Nations Bible

Matthew 24

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Mbibi ụlọnsọ ukwu na ihe ama ọgwụgwụ oge

1Mgbe Jisọs si nʼụlọnsọ ahụ na-apụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọnsọ ukwu ahụ. 2Ma ọ zara ha sị, “Unu hụrụ ihe ndị a niile? Nʼezie agwa m unu, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nʼelu ibe ya, nke a na-agaghị akwatu nʼala.”

3Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama nke oge i ji alọghachi na nke ọgwụgwụ ụwa a?”

4Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ. 5Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m, na-ekwu sị, ‘Abụ m Kraịst ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ. 6Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola. 7Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ, na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche. 8Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa.

9“Mgbe ahụ ha ga-arara unu nyefee nʼaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbukwa unu. Mba niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. 10Ọtụtụ ga-ada site nʼokwukwe ha nʼoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha ma nʼọnya, kpọọkwa ibe ha asị. 11Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ. 12Nʼihi na ajọ omume bara ụba nʼebe niile, ịhụnanya ọtụtụ ndị mmadụ nʼebe ibe ha nọ ga-ajụ oyi. 13Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. 14A ga-ekwusa oziọma nke alaeze ahụ nye ụwa niile ka ọ bụrụ ihe ama nye mba niile. Emesịa ọgwụgwụ oge ahụ ga-abịa.

15“Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi, nke e kwuru okwu ya site nʼọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nʼebe nsọ (onye na-agụ ya nwee nghọta ihe ọ pụtara). 16Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu. 17Ka onye nọ nʼelu ụlọ ghara ịrịdata ka ọ banye nʼime ụlọ ya, ịkwapụta ngwongwo dị nʼime ụlọ ya. 18Ka onye nọ nʼubi ghara ịlọghachi nʼụlọ ya ịchịrị uwe ya. 19Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụaka ara nʼụbọchị ahụ 20Kpesienụ ekpere ike ka unu ghara ịgba ọsọ a nʼoge oke oyi, maọbụ nʼụbọchị izuike. 21Nʼihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ.

22“Ọ bụrụ na-emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, o nweghị onye a ga-azọpụta, ma nʼihi ndị ya ọ họpụtara, ụbọchị ndị ahụ ga-adị mkpụmkpụ. 23Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee ya nʼebe ahụ,’ unu ekwela. 24Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe oke ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-esite nʼọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ a họpụtara. 25Lee, agwala m unu ihe ndị a, mgbe ha na-emebeghị.

26“Ya mere, ọ bụrụ na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ọzara,’ unu agakwala. Ọ bụrụkwa na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ime ụlọ,’ unu ekwela. 27Nʼihi na ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka amụma na-egbu nʼọwụwa anyanwụ nke a na-ahụ anya nʼọdịda anyanwụ. 28Matakwanụ na ebe ọbụla ozu dị, nʼebe ahụ ka udele na-ezukọta.

29“Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị,

“ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị.

Ọnwa agaghị enyekwa ìhè,

kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa,

ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji.’

30“Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube. 31Ọ ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa.

Ihe mmụta site nʼosisi fiig

32“Ugbu a mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya malitere iwepụta ome dị nro, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso. 33Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile ka ha na-eme marakwanụ na ọ nọ nso, ọ bụladị nʼọnụ ụzọ unu. 34Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile aghaghị imezu tupu ọgbọ a agabiga. 35Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.

O nweghị onye maara mgbe ọ ga-abụ

36“Ma o nweghị onye ọbụla maara ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi nọ nʼeluigwe amaghị ya. Ọkpara ahụ amakwaghị. Ọ bụ naanị Nna maara ya. 37Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka ọ dị nʼụbọchị Noa. 38Nʼoge ahụ tupu iju mmiri ahụ abịa, ndị mmadụ nọ na-eri na aṅụ, na-emekwa mmemme ọlụlụ di na nwunye, ruo ụbọchị Noa banyere nʼime ụgbọ mmiri ya. 39Ha amataghị ihe ga-eme tutu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha niile. Otu ahụ ka ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị. 40Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nʼubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ. 41Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ nri na nkume igwe nri, a ga-ewere otu, ma hapụkwa nke ọzọ.

42“Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. 43Ma ghọtanụ nke a: Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ mara oge onye ohi ga-abịa nʼụlọ ya nʼabalị, ọ ga-anọ na nche nʼoge ahụ. Ọ gaghị ekwe ka onye ohi kụwaa ụlọ ya. 44Otu a ka unu onwe unu pụrụ isi nọgide na nche oge niile, nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.

Ọ dị mkpa ịnọ na nche

45“Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya? 46Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a. 47Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere. 48Ma ọ bụrụ na ohu ahụ bụ onye ajọọ omume na-asị onwe ya, ‘Nna m ukwu anọọla ogologo oge,’ 49ọ bụrụkwa na o bido iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị ọṅụ oke mmanya na-eri, na-aṅụ. 50Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. 51Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ebe ndị ihu abụọ nọ. Ebe e nwere ịkwa akwa na ịta ikikere eze.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The fall of the temple and the coming of the Son of Man

  • After leaving the temple, Jesus sat on the Mount of Olives, and the disciples came to him privately to ask when these things would happen and what would be the sign of his coming and of the end of the age. The Mount of Olives is a ridge east of Jerusalem, named for the olive trees that clothe its slopes, and it is separated from the city by the Kidron valley.Sources: the Bible text itself · Mount of Olives
  • Jesus says that when they see standing in the holy place the abomination of desolation described by the prophet Daniel, those in Judea should flee to the mountains, not stopping to fetch anything from the house or the field. Under the Romans in the time of Christ, Judea was the southernmost of the three divisions of Palestine, distinct from Galilee and Samaria, and included the territories of the tribes of Judah, Benjamin, Dan, Simeon, and part of Ephraim.Sources: the Bible text itself · Judea
  • Jesus compares the coming of the Son of Man to the days of Noah: before the flood, people were eating and drinking, marrying and giving in marriage, up to the day Noah entered the ark, and they were oblivious until the flood swept them all away. The chapter therefore urges its readers to keep watch, because they do not know the day on which their Lord will come.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Mount of Olives · 31.778, 35.246 · verse 3
  • Holy Place · Today: on Mount Moriah · 31.778, 35.236 · verse 15
  • Judea · Today: Judea 1 · 31.777, 35.234 · verse 16

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.