Revelation 22
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Mmiri na-enye ndụ
1Mmụọ ozi ahụ gosiri m iyi ahụ e si ekute mmiri nke na-enye ndụ nke na-enwu dịka kristal. O sikwa nʼokpuru ocheeze Chineke na Nwa atụrụ ahụ na-asọpụta, 2nʼetiti okporoụzọ ahụ dị nʼobodo ahụ. Nʼakụkụ aka nri na aka ekpe iyi ahụ, a ga-ahụ osisi ahụ na-enye ndụ. Osisi ndị a na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ dị iche iche. Ha na-amịpụta mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa ọbụla. Akwụkwọ osisi ahụ wapụtara bụ ọgwụ e ji agwọ mba niile. 3A gaghị ahụ ihe ọbụla a bụrụ ọnụ nʼime obodo ahụ. Ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ ga-adị nʼobodo ahụ. Ndị ohu ya ga-efekwa ya ofufe. 4Ha ga-ahụkwa ihu ya, a ga-edekwa aha ya nʼegedege ihu ha. 5Abalị agaghị adịkwa ọzọ, ịmụnye oriọna agaghị adịkwa mkpa. Mkpa ìhè anwụ na-enye agaghị adịkwa nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ga-abụ ìhè ha, ha ga-achịkwa achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ọbịbịa Jisọs
6Mmụọ ozi ahụ gwara m, “Okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu. Onyenwe anyị, bụ Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya igosi ụmụodibo ya ihe ndị ahụ ga-emezu nʼoge na-adịghị anya.
7“Lee, ana m abịa ọsịịsọ. Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-edebe okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ a.”
8Mụ onwe m bụ Jọn, hụrụ ihe ndị a niile, nụkwa ha. Mgbe m hụrụ ma nụchaa ihe ndị a niile, adara m nʼụkwụ mmụọ ozi a gosiri m ha ịkpọ isiala nye ya. 9Ma ọ sịrị m, “Emela ihe dị otu ahụ! Mụ onwe m bụkwa odibo Jisọs dịka gị onwe gị, na dịka ụmụnna gị ndị amụma, na dịka ndị ahụ niile na-edebe okwu niile e dere nʼakwụkwọ a. Kpọọrọ Chineke isiala.”
10Ma ọ sịrị, “Akachila okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ akara, nʼihi na oge adịla nso. 11Ka ndị niile na-eme ajọ omume gaa nʼihu na-eme ajọ omume, ka ndị na-adịghị ọcha gaa nʼihu bụrụ ndị na-adịghị ọcha, ka ndị na-eme ezi ihe gaa nʼihu na-eme ezi ihe, ka ndị dị nsọ gaa nʼihu bụrụ ndị dị nsọ.”
Ịdọ aka na ntị nakwa ọkpụkpọ oku
12“Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọbụla dịka ọrụ ọ rụrụ si dị dịkwa m nʼaka. 13Abụ m Alfa na Omega. Onye mbụ na Onye ikpeazụ, Mmalite na Ọgwụgwụ.
14“Ngọzị na-adịrị ndị ahụ sara uwe ha mmiri, ka ha si otu a bụrụ ndị na-enweta oke na mkpụrụ si nʼosisi ahụ na-enye ndụ, ndị ga-enwe ike isite nʼọnụ ụzọ ama ahụ baa nʼime obodo ahụ. 15Nʼazụ obodo ka ndị ahụ bụ nkịta nọ, ha na ndị niile na-agba afa, na ndị niile na-akwa iko, na ndị niile na-egbu mmadụ, na ndị niile na-ekpere arụsị, na ndị niile hụrụ ụgha nʼanya ma na-emekwa ya.
16“Mụ onwe m, bụ Jisọs ezitela mmụọ ozi m ka ọ gbara unu ama a nye nzukọ m niile. Ọ bụ m bụ Mgbọrọgwụ na Mkpụrụ Devid. Abụkwa m Kpakpando ụtụtụ ahụ na-enwu enwu.”
17Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọbụla nụrụ okwu a kwuo sị, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa, onye ọbụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ na-akwụghị ụgwọ ọbụla.
18Ana m adọ onye ọbụla nụrụ okwu amụma dị nʼakwụkwọ a aka na ntị, sị, ọ bụrụ na onye ọbụla atụkwasị ihe ọbụla nʼelu ha, Chineke ga-atụkwasịrị onye ahụ ihe ntaramahụhụ ahụ niile e kwuru maka ha nʼakwụkwọ a. 19Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ewepụ okwu ọbụla nʼakwụkwọ amụma a, Chineke ga-ewepụ oke o nwere nʼosisi ahụ na-enye ndụ, na oke o nwere nʼobodo nsọ ahụ, nke e kwuru okwu ha nʼakwụkwọ a.
20Onye ahụ gbara ama ihe ndị a niile na-asị, “Nʼezie, ana m abịa ọsịịsọ.”
Amen. Bịa, Onyenwe anyị Jisọs.
21Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere ndị nsọ niile. Amen.
Did you know?
The city of life and the Lord who is coming
- The angel shows a river of the water of life, clear as crystal, flowing from the throne of God and of the Lamb down the middle of the city’s main street, with a tree of life on either side bearing twelve kinds of fruit, a fresh crop each month, and leaves for the healing of the nations. The chapter also says there will no longer be any curse or night, for the Lord God will shine on his servants, and they will reign forever and ever.Sources: the Bible text itself
- Jesus calls himself the Root and the Offspring of David, and the bright Morning Star. The entry on David introduces him as Beloved, the eighth and youngest son of Jesse, a citizen of Bethlehem, whose early work was tending his father’s sheep on the uplands of Judah.Sources: the Bible text itself · David
- The speaker says, “I am John, who heard and saw these things,” and tells how he fell down to worship at the feet of the angel who had shown them to him. The angel refused, calling himself a fellow servant with John and with John’s brothers the prophets, and with those who keep the words of this book, and said, “Worship God!”Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org