Nations Bible

Revelation 21

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ

1Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa. 2Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya. 3Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha. 4Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala.”

5Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”

6Ọ sịrị m, “E mezuola ihe niile. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ. Aga m enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si nʼisi iyi mmiri nke ndụ dịka ihe onyinye. 7Ndị ọbụla na-emeri emeri ga-enweta ihe nketa ndị a. Aga m abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ụmụ m. 8Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.”

Jerusalem ọhụrụ

9Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, nke ji efere asaa ahụ nke ihe ntaramahụhụ dị nʼime ya bịakwutere m sị m, “Soro m, ka m gosi gị nwaagbọghọ ahụ bụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” 10O buuru m nʼime Mmụọ buga m nʼotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. O gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. 11O jupụtara nʼebube Chineke, na-enwu ma na-achakwa dịka nkume dịkarịsịrị oke ọnụahịa, dịka nkume jaspa, na-enwu dịka kristal. 12Mgbidi ya niile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel nʼọnụ ụzọ ama ndị a nʼotu nʼotu. 13Ọnụ ụzọ ama atọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, atọ dị nʼakụkụ ugwu, atọ dị nʼakụkụ ndịda, ebe atọ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. 14Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Nʼelu nkume ndị a nʼotu nʼotu ka e dere aha ndị ozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.

15Onye ahụ na-agwa m okwu ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nʼaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ama ya, na mgbidi ya. 16Nʼobodo ahụ, enweghị otu akụkụ nʼime akụkụ anọ nke mgbidi ya karịrị ibe ya. Ogologo ya na obodobo ya ha otu. O ji ihe ọtụtụ tụọ ya, ogologo ya na obodobo nakwa ịdị elu ya ha, ọtụtụ ya dị puku kilomita abụọ na narị kilomita abụọ. 17Ọ tụkwara ịdị igbidi nke mgbidi ahụ chọpụta na ọ dị narị nzọ ụkwụ atọ, dịka ihe ọtụtụ nke mmụọ ozi ahụ si gụpụta.

Ịma mma nke obodo ahụ

18Ihe e ji rụọ mgbidi ya bụ nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa, jiri ezi ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwu dịka enyo dị ọcha rụọ obodo ahụ. 19E ji nkume niile dị oke ọnụahịa chọọ ntọala mgbidi obodo ahụ mma. Ntọala nke mbụ, bụ nkume a na-akpọ jaspa, ntọala nke abụọ, nkume a na-akpọ safaia, ntọala nke atọ, nkume a na-akpọ kaldoni, nke anọ, nkume a na-akpọ emeralụdụ, 20nke ise, nkume a na-akpọ ọniks, nke isii, nkume a na-akpọ kanelian, nke asaa, nkume a na-akpọ krisolaịt, nke asatọ, nkume a na-akpọ beril, nke itoolu, nkume a na-akpọ topaazi, nke iri, nkume a na-akpọ krisoprez, nke iri na otu, nkume a na-akpọ jasint, nke iri na abụọ, nkume a na-akpọ ametisiti. 21Ọnụ ụzọ ama iri na abụọ ahụ bụ pieal iri na abụọ, ọnụ ụzọ ama ọbụla ka e ji otu nkume pieal rụọ nʼotu nʼotu. Ihe e ji rụọ okporoụzọ dị nʼobodo ahụ bụ naanị ọlaedo a nụchara anụcha ọbụla, nke dị ọcha dịka enyo e hichaziri nke ọma.

22O nweghị ụlọnsọ ukwu ọbụla m hụrụ nʼime obodo ahụ nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọnsọ ukwu obodo ahụ nwere. 23Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ. 24Mba niile ga-eji ìhè ya jegharịa. Ndị eze ụwa niile ga-abịakwa webata ebube ha nʼime ya. 25A naghị emechi ọnụ ụzọ ama obodo ahụ emechi. Ha na-eghe oghe ụbọchị niile nʼihi abalị ọbụla adịghịkwa nʼebe ahụ. 26Ebube na nsọpụrụ nke mba niile ka a ga-ewebata nʼime ya. 27Ọ dịkwaghị ihe ọbụla rụrụ arụ ga-abata nʼime ya. Otu a kwa, ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, maọbụ onye ụgha ga-abata nʼime ya, kama ọ bụ naanị ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ Nwa Atụrụ ahụ.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The New Jerusalem

  • In this vision the city coming down from heaven is called the holy city, the new Jerusalem. Jerusalem was also known as the holy city and the city of God, and in Arabic it is el-Khuds, meaning the holy. Its name is in a dual form and means possession of peace or foundation of peace.Sources: the Bible text itself · Jerusalem
  • The seer is carried in the Spirit to a great and high mountain and shown that holy city descending. Jerusalem is described as a mountain city enthroned on a mountain stronghold, and the dual form of the name probably refers to the two mountains on which it was built, Zion and Moriah, or, as some suppose, to the upper and lower city.Sources: the Bible text itself · Jerusalem
  • The city wall has twelve gates, three on each side, inscribed with the names of the twelve tribes of Israel. Israel is another name for Jacob, explained as one who follows on another's heels, or as a supplanter.Sources: the Bible text itself · Jacob (Israel)

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 2, 10

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.