Nations Bible

Mark 4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ilu banyere ọgha mkpụrụ

1Nʼoge ọzọ, ọ malitere izi ihe nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ dị ukwuu gbara ya gburugburu, nke mere na ọ banyere nʼime ụgbọ nọdụ ala nʼime ya nʼelu mmiri ahụ, ma igwe mmadụ ahụ nọkwa nʼakụkụ osimiri ahụ. 2O bidoro i kuziri ha ọtụtụ ihe nʼilu, ma nʼozizi ya, ọ sịrị ha, 3“Geenụ ntị! Otu onye ọrụ ubi pụrụ gaa ịkụ mkpụrụ ya. 4Mgbe ọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịara tụtụrịa ha. 5Ụfọdụ mkpụrụ dara nʼala nkume, ebe aja ntakịrị dị. Ha puputara ngwangwa nʼihi na ala dị nʼebe ahụ emighị emi. 6Ma mgbe anwụ wara, ọ chagburu ha, ha kpọnwụọ nʼihi na ha enweghị mgbọrọgwụ. 7Mkpụrụ ndị ọzọ dara nʼetiti ogwu; ogwu ahụ tolitere kpagbuo ha. Ha amịkwaghị mkpụrụ. 8Mkpụrụ ndị ọzọ nke dara nʼezi ala, puru, tolite, ma mịa mkpụrụ na mmụba iri atọ, iri isii, ọ bụladị otu narị.”

9Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”

10Ma mgbe ọ nọ naanị ya, ndị ozi iri na abụọ ahụ na ndị ọzọ nọ ya gburugburu jụrụ ya ajụjụ banyere ilu ahụ. 11Ọ gwara ha sị, “Enyela unu ihe omimi nke alaeze Chineke. Ma ndị nọ nʼezi, a na-agwa ha ihe niile nʼilu, 12nke mere na,

“ ‘Ha ga na-ele anya, hụkwa, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla,

ha ga na-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla,

ma ọ bụghị ya, ha nwere ike chigharịa bụrụ ndị a gbaghaara.’ ”

13Mgbe ahụ, ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na unu aghọtaghị ilu a? Unu ga-esikwa aṅaa ghọta ilu ndị ọzọ? 14Ọgha mkpụrụ ahụ na-agha okwu Chineke. 15Mmadụ ụfọdụ dị ka mkpụrụ ndị ahụ dara nʼakụkụ ụzọ, ebe a kụrụ okwu ahụ. Ngwangwa ha nụrụ ya, ekwensu na-abịa napụ ha okwu ahụ nke a kụrụ nʼime ha. 16Ndị ọzọ dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼala nkume. Ha nụrụ okwu ahụ, were ọṅụ nabata ya nʼotu mgbe ahụ. 17Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha, ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ. 18Ndị nke ọzọkwa, dị ka mkpụrụ dara nʼetiti ogwu, nụrụ okwu ahụ; 19ma nchekasị nke ndụ a, na nghọgbu nke akụnụba, na oke ọchịchọ, nakwa ihe ndị ọzọ na-abata, kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. 20Ndị ọzọ, dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼezi ala, nụrụ okwu ahụ, nabata ya ma mịa mkpụrụ dị iri atọ, iri isii, maọbụ otu narị.”

Iheọkụ dị nʼelu tebul

21Ọ sịrị ha, “A na-ebute oriọna ka e jiri efere kpuchie ya maọbụ dọnye ya nʼokpuru akwa ndina? Ọ bụghị ka a dọba ya nʼelu ihe ịdọba iheọkụ? 22Nʼihi na ihe niile e zoro ezo ga-apụta ihe ma ihe niile e kpuchiri ekpuchi ka a ga-emesịa kpughee. 23Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”

24Ọ sịrị ha, “Kpacharanụ anya ihe unu na-anụ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu, maọbụ karịa. 25Onye nwere ihe ka a ga-enye karịa; onye na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere ka a ga-anapụ ya.”

Ilu banyere otu mkpụrụ si eto

26Ọ sịkwara, “Alaeze Chineke yiri ihe dị otu a. Ọ dịka mgbe otu onye ghara mkpụrụ nʼala ubi. 27Ehihie na abalị, ma ọ nọ nʼụra ma o tetara, mkpụrụ ahụ na-epupụte na-etokwa, ma ọ maghị ka o si na-eme. 28Ala ahụ nʼonwe ya na-eme ka mkpụrụ ahụ puo. Ọ na-epupụte na mbụ, too oko, emesịa isi ọka, nʼikpeazụ ọ mịkwara mkpụrụ kara aka nʼoko ya. 29Mgbe ọka ahụ chara ịghọ ya, o na-eji mma iwe ihe ubi ya bịa gbutuo ọka ahụ, ghọrọkwa ogbe ọka laa, nʼihi na oge iwe ihe nʼubi eruola.”

Ilu banyere mkpụrụ Mọstaadị

30Ọzọkwa, ọ sịrị, “Gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ịsị na alaeze Chineke yiri? Ụdị ilu dị aṅaa ka anyị ga-eji kọwaa ya? 31Ọ dị ka mkpụrụ mọstaadị, nke bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta nke a na-akụ nʼala. 32Ma mgbe a kụrụ ya, ọ na-eto bukarịa ihe niile a kụrụ nʼubi, ọ na-enwe alaka dị ukwuu nke bụ na ụmụ anụ ufe nke eluigwe na-ezukwa ike nʼokpuru ya.”

33O jiri ọtụtụ ilu yiri ndị a gwa ha okwu dị ka ha pụrụ ịghọta. 34O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu. Ma ya na ndị na-eso ụzọ ya naanị nọdụ, ọ na-akọwara ha ihe niile.

Jisọs emee ka ifufe kwụsị

35Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ.” 36Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ ma kpọrọ ya, otu ọ dị, ya na ha banyere nʼime ụgbọ. Ụgbọ ndị ọzọ dịkwa na-eso ya. 37Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya. 38Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?”

39Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii.

40Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Ọ bụ na unu enwebeghị okwukwe?”

41Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Parables of the Kingdom by the Sea

  • Mark 4 begins with Jesus teaching a large crowd from a boat on the sea and ends with a violent windstorm on that water. A chronology of the episode dates these seaside parables and the miracle to a single day in AD 28.Sources: the Bible text itself · Seaside Parables and Miracle
  • In explaining the sower, Jesus says that Satan comes and takes away the word sown along the path. The name Satan means adversary or accuser, and in the New Testament it is used interchangeably with the devil more than thirty times.Sources: the Bible text itself · Satan
  • Jesus says the kingdom of God is like seed that sprouts and grows while the sower sleeps and wakes, though he does not know how: the earth produces the crop by itself, first the stalk, then the head, then grain that ripens. He also compares it to a mustard seed, the smallest of all seeds sown on the earth, which becomes the largest of all garden plants, with birds nesting in its shade. He told the crowds nothing without a parable, but privately explained everything to his own disciples.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.