Nations Bible

Joshua 19

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Oke ụmụ Simiọn

1Ndị nke abụọ sitere nʼife nza nweta oke ha bụ ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha ketara dị nʼime ala e kenyere ndị Juda. 2Ihe nketa ụmụ Simiọn bụ ndị a:

Bịasheba (maọbụ Sheba), Molada, 3Haza Shual, Bala, Ezem, 4Eltolad, Betul, Homa, 5Ziklag, Bet-Makabot, Haza Susa, 6Bet-Lebaot na Sharuhen, obodo iri na atọ na obodo nta ndị ọzọ gbara ha gburugburu.

7Na Ain, Rimọn, Eta na Ashan, obodo anọ na obodo nta ha, 8tinyekwara obodo nta ndị ọzọ niile gbara obodo ukwu ndị a gburugburu, ruo obodo Baalat-Bịa, ya bụ (obodo Rema dị na Negev). 9E sitere nʼoke ụmụ Juda wepụta oke ụmụ Simiọn, nʼihi na ihe ụmụ Juda ketara dị ukwuu karịa ihe ha kwesiri iketa. Ọ bụ nke a mere ụmụ Simiọn ji nweta ihe nketa site nʼetiti ala ndị Juda.

Oke ụmụ Zebụlọn

10Ebo nke atọ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza bụ ebo Zebụlọn dịka ikwu ha si dị.

Ala ha nwetara gbatịrị ruo Sarid. 11Site nʼebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị gaa nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ruo Marala na Dabeshet, rukwaa iyi dị nʼihu Jokneam. 12O si na Sarid chigharịa ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ahụ ruru nʼoke ala Kislọt Teboa, gbagorokwa ruo Daberat, ruokwa Jafia. 13Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Gat Hefa, Et Kazin na Rimọn, tụgharịa nʼụzọ e si aga Nea. 14Nʼebe ahụ, ọ gara gburugburu nʼakụkụ ugwu ruo Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ifta El ebe ọ sọtụrụ.

15Obodo ndị a niile dịkwa nʼime ihe nketa ụmụ Zebụlọn: Katat, Nahalal, Shịmrọn, Idala na Betlehem. Obodo niile ndị a dị iri na abụọ, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu. 16Obodo ndị a niile na obodo nta ha, so nʼala ụmụ Zebụlọn nwetara dịka ihe nketa ha, dịka ikwu ha si dị.

Oke Ụmụ Isaka

17Ebo nke anọ sitere nʼife nza nweta ihe nketa ha bụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị. 18Ala na obodo ha ketara bụ ndị a:

Jezril, Kesulọt, Shunem, 19Hafaraim, na Shịọn, Anaharat, 20Rabit, Kishiọn, Ebez na 21Remet, En-Ganim, En-Hada na Bet-Pazez.

22Oke ala ha ruru na Taboa, Shahazuma na Bet-Shemesh, ma kwụsị nʼosimiri Jọdan.

Obodo ndị a niile dị iri na isii, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu. 23Ya mere, obodo ukwu ndị a na obodo nta ha dị nʼala ahụ ebo Isaka nwetara dịka ihe nketa ha, dị ka ikwu ha si dị.

Oke ụmụ Asha

24Ebo nke ise e kenyere ala site nʼife nza bụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị. 25Ala na obodo ha ketara bụ ndị a:

Helkat, Hali, Beten, Akshaf, 26Alamelek, Amad na Mishal. Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ gbatịrị ruo Kamel na Shihoa-Libnat. 27O sitere nʼebe ahụ tụgharịa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ gawa Bet-Dagọn, ma ruokwa Zebụlọn na Ndagwurugwu Ifta El, ma gbagoro ruokwa Bet-Emek na Neiel. O sikwa nʼebe ahụ gafee, ruo Kabul, nʼakụkụ aka ekpe. 28Ọ gara ruo Ebrọn, Rehob, Hamọn na Kana, ruokwa ebe obodo Saịdọn gbasapụrụ. 29Oke ala ahụ mere dịka ọ na-alaghachi azụ bịaruo Rema, ruokwa obodo e wusiri ike bụ Taịa, tụgharịakwa gawa Hosa pụta nʼọnụ mmiri osimiri Mediterenịa nke dị nʼakụkụ Akzib 30na Umma, Afek na Rehob.

Ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri abụọ na abụọ tinyere obodo nta ha niile. 31Obodo ndị a na obodo nta ha niile dị nʼala ahụ ebo Asha nwetara dịka ihe nketa, dịka ikwu ha si dị.

Oke ụmụ Naftalị

32Ebo nke isii e nyere ihe nketa site nʼife nza bụ ebo Naftalị, dịka ikwu ha si dị.

33Oke ala ha malitere na Helef ruo nʼosisi ukwu dị na Zaananim, Adami Nekeb na Jabneel, gafee ruo Lakum, kwụsị nʼosimiri Jọdan. 34Site nʼebe ahụ oke ala ha gara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo Aznot Tabo, site nʼebe ahụ ruo Hukọk, rute Zebụlọn na ndịda, na Asha nʼọdịda anyanwụ, ruokwa Juda nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.

35Obodo niile e wusiri ike e kenyere ha bụ ndị a: Zidim, Zea, Hamat, Rakat, Kineret, 36Adama, Rema, Hazọ, 37Kedesh, Edrei, En-Hazoa, 38Iron, Migdal El, Horem, Bet-Anat na Bet-Shemesh.

Ya mere, ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri na itoolu, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu. 39Obodo ndị a na obodo nta ha niile ka ebo Naftalị dịka ikwu ha si dị, nwetara dịka ihe nketa ha.

Oke ụmụ Dan

40Site nʼife nza ebo Dan, bụ ebo nke asaa nwetara ihe nketa dịka ikwu ha si dị. 41Oke ala ihe nketa ha bụ ndị a:

Zora, Eshtaol, Ia-Shemesh, 42Shaalabin, Aijalon, Itla, 43Elọn, Timna, Ekrọn, 44Elteke, Gibeton, Baalat, 45Jehud, Bene-Berak, Gat Rimọn, 46Me-Jakọn na Rakọn, obodo dị nʼoke ala, na ncherita ihu Jopa. 47Mgbe oke ala ụmụ Dan ketara sitere nʼaka ha pụọ. Ha gara buso obodo Leshem agha merie ha, were mma agha tigbuo ndị niile bi nʼime ya, bichie ya. Ha kpọrọ obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna nna ha ochie. 48Obodo ndị a na obodo nta ha bụ ihe nketa ebo Dan nwetara dịka ikwu ha si dị.

Oke Joshua

49Mgbe e kechara ala ahụ niile, nye ebo ọbụla ala dịka ọnụọgụgụ ha niile si dị, ụmụ Izrel nyere Joshua, nwa Nun ihe nketa ha nʼetiti ha. 50Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na Joshua nwere ike iwere ala ọbụla ọ chọrọ. Ya mere, ha nyere Joshua obodo Timnat Sera nke dị nʼugwu Ifrem. Joshua wugharịrị obodo ahụ biri nʼime ya.

51Ndị a bụ oke ala nke Elieza onye nchụaja, Joshua nwa Nun na ndịisi ụlọ ebo ụmụ Izrel, kere na Shaịlo site nʼife nza nʼihu Onyenwe anyị, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ha si otu a kebie ala ahụ.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Final Allotments of Land

  • Simeon received an allotment located entirely inside the larger territory of Judah, because Judah's portion was considered too large for them. This included southern desert settlements such as Beersheba and Moladah.Sources: the Bible text itself · Simeon · Beersheba · Moladah
  • Dan was the last tribe to receive its land allocation, situated on the western border toward the sea. When the Danites faced difficulty holding their original territory, they marched north to capture the city of Leshem and renamed it Dan after their ancestor.Sources: the Bible text itself · Dan
  • Only after the division of the tribal lands was complete did the leaders grant Joshua son of Nun his personal inheritance. He requested and received the city of Timnath-serah in the hill country of Ephraim, which he rebuilt and settled.Sources: the Bible text itself · Joshua

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Negeb · 31.245, 34.841 · verse 8
  • Jokneam · Today: Tel Yokneam · 32.664, 35.108 · verse 11
  • Bethlehem · Today: Beit Lahm · 32.735, 35.186 · verse 15
  • Shunem · Today: Sulam · 32.606, 35.334 · verse 18
  • Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verses 22, 33, 34
  • Mount Tabor · Today: Jebel et Tur · 32.686, 35.393 · verse 22
  • Mount Carmel · 32.672, 35.023 · verse 26
  • Sidon · Today: Sandikli archaeological site in Sidon · 33.561, 35.372 · verse 28
  • Great Sea · Today: Mediterranean Sea · 31.805, 34.170 · verse 29
  • Tyre · 33.271, 35.196 · verse 29
  • Allon · Today: in Hanot Taggarim · 32.721, 35.411 · verse 33
  • Hazor · Today: Tel Hazor · 33.018, 35.569 · verse 36
  • Kedesh · Today: Tel Kedesh · 33.112, 35.530 · verse 37
  • Ir-shemesh · Today: Tel Bet Shemesh · 31.751, 34.975 · verse 41
  • Ekron · Today: Tel Miqne · 31.777, 34.852 · verse 43
  • Joppa · Today: Jaffa · 32.054, 34.753 · verse 46
  • Dan · Today: Tel Dan · 33.249, 35.652 · verse 47
  • Shiloh · Today: Khirbet Seilun · 32.056, 35.290 · verse 51

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.