrụ ya gaa Lakish, gbuo ya nʼebe ahụ. 28Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya nʼebe e liri nna nna ya ha nʼobodo Juda.

¿Sabías que…?
El reinado de Amasías
- Cuando el rey Amasías ejecutó a los siervos que habían asesinado a su padre, perdonó a sus hijos, citando la Ley en el Libro de Moisés que establece que cada persona debe morir únicamente por su propio pecado.Fuentes: el propio texto bíblico · Amaziah
- Amasías fue el primer rey de Judá registrado en contratar un ejército mercenario de 100.000 soldados del reino de Israel. Tras despedirlos por orden de un profeta, las tropas descontentas saquearon ciudades de Judá desde Samaria hasta Bet-horón.Fuentes: el propio texto bíblico · Amaziah · Beth-horon
- Después de derrotar a los edomitas en el Valle de la Sal, Amasías desafió al rey Joás de Israel, quien le advirtió mediante la fábula de un cardo que pedía alianza a un cedro del Líbano antes de ser pisoteado por una fiera.Fuentes: el propio texto bíblico · Joash · Valley of Salt
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 1, 23, 27
- Beth-horon · Hoy: Beit Ur al Tahta · 31.895, 35.084 · versículo 13
- Samaria · 32.276, 35.195 · versículos 13, 24
- Lebanon · 33.540, 35.584 · versículo 18
- Edom · 30.746, 35.604 · versículos 19, 20
- Corner Gate · Hoy: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 23
- Ephraim Gate · Hoy: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 23
- Lachish · Hoy: Tell ed Duweir · 31.565, 34.849 · versículo 27
- City of David · 31.774, 35.236 · versículo 28
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org