Nations Bible

Mark 5

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Jisọs agwọọ nwoke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya

1Ha gafere nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ nʼakụkụ obodo Gerazin. 2Mgbe Jisọs sitere nʼụgbọ ahụ pụta, otu nwoke mmụọ na-adịghị ọcha si nʼebe a na-eli ozu bịa zute ya. 3Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, ọ bụladị iji eriri igwe kee ya. 4Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma ọ dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. Ọ dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya. 5Ọ na-agagharị nʼetiti ili ahụ ehihie na abalị na nʼugwu dị ya gburugburu, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ.

6Mgbe o sitere nʼebe dị anya hụ Jisọs, ọ gbaara ọsọ gaa gbuo ikpere nʼihu ya. 7O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko, atala m ahụhụ.” 8Nʼihi na o nyela ya iwu sị, “Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!”

9Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?”

Mmụọ ọjọọ ahụ zaghachiri ya sị, “Aha m bụ Lijiọn, nʼihi na anyị dị ọtụtụ.” 10Ma ọ rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara ịchụpụ ha site nʼobodo ahụ.

11Igwe ezi nọ nso nʼebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nʼebe ahụ. 12Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya sị, “Biko ziga anyị nʼetiti igwe ezi ndị a, ma hapụ anyị ka anyị banye nʼime ha.” 13Ọ hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile.

14Ndị na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa, kọsaa ihe mere nʼime obodo nakwa nʼala ahụ niile. Nʼihi nke a, ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere. 15Ha bịakwutere Jisọs, hụ nwoke ahụ nke igwe mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. O yi uwe, nọdụ ala, bụrụkwa onye uche ya zuruoke; egwu jidere ha. 16Ndị hụrụ ihe mere kọọrọ ihe niile mere nwoke ahụ mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. Ha kọkwaara ihe mere igwe ezi ndị ahụ. 17Mgbe ahụ, ha bidoro ịrịọ Jisọs ka ọ pụọra ha nʼakụkụ ala ha.

18Dị ka ọ na-achọ ịbanye nʼime ụgbọ, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ bibu nʼime ya rịọrọ ya ka o soro ha. 19Ma Jisọs ekweghị, kama ọ sịrị ya, “Laa nʼụlọ, lakwuru ndị enyi gị, kọọrọ ha ihe ọma Onyenwe anyị meere gị, na otu o si meere gị ebere.” 20Ya mere, o si nʼebe ahụ pụọ, malitekwa ịkọsa nʼime mpaghara Dekapọlịs ihe ọma Jisọs meere ya. Ihe a juru mmadụ niile anya.

Ada Jairọs na nwanyị nwere okwukwe

21Mgbe Jisọs jiri ụgbọ mmiri gafee nʼakụkụ nke ọzọ, ọtụtụ igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu mgbe ọ nọ nʼakụkụ osimiri. 22Ma otu nʼime ndịisi ụlọ ekpere nke aha ya bụ Jairọs bịara, mgbe ọ hụrụ ya, ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, 23rịọsie ya arịrịọ ike sị, “Ada m nwanyị nke nta nọ nʼọnụ ọnwụ ugbu a. Biko, bịa ka ị bikwasị ya aka gị ka agwọ ya, ka ọ dịkwa ndụ.” 24Ya mere, Jisọs soro ya gawa.

Oke igwe mmadụ sokwa ya na-akpagbu ya. 25Ma otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ. 26Ọ taala ahụhụ dị ukwuu nʼaka ndị dibịa, mefukwaa ihe niile o nwere. Ma kama ọrịa ya ịdị mma, ọ na-aga nʼihu ịdị njọ. 27Ebe ọ nụrụla akụkọ banyere Jisọs, o sooro igwe mmadụ ndị ahụ, sitere nʼazụ metụ uwe ya aka. 28Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m enwe ike metụ naanị uwe ya aka, a ga-agwọkwa m.” 29Ngwangwa oruru ọbara ya kwụsịrị. Ọ matakwara nʼime onwe ya na ya enwerela onwe ya site nʼọrịa ya.

30Nʼotu oge ahụ Jisọs matara na ike esitela ya nʼahụ pụọ. Ọ tụgharịrị gburugburu nʼetiti igwe mmadụ ahụ jụọ sị, “Onye metụrụ uwe m aka?”

31Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee ọtụtụ igwe mmadụ gbara gị gburugburu, i sikwa aṅaa na-ajụ, ‘Onye metụrụ uwe m aka?’ ”

32Ma Jisọs gara nʼihu na-ele anya gburugburu ịhụ onye mere ya. 33Ma nwanyị ahụ, ebe ọ matara ihe mere nʼahụ ya, bịara nʼegwu nʼịma jijiji daa nʼụkwụ ya, gwa ya eziokwu niile. 34Ọ sịrị ya, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo nwerekwa onwe gị site nʼọrịa gị.”

35Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị mmadụ sitere nʼụlọ onyeisi ụlọ ekpere bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, olee ihe mere i ji esogbu onye ozizi a ọzọ?”

36Ma ka ọ nụrụ ihe ha kwuru, Jisọs gwara onyeisi ụlọ ekpere ahụ sị ya, “Atụla egwu, naanị kwere.”

37O kweghị ka onye ọbụla ọzọ soro ya ma ọ bụghị Pita, na Jemis na Jọn nwanne Jemis. 38Mgbe ha bịarutere nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ahụ, ọ nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa. 39Mgbe ọ batara, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwatakịrị a anwụghị anwụ, ọ na-arahụ ụra!” 40Ma ha chịrị ya ọchị.

Mgbe ọ chụpụsịrị ha niile nʼezi, ọ kpọọrọ nne na nna nwantakịrị ahụ, na ndị ya na ha so, banye nʼime ụlọ ebe nwantakịrị ahụ dina. 41O jidere ya nʼaka sị ya, “Talita koum!” (nke pụtara, “Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie!”). 42Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (ọ gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu. 43Ma ọ dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe mere. Ọ sịrị ha, “Nyenụ ya nri ka o rie.”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Restored on both shores of the sea

  • Mark says they landed in the region of the Gerasenes, and the freed man then proclaimed throughout the Decapolis how much Jesus had done for him. The Decapolis was a district of ten cities east and south-east of the Sea of Galilee, chiefly inhabited by Greeks, and Gadara was one of them. A source heading also calls the episode the Gadarene demoniacs, a place-name different from Mark’s Gerasenes.Sources: the Bible text itself · Decapolis · Gadarene Demoniacs
  • On the other shore, a synagogue leader named Jairus begged Jesus to come to his little daughter. Easton's Bible Dictionary (1897) identifies him as a ruler of the synagogue at Capernaum whose only daughter Jesus restored to life. Mark records “Talitha koum,” explained as “Little girl, I say to you, get up!”; the dictionary cites “Talitha cumi,” “Maid, arise,” and says Jesus ordered food to strengthen her and to show she was no ghost but had returned to ordinary life.Sources: the Bible text itself · Jairus
  • Jesus allowed only Peter, James, and John to go in with the child’s father and mother. Easton's Bible Dictionary (1897) describes James as a fisherman, the son of Zebedee and an elder brother of John, in partnership with Peter, and notes that he was present at the raising of Jairus’s daughter.Sources: the Bible text itself · James (Son of Zebedee)

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Gerasa · Today: Jerash · 32.272, 35.891 · verse 1
  • Decapolis · 32.717, 35.800 · verse 20

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.