Numbers 35
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Obodo ndị Livayị
1Nʼoge a, mgbe ndị Izrel ka nọ nʼakụkụ osimiri Jọdan nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu Jeriko, ka Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Nye ndị Izrel iwu ka ha nye ndị Livayị ụfọdụ obodo ebe ha ga-ebi. Obodo ndị a ga-abụ ndị si nʼihe nketa ndị Izrel ketara. Nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ na-akpa nri, nke ga-agba obodo ndị a gburugburu. 3Obodo ndị a ga-abụrụ ha ebe obibi, ma ala niile gbara ha gburugburu ga-abụ ebe ịta nri nke igwe ehi na atụrụ, na anụ ụlọ ha niile.
4“Ala ebe ịta nri nke obodo niile nke unu ga-enye ndị Livayị ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼogologo site na mgbidi obodo ga gburugburu mgbidi obodo ọbụla. 5Ya mere nʼobodo ndị Livayị ọbụla, ala ịzụ anụ ụlọ ga-adị narị mita anọ na ọkara site na mgbidi ha ruo nʼoke ala ha. Ọ ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ugwu, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ndịda. Obodo ha ga-adịkwa nʼetiti ala ịzụ anụ ụlọ ndị a.
Obodo mgbaba
6“Obodo isii nʼime obodo ndị ahụ unu na-enye ndị Livayị ga-abụ obodo mgbaba, ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama nwere ike gbaga izere ndụ ya. Tinyere obodo ndị a unu ga-enyekwasị ha iri obodo anọ na abụọ ọzọ. 7Ya mere obodo niile a ga-enye ndị Livayị ga-adị iri obodo anọ na asatọ, tinyere obosara ala ịzụ igwe ewu na atụrụ nke gbara obodo ndị a gburugburu. 8Obodo unu na-enye ndị Livayị site nʼihe nketa ndị Izrel ga-abụ dịka unu si keta oke unu. A ga-esite nʼaka ebo nwere ọtụtụ obodo wepụta ọtụtụ obodo, ma site nʼaka ebo obodo ha nwere na-ehighị nne wepụta ole na ole.”
9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 10“Gwa ndị Izrel sị ha, ‘mgbe unu gafere Jọdan banye nʼala Kenan, 11họpụtanụ ụfọdụ obodo ka ọ bụrụ obodo mgbaba ebe mmadụ nwere ike ịgbabanye ma ọ bụrụ na o gbuo mmadụ na-amaghị ama. 12Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ, ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ. 13Obodo isii ndị a unu wepụtara ga-abụ obodo mgbaba. 14Họpụta obodo mgbaba atọ nʼakụkụ ọzọ nke Jọdan. Ka atọ ndị ọzọ dịrị na Kenan. 15Obodo ndị a agaghị abụ ebe izere ndụ maka naanị ndị Izrel, kama ọ dịkwara ndị ọbịa na ndị ọzọ bi nʼetiti unu, ka onye na-akpachaghị anya gbuo mmadụ gbaga ebe ahụ izere ndụ ya.
16“ ‘Ọ bụrụ na mmadụ e jiri mkpirisi igwe tigbuo mmadụ ibe ya, a ga-agụ onye dị otu a dịka ogbu mmadụ. A ga-egbukwa ya. 17A sịkwa na mmadụ ejide nʼaka ya nkume nke o nwere ike iji tugbuo mmadụ, ọ bụrụ na ọ tụọ mmadụ nkume ahụ tugbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. Ogbu mmadụ ahụ aghakwaghị ịnwụ. 18A sikwa na mmadụ ji ihe e ji osisi tụọ nʼaka ya, nke o nwere ike i ji tigbuo mmadụ, ọ bụrụ na o tie mmadụ ihe osisi ahụ, tigbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. A ghaghị ime ka ogbu mmadụ ahụ nwụọ. 19Onye na-abọ ọbọ ọbara ga-egbu ogbu mmadụ ahụ nʼonwe ya mgbe ọbụla o zutere ya. 20Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼekworo nuo onye ọzọ aka, maọbụ kpachara anya tụọ onye ahụ ihe nke mere ka ọ nwụọ, 21maọbụ na o sitere nʼobi ọnụma jiri aka ya tie mmadụ ihe nke mere ka ọ nwụọ, a ga-egbu onye ahụ, nʼihi na ogbu mmadụ ka ọ bụ. Onye na-agwachite ọchụ ga-egbu ogbu mmadụ ahụ mgbe ọbụla o zutere ya.
22“ ‘Ma ọ bụrụ na mmadụ ebughị iro nʼobi nutuo mmadụ ibe ya na mberede, maọbụ tụọ ya ihe, 23maọbụ tụtuo nkume nke datara dagbuo mmadụ ibe ya mgbe ọ na-ahụghị ya, bụ onye na-abụghị onye iro ya, onye ọ na-ebughị nʼobi imejọ, 24mgbe ahụ, ndị ọgbakọ ga-ekpe ikpe nʼetiti onye e boro ebubo na onye na-agwachite ọchụ dịka usoro iwu ndị a si dị. 25Nzukọ aghaghị ichekwa onye e boro ebubo na o gburu mmadụ site nʼaka onye na-agwachite ọchụ, zilaga onye ahụ e boro ebubo nʼobodo mgbaba, bụ ebe ha gbalagara. Onye ahụ e boro ebubo ga-anọgide nʼobodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ, bụ onye ahụ e tere mmanụ nsọ.
26“ ‘Ma ọ bụrụ na ogbu mmadụ a ahapụ obodo mgbaba ahụ pụọ, ọ bụrụkwa, 27na onye ahụ na-abọ ọbọ ọbara achọta ya nʼazụ obodo mgbaba ahụ, o nwere ike igbu onye ahụ e boro ebubo, ikpe igbu mmadụ agaghị ama ya. 28Onye ahụ e boro ebubo na o gburu mmadụ aghaghị ịnọ nʼime obodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ. Ọ bụ naanị mgbe onyeisi nchụaja nwụchara, ka ha nwere ike ịlaghachi nʼụlọ ya, nʼihe nketa ya.
29“ ‘Ndị a bụ usoro iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ, nʼebe obibi unu niile.
30“ ‘Onye ọbụla gburu mmadụ ga-anwụ. A ga-ama ya ikpe ọnwụ naanị mgbe e nwere karịa otu onye akaebe. Ọ dịghị onye ọbụla a ga-egbu nʼihi akaebe nke otu onye gbara megide ya.
31“ ‘Unu a narakwala ihe ịgbara isi nʼọnọdụ ndụ nke onye gburu mmadụ, bụ onye nke ikpe ọnwụ mara. Aghaghị ime ka ha nwụọ.
32“ ‘Unu a narakwala ihe mgbapụta site nʼaka onye ọbụla nke gbagara nʼobodo mgbaba, site otu a kwere ka ha lọghachite azụ ga biri nʼala nke aka ha tupu onyeisi nchụaja anwụọ.
33“ ‘Unu emerụkwala ala ahụ nke unu bi nʼime ya. Ọbara igbu ọchụ na-emerụ ala. Ọ dịkwaghị mkpuchi mmehie a ga-eme banyere ala a wufuru ọbara nʼime ya, ma ọ bụghị naanị ọbara nke onye ahụ gburu ọchụ ahụ. 34Unu emerụla ala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya. Nʼihi na mụ onwe m bikwa nʼebe ahụ, mụ bụ Onyenwe anyị bi nʼetiti ụmụ Izrel.’ ”

Did you know?
Levitical Towns and Cities of Refuge
- Unlike the other tribes, the Levites were not allotted a continuous territory. Instead, the Israelites were instructed to provide them with forty-eight cities along with surrounding pasturelands, contributed by each tribe in proportion to the size of its tribal inheritance.Sources: the Bible text itself
- Six of the forty-eight Levitical towns were designated as cities of refuge, with three located east of the Jordan and three in the land of Canaan. These sanctuaries offered legal protection for Israelites and resident foreigners who caused an accidental death, sheltering them from the avenger of blood until a formal trial could take place.Sources: the Bible text itself · Canaan · Jordan
- The law strictly distinguished between intentional murder and accidental manslaughter, requiring multiple witnesses before carrying out capital punishment. Furthermore, financial ransoms were forbidden either to spare a convicted murderer or to release an accidental killer from their city of refuge before the death of the high priest.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Jericho · Today: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · verse 1
- Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verses 1, 10, 14
- Moab · Today: Moab 2 · 31.840, 35.674 · verse 1
- Canaan · 32.767, 35.333 · verses 10, 14
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org