Nations Bible

Joshua 24

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Imesi ọgbụgba ndụ ike

1Joshua kpọkọtara ebo Izrel niile na Shekem. Ọ kpọrọ ndị okenye Izrel na ndịisi ha na ndị ikpe ha na ndị nlekọta ha. Ha niile bịara chee onwe ha nʼihu Chineke.

2Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị Izrel niile sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nna nna unu ochie ha, nke bụ Tera, nna Ebraham, na Nahọ, bikwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ofe osimiri Yufretis, ebe ha nọ fee chi ndị ọzọ ofufe. 3Ma mụ onwe m kpọpụtara nna nna unu Ebraham site nʼala ahụ dị nʼofe osimiri dubata ya nʼala Kenan, nye ya ọtụtụ ụmụ ụmụ, site na nwa ya bụ Aịzik. 4Ụmụ m nyere Aịzik bụ Jekọb na Ịsọ. Ịsọ ka m nyere ala ugwu ugwu Sia, ka o nweta ma Jekọb na ezinaụlọ ya gara nʼala Ijipt.

5“ ‘Emesịa, ezigara m Mosis na Erọn, ma wetara ndị Ijipt ihe otiti ọjọọ niile dị iche iche site nʼihe m mere nʼebe ahụ. Nʼikpeazụ, akpọpụtara m ndị m site nʼala Ijipt. 6Ma mgbe unu rutere nʼOsimiri Uhie, ndị agha Ijipt gbapụtara chịrị ụgbọ agha ha na ndị agha na-agba ịnyịnya ha chụwa unu ọsọ. 7Mgbe ndị Izrel hụrụ ha, ha tiri mkpu kpọkuo Onyenwe anyị. O tinyere oke ọchịchịrị nʼetiti unu na ndị Ijipt. O mere ka oke osimiri kpuchie ha, mee ka ha mikpuo nʼosimiri ahụ. Unu niile hụkwara ihe m mere ndị Ijipt. Emesịa, unu bikwara nʼọzara ọtụtụ afọ.

8“ ‘Ma emesịa, emere m ka unu bata nʼime ala ndị Amọrait, ndị bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha lụsoro unu ọgụ, ma eweere m ha nyefee unu nʼaka. E bibiri m ha nʼihu unu, ma unu nwetara ala ha. 9Mgbe Balak nwa Zipoa, eze Moab, jikeere ibuso Izrel agha, o zigaara Belam, nwa Beoa ozi ka ọ bịa bụọ unu ọnụ. 10Ma egeghị m Belam ntị. Kama emere m ya ka ọ gọzie unu. Anapụtara m unu site nʼaka ya.

11“ ‘Emesịa, unu gafere osimiri Jọdan bịaruo Jeriko. Ndị ikom Jeriko busoro unu agha, otu a kwa ka ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Gigash, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ma eweere m ha niile nyefee unu nʼaka. 12E zigara m ebu nʼihu unu nke chụpụrụ ha nʼihu unu, bụ eze abụọ ndị Amọrait. Ọ bụghị mma agha na ụta unu ka unu ji mee nke a. 13Ya mere enyere m unu ala ahụ, nke unu na-adọgbughị onwe unu nʼihi ya, nyekwa unu ọtụtụ obodo nke unu na-ewughị, bụ ala ndị a unu bi nʼime ya ugbu a. Enyere m unu ubi vaịnị na ubi oliv nke unu na-akụghị, nke unu na-eri mkpụrụ ha.’

14“Ya mere ugbu a, tụọnụ egwu Onyenwe anyị, feekwanụ ya ofufe nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi na nʼeziokwu. Wezuganụ chi ndị ahụ niile nna nna unu ha fere ofufe nʼofe osimiri Yufretis ahụ, na nʼIjipt. Feenụ naanị Onyenwe anyị ofufe. 15Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife Onyenwe anyị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe Onyenwe anyị.”

16Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ Onyenwe anyị fee chi ndị ọzọ! 17Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee. 18Ọ bụ Onyenwe anyị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.”

19Joshua zaghachiri ndị Izrel sị, “Unu apụghị ife Onyenwe anyị ofufe; nʼihi na ọ bụ Chineke dị nsọ, bụrụkwa Chineke ekworo. Ọ gaghị agbaghara unu nnupu isi unu na mmehie unu niile. 20Ọ bụrụ na unu agbakụta Onyenwe anyị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.”

21Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama Onyenwe anyị ka anyị ga-efe ofufe.”

22Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife Onyenwe anyị ofufe.”

Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.”

23Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere Onyenwe anyị Chineke Izrel isi.”

24Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe Onyenwe anyị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.”

25Ya mere, Joshua na ndị Izrel gbara ndụ nʼụbọchị ahụ na Shekem. O nyere ha iwu na ụkpụrụ ha ga-edebe. 26Joshua dere iwu ndị a ụmụ Izrel kwere na ha ga-eme nʼAkwụkwọ Iwu Chineke. Emesịa, o bupụtara otu nkume buru ibu guzo ya nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼakụkụ ebe nsọ Onyenwe anyị.

27Joshua sịrị ndị ahụ niile, “Lee, nkume a ga-abụ ihe ama megide anyị. Nʼihi na ọ nụla okwu niile nke Onyenwe anyị gwara anyị. Ọ ga-abụkwa ihe ama megide unu, ma ọ bụrụ na unu mee ihe mmekpu megide Chineke unu.”

28Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha.

Ọnwụ Joshua na Elieza

29Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri. 30E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, na Timnat Sera, nʼime ala ugwu ugwu Ifrem, nʼakụkụ ugwu dị nʼala Gaash.

31Ndị Izrel fere Onyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị maakwara ihe niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel.

32Ọkpụkpụ Josef ndị Izrel chịtara mgbe ha si nʼala Ijipt pụta, ka ha liri na Shekem, nʼime ala ahụ Jekọb zụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha nʼaka ụmụ Hamọ nna Shekem. Ala a ghọrọ nʼihe nketa ụmụ Josef.

33Elieza nwa Erọn, nwụkwara. E liri ya nʼala ugwu ugwu ndị Ifrem, na Gibea, obodo e nyere nwa ya bụ Finehaz.

Did you know?

Covenant Renewal and Farewell at Shechem

  • Shechem was located in a valley between Mount Ebal and Mount Gerizim, where Abraham had built his first altar in Canaan and where Jacob had buried his household's foreign idols. Gathering the tribes there to renew their covenant and bury the bones of Joseph in the parcel of land purchased by Jacob connected the assembly directly to Israel's patriarchal heritage.Sources: Shechem · the Bible text itself
  • In his opening review of Israel's history, Joshua recalled that their earliest ancestors, including Terah the father of Abraham, originally lived beyond the Euphrates River and served other gods. Joshua challenged the nation to abandon both those ancient Mesopotamian deities and the gods of Egypt to serve the LORD alone.Sources: River · Terah · the Bible text itself
  • After recording the words of the covenant in the Book of the Law of God, Joshua erected a large stone under an oak near the sanctuary of the LORD at Shechem. In ancient Near Eastern practice, physical stones were commonly erected as permanent, public witnesses to solemn agreements and treaties.Sources: Joshua · the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Shechem · Today: Tell Balatah · 32.214, 35.282 · verses 1, 25, 32
  • Euphrates · Today: Euphrates River · 31.004, 47.442 · verses 2, 3, 14, 15
  • Canaan · 32.767, 35.333 · verse 3
  • Egypt · 30.129, 31.308 · verses 4, 5, 6, 7, 14, 17, 32
  • Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verses 8, 11
  • Moab · Today: Moab 1 · 31.181, 35.701 · verse 9
  • Jericho · Today: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · verse 11

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.