2 Crónicas 24
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Joash edozie ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị
1Joash gbara afọ asaa mgbe e mere ya eze, ọ chịrị iri afọ anọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zibịa onye Bịasheba. 2Joash mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị nʼafọ niile nke Jehoiada bụ onye nchụaja, dị ndụ. 3Jehoiada lụtaara ya ndị inyom abụọ, ndị mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
4Mgbe ihe ndị a gasịrị, Joash kpebiri ime ka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị ọhụrụ. 5Ọ kpọkọtara ndị nchụaja na ndị Livayị niile sị ha, “Gaanụ nʼobodo Juda niile nakọta ego ụtụ afọ nʼaka ndị Izrel niile, maka iwuzi ụlọnsọ Chineke unu. Meenụ ya ugbu a.” Ma ndị Livayị emeghị ya ngwangwa.
6Ya mere, eze kpọrọ Jehoiada bụ onyeisi nchụaja sị ya, “Gịnị mere i mebeghị ka ndị Livayị gaa nakọtaa, site nʼaka ndị bi nʼobodo Juda niile, na nʼobodo Jerusalem, ego ụtụ nke Mosis ohu Onyenwe anyị na ọgbakọ ụmụ Izrel nyere nʼiwu maka ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ?”
7Nʼoge a ụmụ ndị ikom Atalaya, nwanyị ọjọọ ahụ tipuru ụlọnsọ Chineke, bukọrọ ihe nsọ niile e ji efe Onyenwe anyị dị nʼime ya maka Baal.
8Ya mere, eze nyere iwu ka e wuo igbe onyinye, nke a ga-adọba nʼọnụ ụzọ e si abanye ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 9A kpọsara ya na Juda na Jerusalem niile sị ka ha wetara Onyenwe anyị ụtụ nke Mosis ohu Chineke kwagidere ụmụ Izrel nʼọzara na ha ga na-atụ. 10Ndịisi na ndị mmadụ niile jiri obi ụtọ tụta ụtụ ha. Ha jiri onyinye ha bịa tụnye ha nʼigbe onyinye ahụ, tutu rụọ mgbe o juru nʼọnụ. 11Mgbe ọbụla ndị Livayị bubataara ndị ozi eze igbe ahụ, ha hụ na-atụjuola ya ego, ode akwụkwọ eze ya na onyeozi nke onyeisi nchụaja ga-awụpụta ihe dị nʼigbe, ma bughachi okpokoro igbe ahụ nʼọnọdụ ya. Otu a ka ha mere ọtụtụ oge ruo mgbe ha nwetara ọtụtụ ego dị ukwuu. 12Eze na Jehoiada weere ego ahụ niile nyefee ha nʼaka ndị ọrụ ụlọ Onyenwe anyị dị nʼaka, ha chọtara ndị ọka na-edo nkume, na ndị ọkpọ ǹtu. Ha tinyere ọrụ ime ka ụlọnsọ ahụ dị ọhụrụ nʼaka ndị a. Ha gokwara ndị ụzụ bịara kpụọ ihe niile gbasara bronz na igwe e ji rụọ ọrụ ahụ.
13Ndị e nyefere ọrụ ahụ nʼaka ji obi ha niile rụọ ọrụ nke mere na ọrụ ahụ gara nʼihu nke ọma. Ha rụziri ụlọnsọ ukwu Chineke dịka atụmatụ ya mbụ si dị, meekwa ya ka o sie ike karịa. 14Mgbe ha rụsịrị ọrụ niile, ha weghachitere ego fọdụrụ, nye ya eze na Jehoiada, ha were ya rụta ngwa ije ozi maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, ngwa ije ozi na ihe isure aja nsure ọkụ, na ngaji, ya na efere dị iche iche, na ihe ọlaọcha na ọlaedo. A na-achụ aja nsure ọkụ nʼụlọnsọ nye Onyenwe anyị ụbọchị niile Jehoiada dị ndụ.
15Ma Jehoiada mere nnọọ agadi, jupụtakwa nʼọtụtụ afọ, ọ nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri afọ atọ. 16E liri ya nʼebe a na-eli ndị eze nʼobodo Devid nʼihi ihe ọma niile o meere Izrel na Chineke na ụlọnsọ ya.
Ajọọ omume Joash
17Mgbe Jehoiada nwụsịrị, ndịisi Juda bịara ịkwanyere eze Joash ugwu. O gekwara ha ntị. 18Ha hapụrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna ha, fee ogidi Ashera na arụsị ndị ọzọ. Nʼihi ikpe ọmụma ha wetaara onwe ha, iwe Chineke dakwasịrị Juda na Jerusalem. 19Onyenwe anyị zitere ọtụtụ ndị amụma, ndị bịara buo amụma maka ịkpọghachi ha azụ, ma ha mesiri obi ha ike, jụ ige ntị.
20Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Zekaraya nwa Jehoiada onye nchụaja. O guzoro nʼihu ọha na eze gwa ha okwu sị; “Otu a ka Chineke sịrị, ‘Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị? Ihe agaghị agara unu nke ọma. Unu agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ugbu a, ya onwe ya agbakụtakwala unu azụ.’ ”
21Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 22Eze Joash echetaghị ebere nke nna Zekaraya bụ Jehoiada meere ya kama o gburu nwa ya. Ma mgbe ọ na-anwụ, ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị hụkwa mmeso ọjọọ a ma kwụọkwa unu ụgwọ ajọ omume unu niile.”
23O ruo ka ọ gbara otu afọ, ndị agha Aram bịara imegide Joash, ha wakporo Juda na Jerusalem gbuo ndị ndu niile site nʼetiti ndị mmadụ. Ha zigaara eze ha nọ na Damaskọs ihe niile ha kwatara nʼike. 24Nʼagbanyeghị na ndị Aram kpọọ naanị ndị ikom ole na ole bịa, Onyenwe anyị raara igwe ndị agha dị ukwuu ranye ha nʼaka. Nʼihi na Juda gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke nke nna nna ha, e mezuru ihe niile e kpere nʼikpe nʼahụ Joash. 25Mgbe ndị agha Aram lara, hapụ Joash nʼọnọdụ mmerụ ahụ dị ukwuu, ndịisi ozi ya gbara izu gbuo ya, nʼihi ogbugbu o gburu nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ha gburu ya mgbe o dina nʼihe ndina ya. Emesịa, ha liri ya nʼobodo Devid, ma ọ bụghị nʼebe a na-eli ndị eze.
26Ndị gbara izu gbuo ya bụ Zabad, onye nne ya bụ Shimeat onye Amọn, na Jehozabad, onye nne ya bụ Shimrit onye Moab. 27Ihe niile gbasara Joash na ụmụ ya, na amụma niile e buru banyere ya, na otu e si wuzie ụlọnsọ ukwu Chineke, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel niile. Mgbe Joash nwụrụ, Amazaya nwa ya ghọrọ eze Juda.
¿Sabías que…?
El Reinado de Joás y la Restauración del Templo
- Para financiar la restauración del templo descuidado, el rey Joás colocó un cofre de ofrendas a la entrada del templo y restableció el tributo asociado con Moisés en el desierto. El pueblo aportó con entusiasmo, lo que permitió a los supervisores contratar canteros, carpinteros y herreros para reparar los daños causados durante el dominio de Atalía.Fuentes: el propio texto bíblico · Athaliah
- El sumo sacerdote Joiada vivió hasta los 130 años y recibió el extraordinario honor de ser sepultado en la Ciudad de David junto a los reyes de Judá. Este entierro real reconoció su papel decisivo en la preservación del linaje de David y en la reforma del culto de la nación.Fuentes: el propio texto bíblico · Jehoiada
- Tras la muerte de Joiada, Joás abandonó el culto en el templo y ordenó apedrear a Zacarías, hijo de Joiada, en el atrio del templo por reprender al reino. En contraste con Joiada, cuando Joás fue asesinado más tarde por sus propios siervos tras una invasión aramea, se le negó la sepultura en las tumbas reales.Fuentes: el propio texto bíblico · Zacharias · Zabad
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 1, 6, 9, 18, 23
- City of David · 31.774, 35.236 · versículos 16, 25
- Damascus · 33.511, 36.306 · versículo 23
- Syria · Hoy: Aram · 33.511, 36.306 · versículos 23, 24
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org