Numbers 23
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Amụma Belam nke mbụ
1Belam sịrị, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa nʼebe a. Kwadokwaara m oke ehi asaa na ebule asaa.” 2Balak mezuru dịka Belam gwara ya. Ha abụọ gburu otu oke ehi na otu nwa ebule nʼebe ịchụ aja asaa ahụ nʼotu na otu.
3Mgbe ahụ, Belam gwara Balak sị, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ aja gị ka m gaa nʼihu chọpụta ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-ezute m. Aga m agwa gị ihe ọbụla o kpughere m.” Ya mere, Belam rigooro nʼebe ọhịa na-adịghị.
4Chineke zutere ya nʼebe ahụ. Belam gwara ya sị, “Edoziela m ebe ịchụ aja asaa, gbukwaa otu oke ehi na otu ebule nʼelu ha niile nʼotu na otu.”
5Nʼoge a, Onyenwe anyị tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.”
6Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile. 7Nke a bụ ozi Belam ziri:
“Balak esitela nʼobodo Aram kpọta m.
Eze Moab esitela nʼọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ kpọta m.
Ọ sịrị m, bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ
bịa kwutọọ Izrel.
8M ga-esi aṅaa bụọ
onye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ?
M ga-esi aṅaa
kọchaa onye Onyenwe anyị na-akọchaghị?
9Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha.
Elegidere m ha anya site nʼugwu ahụ,
hụ na ha bụ ndị biri onwe ha,
ndị dị iche site nʼetiti mba niile ọzọ.
10Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị?
Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị.
Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume.
Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!”
11Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!”
12Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe Onyenwe anyị tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?”
Amụma Belam nke abụọ
13Mgbe ahụ, Balak sịrị ya, “Soro m bịa nʼebe ọzọ ebe ị ga-ahụ ha; ọ bụ naanị nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ha ka ị ga-ahụ, ị gaghị ahụ ha niile. Site nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.” 14Ya mere, eze Balak duuru Belam gaa nʼọhịa Zofim, nʼelu ugwu Pisga, wuo ebe ịchụ aja asaa nʼebe ahụ. O jikwa otu oke ehi, otu oke ehi, na otu ebule, otu ebule, chụọ aja nʼebe ịchụ aja ndị ahụ.
15Belam sịrị Balak, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ ihe aja gị, ebe mụ onwe m ga-ezute ya nʼofe nke ọzọ.”
16Ma Onyenwe anyị zutere Belam gwa ya ihe ọ ga-ekwu sị ya, “Laghachikwuru Balak zie ya ozi a.”
17Ya mere, ọ lọghachiri azụ nʼebe ahụ Balak na ụmụ eze Moab guzoro nʼakụkụ ihe aja ha. Balak jụrụ ya sị, “Gịnị ka Onyenwe anyị sịrị?”
18Ma Belam zaghachiri sị ya:
“Bilie ọtọ Balak, nụrụ ozi.
Ṅaa ntị nʼokwu m, gị nwa Zipoa.
19Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ.
Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ.
O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru?
O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere?
20Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha.
Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya!
21“O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb,
ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel.
Onyenwe anyị Chineke ha nọnyeere ha.
Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha.
22Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt.
Ha dị ike dịka ehi ọhịa.
23Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha.
Ọ dịkwaghị ịgba afa a pụrụ iji megide Izrel.
Nʼihi na ugbu a, ihe dị otu a ka a ga-ekwu banyere Jekọb
na Izrel. ‘Lee, ihe Chineke mere ha.’
24Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm,
ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm,
nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu,
ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!”
25Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.”
26Ma Belam zaghachiri, “Ọ bụ na m agwaghị gị, ihe ọbụla nke Onyenwe anyị ga-ekwu ka m ga-eme?”
Amụma Belam nke atọ
27Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Bịa, aga m akpọrọ gị gaa nʼebe ọzọ. Eleghị anya ọ ga-amasị Chineke ka i si nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.” 28Ya mere, Balak duuru Belam gaa nʼelu ugwu Peoa nke na-elegide ọzara ahụ anya.
29Belam gwara Balak okwu sị ya, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa ọzọ. Doziekwa ụmụ oke ehi asaa na ebule asaa e ji achụ aja.” 30Balak mere dịka Belam gwara ya. O ji otu oke ehi na otu ebule chụọ aja nʼebe ịchụ aja ahụ nʼotu na otu.
Did you know?
Balaam's Oracles of Blessing
- In his first oracle, Balaam mentions that Balak brought him from Aram in the eastern mountains. According to biblical tradition, Balaam was from Mesopotamia and held a widespread reputation for invoking powerful blessings and curses.Sources: the Bible text itself · Balaam · Aram
- Seeking a favorable outcome, King Balak led Balaam to different vantage points across Moab, including the Field of Zophim on the summit of Pisgah and the peak of Peor overlooking the wilderness, hoping a different view would allow him to curse Israel.Sources: the Bible text itself · Zophim · Pisgah · Peor
- At each new location, Balaam instructed Balak to construct seven altars and sacrifice seven bulls and seven rams—one bull and one ram on each altar—before stepping aside to receive an oracle from the Lord.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Moab · Today: Moab 1 · 31.181, 35.701 · verses 6, 7, 17
- Aram · 33.511, 36.306 · verse 7
- East · Today: region around Amman · 31.955, 35.934 · verse 7
- Egypt · 30.129, 31.308 · verse 22
- Jeshimon · 31.470, 35.223 · verse 28
- Peor · Today: within 1 km of Khirbet Ayun Musa · 31.777, 35.738 · verse 28
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org