Numbers 34
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Oke ala na Kenan
1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Nye ndị Izrel iwu sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala Kenan, ndị a bụ oke ala ndị ahụ unu ga-enweta dịka ihe nketa unu:
3“ ‘Oke ala unu nʼakụkụ ndịda ga-etinyetụ aka nʼọzara Zin. Ala unu na ala ndị Edọm ga-enwekọ oke ala. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ndịda unu ga-ebido na ngwụcha Osimiri Nnu, 4gafee ndịda Akrabim, gabiga ruo ọzara Zin, gbada ndịda ruo Kadesh Banea. Site nʼebe ahụ ọ ga-aga ruo Haza Ada, gafee ruo Azmọn, 5ebe ọ ga-echigharị gbasoro iyi Wadi nke Ijipt ma kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
6Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.
7Oke ala unu nʼakụkụ ugwu ga-amalite nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼugwu Hor. 8Ọ ga-esitekwa nʼugwu Hor ruo Lebo Hamat, gbatịakwa ruo Zedad, 9ruo Zifron tutu kwụsị na Haza Enan. Nke a ga-abụ oke ala unu nʼakụkụ ugwu.
10Oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebido na Haza Enan ruo Shefam. 11Oke ala ahụ ga-agbada site Shefam ruo Ribla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Ain. Site nʼebe ahụ, ọ ga-agbasoro ndịda ọdịda anyanwụ Osimiri Galili. 12Mgbe ahụ, ọ ga-aga ogologo ogologo, gbasoro osimiri Jọdan, tutu kwụsị nʼOsimiri Nnu.
13Mosis nyere ndị Izrel iwu sị, “Kesaanụ ala a dịka ihe nketa site nʼife nza. Onyenwe anyị enyela iwu ka enye ya ebo itoolu na ọkara ndị ahụ fọdụrụ. 14Nʼihi na ebo Ruben na Gad tinyere ọkara ebo Manase, enwetalarị ala ihe nketa ha. 15Ebo abụọ nʼọkara ndị a enwetala ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.”
16Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 17“Ndị a bụ aha ndị ikom m họpụtara ịhụ na e kenyere unu ala ahụ dịka ihe nketa unu. Elieza onye nchụaja, na Joshua nwa Nun. 18Site nʼebo ọbụla họpụta otu onyendu ka ha nye aka ikesa ala nketa ahụ.
19“Ndị a bụ aha ndị a họpụtara:
“Kaleb nwa Jefune, site nʼebo Juda.
20Shemuel nwa Amihud, site nʼebo Simiọn
21Elidad nwa Kislon, site nʼebo Benjamin.
22Buki nwa Jogli, onyendu si nʼebo Dan.
23Haniel nwa Efod, onyendu si nʼebo Manase, nwa Josef.
24Kemuel nwa Shiftan, onyendu si nʼebo Ifrem, nwa Josef.
25Elizafan nwa Panak, onyendu si nʼebo Zebụlọn.
26Paltiel nwa Azan, onyendu si nʼebo Isaka.
27Abihud nwa Shelomi, onyendu si nʼebo Asha.
28Pedahel nwa Amihud, onyendu si nʼebo Naftalị.”
29Ndị a bụ ndị ikom Onyenwe anyị nyere iwu si ha kenye ndị Izrel ihe nketa ha nʼala Kenan.

Did you know?
Boundaries and Leaders of the Promised Land
- Numbers 34 outlines the exact geographical boundaries for the land of Canaan, using natural landmarks such as the Salt Sea, the Great Sea (the Mediterranean), a northern Mount Hor, and the Jordan River.Sources: the Bible text itself · Canaan · Great Sea · Mount Hor
- This territorial allotment was designated for nine and a half tribes, because the tribes of Reuben, Gad, and half the tribe of Manasseh had already received their inheritance on the eastern side of the Jordan River.Sources: the Bible text itself · Reuben · Gad
- To oversee the distribution of the land by lot, God designated the high priest Eleazar and Joshua son of Nun, accompanied by one named leader from each of the remaining tribes, including Caleb for Judah.Sources: the Bible text itself · Eleazar · Joshua
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Canaan · 32.767, 35.333 · verses 2, 29
- Edom · 30.746, 35.604 · verse 3
- Salt Sea · Today: Dead Sea · 31.500, 35.500 · verses 3, 12
- Zin · Today: Zin Desert · 30.971, 35.325 · verse 3
- Great Sea · Today: Mediterranean Sea · 31.805, 34.170 · verses 5, 6, 7
- Shepham · Today: within 100 km of Hermel · 34.397, 36.387 · verses 10, 11
- Sea of Galilee · 32.819, 35.590 · verse 11
- Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verses 12, 15
- Jericho · Today: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · verse 15
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org