Joshua 20
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Obodo mgbaba
1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, 2“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha họpụtara onwe unu obodo mgbaba dịka m gwara unu site nʼaka Mosis. 3Ka obodo ndị a bụrụ ebe onye gburu mmadụ nʼọghọm na-amaghị ama ga-agbaga nʼihi izere ndụ ya site nʼaka onye ahụ ga-achọ ịbọrọ ọbọ ọchụ. 4Mgbe onye gburu mmadụ ahụ na-amaghị ama gbabara nʼime otu obodo ndị a, ọ ga-eguzo nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ gwa ndị okenye obodo ahụ ihe niile mere. Ndị okenye ahụ ga-akpọbata ya nʼime obodo ahụ, nye ya ebe ọ ga-ebi nʼetiti ha. 5Ọ bụrụkwa na onye ikwu onye ahụ nwụrụ anwụ abịa ịbọrọ ọbọ ọchụ ahụ, ndị okenye obodo ahụ agaghị ekwe ka e gbuo onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama, nʼihi na onye ahụ akpachaghị anya mee ihe o mere. 6Onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama ga-anọgide nʼobodo ahụ ruo mgbe ọ ga-akwụrụ nʼihu nzukọ maka ikpe ruokwa mgbe onyeisi nchụaja nọ nʼoge ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, o nwere ike laghachi nʼụlọ nke aka ya na nʼobodo ya bụ ebe o si gbapụ ọsọ.”
7Obodo ndị ha kewapụtara iche dịka obodo mgbaba bụ, Kedesh, nke dị nʼime Galili, nʼala ugwu ugwu ndị Naftalị; na Shekem, nke dị nʼala ugwu ugwu Ifrem na Kiriat Aba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Ọ dị nʼala ugwu ugwu Juda. 8Ha kewapụtara obodo atọ ọzọ nʼihi otu ihe ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼofe Jeriko. Obodo atọ ndị a bụ, Beza, nke dị nʼọzara, nʼala larịị ahụ e nyere ebo Ruben, na Ramọt; nke dị nʼime Gilead bụ ala ebo Gad; na Golan, nʼime Bashan, nke e si nʼala ebo Manase wepụta. 9Obodo mgbaba ndị a a họpụtara bụ maka ndị ọbịa bi nʼetiti ụmụ Izrel, na maka ụmụ Izrel. Ọ bụ ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama ga-agbaga. Onye na-abọrọ ọbọ ọchụ agaghị egbukwa onye ahụ tupu e kpee ya ikpe nʼọgbakọ ndị Izrel.

Did you know?
The Cities of Refuge
- The cities of refuge provided sanctuary for anyone who caused an accidental death, protecting them from retaliation by the victim's avenger of blood. A fugitive had to present their case to the elders at the city gate and could remain safely inside until standing trial before the assembly and until the death of the serving high priest.Sources: the Bible text itself
- Six cities were designated across the land, divided evenly with three on each side of the Jordan River. Kedesh, Shechem, and Hebron served the hill country west of the Jordan, while Bezer, Ramoth in Gilead, and Golan in Bashan served the eastern tribes.Sources: the Bible text itself · Hebron · Shechem · Kedesh
- The legal protection provided by the cities of refuge applied equally to native Israelites and to foreigners residing among them.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Galilee · 32.760, 35.527 · verse 7
- Hebron · Today: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · verse 7
- Kedesh · Today: Tel Kedesh · 33.112, 35.530 · verse 7
- Shechem · Today: Tell Balatah · 32.214, 35.282 · verse 7
- Bashan · 32.781, 35.935 · verse 8
- Gilead · Today: Gilead 1 · 32.187, 35.692 · verse 8
- Jericho · Today: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · verse 8
- Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verse 8
- Ramoth · Today: Tall er Rumeith · 32.500, 36.015 · verse 8
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org