Nations Bible

Matthew 25

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ụmụ agbọghọ iri

1“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. 2Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu. 3Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ. 4Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha. 5Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra.

6“Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’

7“Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ biliri mụnye oriọna ha. 8Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’

9“Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’

10“Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.

11“Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’

12“Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’

13“Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ.

Ijizi akụ

14“Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka. 15O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya. 16Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru. 17Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru. 18Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma.

19“Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya. 20Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’

21“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’

22“Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’

23“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’

24“Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị. 25Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’

26“Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị. 27Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri.

28“ ‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri. 29Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere. 30Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’

Ikpe nke ikpeazụ

31“Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. 32Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu. 33Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya.

34“Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa. 35Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m. 36Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’

37“Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị? 38Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe? 39Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’

40“Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’

41“Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. 42Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ. 43Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’

44“Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’

45“Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’

46“Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”

Did you know?

Ready before the Son of Man comes

  • Matthew 25 compares the kingdom of heaven to ten virgins who take lamps and go out to meet a bridegroom. The five wise ones bring oil in flasks; the five foolish ones do not, and after he is delayed a midnight cry finds their lamps going out, so they are told to buy oil and come back to a wedding door already shut. He tells them he does not know them, and the story ends by saying to keep watch, because no one knows the day or the hour.Sources: the Bible text itself
  • The next picture is a man who, before a journey, entrusts his possessions to three servants—five talents, two talents, and one talent—each according to his ability. The first two put the money to work and double it; the one who received a single talent digs a hole and hides it. After a long time the master praises the first two as good and faithful and invites them into his joy, but calls the third wicked and lazy, saying the sum should have been left with the bankers to earn interest.Sources: the Bible text itself
  • The chapter ends with the Son of Man coming in glory with all the angels and sitting on his glorious throne as the nations gather before him. He separates them as a shepherd separates sheep from goats, sheep on his right and goats on his left. He welcomes those on the right for feeding the hungry, giving drink, taking in the stranger, clothing the naked, caring for the sick, and visiting prisoners, saying that what was done for the least of these brothers of his was done for him, while those on the left who did none of this go to eternal punishment and the righteous to eternal life.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.