Joshua 23
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Okwu ikpeazụ Joshua kwuru
1Ma mgbe ọtụtụ oge gasịrị, site nʼoge Onyenwe anyị mere ka Izrel nwee ezumike nʼebe ndị iro gbara ha okirikiri nọ, Joshua aghọọla agadi, gbaa ọtụtụ afọ. 2Ya mere, Joshua kpọrọ ndị Izrel niile, ndị okenye ha, ndị ndu ha, ndị odozi okwu ha na ndịisi ha, sị ha, “Emeela m agadi gbaakwa ọtụtụ afọ. 3Unu onwe unu ejirila anya unu hụ ihe niile Onyenwe anyị Chineke unu mere mba ndị a niile, nʼihi unu. Ọ lụụrụ unu ọgụ, nyere unu aka imeri ndị iro unu. 4Unu hụrụ na ekekwarala m unu ala mba ahụ niile nke fọdụrụnụ ka ha bụrụ ihe nketa ebo unu, site na Jọdan, tinyekwara mba niile ndị ahụ m kpochapụrụ nʼakụkụ osimiri Mediterenịa dị na mpaghara ọdịda anyanwụ. 5Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akwapụ ndị bi nʼime ha nʼihi unu. Ọ ga-achụpụ ha nʼihu unu, mee ka unu nweta ala ha, dịka Onyenwe anyị Chineke unu kwere unu nkwa.
6“Ya mere, dịnụ ike, lezienụ anya idebezu na irube isi nʼihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu Mosis. Unu esila nʼime ya wezuga onwe unu nʼụzọ ọbụla. 7Lezienụ anya ka unu na mba ndị a fọdụrụ nʼala a ghara inwe mmekọ ọbụla. Unu akpọtụkwala chi ha niile aha. Unu aṅụkwala iyi nʼaha ha, maọbụ fee ha ofufe, maọbụ kpọọ isiala nye ha. 8Kama raparanụ nʼahụ Onyenwe anyị Chineke unu dịka unu mere ruo taa.
9“ Onyenwe anyị achụpụla mba dị ukwuu na mba siri ike site nʼebe unu nọ. O nwekwaghị otu mba nʼime ha o kwere ka ha merie unu. 10Otu nwoke nʼime unu achụọla puku ndị ikom ndị iro unu ọsọ. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu alụọlara unu ọgụ, dịka ya onwe ya kwere nkwa. 11Nʼihi ya, lezienụ onwe unu anya nke ọma ka unu hụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya.
12“Ma ọ bụrụ na unu alaghachi azụ, ma kwere ka e jikọọ unu na mba ndị a fọdụrụ nʼetiti unu. Ọ bụrụ na unu na ha ebido ịlụrịta di na nwunye, na-emekọrịta ihe ọnụ, 13maranụ nke ọma, na Onyenwe anyị Chineke unu agaghị achụpụrụ unu mba ndị a site nʼala unu. Kama ha ga-abụrụ unu igbudu na ọnya. Ha ga-abụkwara unu apịpịa nʼakụkụ unu, na ogwu nʼanya unu, ruo mgbe unu ga-ala nʼiyi nʼezi ala a, nke Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu.
14“Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m ga-agbaso ụzọ ahụ ndị niile bi nʼụwa na-aghaghị ịgbaso. Unu niile maara nʼime obi unu na nʼime mkpụrụobi unu na o nweghị otu nʼime nkwa ọma Onyenwe anyị Chineke unu kwere nye unu nke na-emezughị. E mezuola nkwa ndị a niile; o nweghị nke ọbụla a na-emezughị. 15Ma dịka ezi nkwa niile Onyenwe anyị Chineke unu kwere si bụrụ ihe e mezuru emezu, otu a kwa ka Onyenwe anyị ga-esi mee ka ihe ọjọọ niile ọ bara mba ya mezuo nʼisi unu, tutu ruo mgbe o mere ka unu laa nʼiyi nʼezi ala ahụ ọ na-enye unu. 16Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, nke o nyere unu iwu idebe, tụgharịa malite ịgbaso na ife chi ndị ọzọ na ịkpọ isiala nye ha, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, unu ga-alakwa nʼiyi ngwangwa nʼala ọma ahụ o nyere unu.”

Did you know?
Joshua's Farewell Address
- In his advanced age, after Israel had enjoyed a period of rest from surrounding enemies, Joshua gathered Israel's elders, leaders, judges, and officers. He urged them to remain strong and faithfully keep all that was written in the Book of the Law of Moses.Sources: the Bible text itself · Joshua · Moses
- The territory allotted to the tribes stretched from the Jordan River westward to the Great Sea, the ancient name for the Mediterranean Sea. Joshua warned Israel against making alliances, intermarrying, or worshipping the gods of the nations that still remained in the region.Sources: the Bible text itself · Jordan · Great Sea
- Joshua emphasized covenant accountability, noting that just as none of God's good promises had failed to come to pass, breaking the covenant and serving other gods would inevitably bring ruin and loss of the land.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Great Sea · Today: Mediterranean Sea · 31.805, 34.170 · verse 4
- Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verse 4
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org