Nations Bible

Numbers 24

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

1Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara. 2Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya. 3O buru amụma ndị a sị,

“Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta,

okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe.

4Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke

onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile.

Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.

5“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb,

ebe obibi gị niile, gị Izrel!

6“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ,

dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri,

dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ,

dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.

7Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta,

mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu.

“Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag,

a ga-ebulikwa alaeze ha elu.

8“Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha.

Ha nwere ike dịka atụ.

Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha.

Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile,

jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.

9Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm,

dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha?

“Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị,

ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.”

10Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a. 11Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”

12Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m, 13‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’? 14Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”

Amụma Belam nke anọ

15Ya mere Belam kwuru okwu ndị a:

“Amụma Belam nwa Beoa,

amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma,

16amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke,

onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa.

Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.

Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe.

17“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a,

ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso.

Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie.

Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie.

Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab,

na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.

18A ga-emeri Edọm,

Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha.

Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.

19Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta.

Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.”

Amụma Belam nke ise

20Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị:

“Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile,

ma ikpeazụ ya bụ mbibi!”

Amụma Belam nke isii

21Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya:

“E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike,

akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ!

22Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile,

mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha.”

Amụma Belam nke asaa

23Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya:

“Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a?

24Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa.

Ha ga-eji ike dobe ndị Eba na ndị Ashọ nʼokpuru ha,

ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.”

25Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Balaam's Final Oracles

  • Unlike his previous attempts, Balaam did not resort to sorcery before his third oracle, but turned toward the wilderness. When he looked out and saw Israel encamped tribe by tribe, the Spirit of God came upon him to pronounce a blessing rather than a curse.Sources: the Bible text itself · Balaam
  • Balaam's oracles refer to Agag and Amalek, a nomadic tribe dwelling between the Dead Sea and the Red Sea whose rulers bore the name Agag. Although Amalek was described as first among the nations, Balaam foretold its eventual destruction.Sources: the Bible text itself · Agag · Amalek
  • In his final prophecy, Balaam looked to the distant future, foretelling a star coming from Jacob and a scepter from Israel that would crush Moab and take possession of Edom, the rugged mountainous region also called Seir.Sources: the Bible text itself · Jacob (Israel) · Edom · Seir

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Egypt · 30.129, 31.308 · verse 8
  • Moab · Today: Moab 1 · 31.181, 35.701 · verse 17
  • Edom · 30.746, 35.604 · verse 18
  • Amalek · 30.648, 34.422 · verses 20, 24
  • Asshur · Today: Assur · 35.457, 43.263 · verses 22, 24
  • Kittim · Today: Cyprus · 35.000, 33.000 · verse 24

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.