Nations Bible

Joshua 15

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Oke ndị Juda

1Ala ndị a ka e nyere ndị Juda dịka ikwu dị nʼebo ahụ si dị. Ikwu ọbụla ketara ala nke ha site nʼife nza. Ala Juda gbatịrị nnọọ ruo nʼoke ala Edọm, gbatịakwa ruo nʼọzara Zin, kwụsị nʼọnụ ọnụ ndịda ọzara a.

2Nʼakụkụ ndịda, oke ala ha malitere nʼọnụ ọnụ ndịda osimiri Nnu. 3Site nʼebe akụkụ ndịda nrigo Akrabim, gafee ruo nʼọzara Zin, ma rigoo nʼakụkụ nke ndịda Kadesh Banea, gafee Hezrọn rigoruo na Aada, gba gburugburu gaa Kaka; 4site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda.

5Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan.

Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, 6gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba, rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben. 7Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị ruo na Ndagwurugwu Akọ na Debịa, tụgharịa gbatịrịkwa ruo Gilgal, na ncherita ihu ala ala Adumim nke dị nʼakụkụ ndịda ndagwurugwu ahụ. Site nʼebe ahụ ọ gbatịrị ruo na mmiri En-Shemesh, kwụsị na En-Rogel. 8Oke ala ahụ gbagoro Ndagwurugwu nke Ben Hinom, rukwaa nʼakụkụ ndịda Jebus nʼebe e wuru obodo Jerusalem. Oke ala ahụ sitekwara ebe ahụ gbagoo ruo nʼelu dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke Ndagwurugwu Hinom, na nsọtụ ugwu nke Ndagwurugwu Refaim. 9Site nʼelu ugwu ebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị ruo na mmiri ime ala Neftoa, pụta site nʼebe ahụ ruo obodo niile dị nso ugwu Efrọn. Site nʼEfrọn, oke ala ahụ gbadara ruo Baala (nke aha ya ọzọ bụ Kiriat Jearim). 10Oke ala ahụ mere dịka ọ ga-agba Baala gburugburu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site nʼebe ahụ pụta nʼugwu Sia, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼakụkụ ugwu Jearim (ya bụ Kesalon), gbatịa ruo na ndịda Bet-Shemesh, gafee ruo nʼọdịda anyanwụ oke ala Timna. 11O sikwara ebe ahụ ruo ndịda ugwu Ekrọn, tụgharịa ruo Shikerọn, gafee ya, ruo nʼugwu Baala, sitekwa nʼebe ahụ ruo Jabneel, oke ala ahụ kwụsịrị nʼosimiri.

12Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa.

Kaleb emerie Hebrọn na Debịa

13Dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị, Joshua nyere Kaleb nwa Jefune oke nʼetiti ndị Juda. O kenyere ya Kiriat Aaba, ya bụ, Hebrọn. Aaba bụ nna nna Anak. 14Kaleb sitere nʼobodo Hebrọn chụpụ ndị ikom atọ, bụ Sheshai, na Ahiman, na Talmai, ụmụ Anak nʼala ha. 15O si nʼebe ahụ bilie ịlụso ndị bi na Debịa ọgụ. Nke a na-akpọ Kiriat Sefa nʼoge mbụ. 16Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa, bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.” 17Ya mere, Otniel, nwa Kenaz, nwa nwanne Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.

18Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”

19Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.

20Nke a bụ ihe nketa ebo Juda dịka ikwu ha niile si dị.

21Obodo niile nke ndị ebo Juda dị na Negev, nʼakụkụ ndịda nʼoke ala Edọm bụ ndị a:

Kabzeel, Eda, Jaguo, 22Kina, Dimona, Adada, 23Kedesh, Hazọ, Itnan, 24Zif, Telem, Bealot, 25Hazọ Hadata, Keriọt Hezrọn (ya bụ Hazoa), 26Amam, Shema, na Molada, 27Haza Gada, Heshmọn, Bet-Pelet, 28Haza Shual, Bịasheba, Biziotịa, 29Baala, Iyim, Ezem, 30Eltolad, Kesil, Homa, 31Ziklag, Madmanna, Sansanna, 32Lebaot, Shilhim, Ain na Rimọn. Ọnụọgụgụ obodo ndị a dị iri abụọ na itoolu. Obodo nta ndị ọzọ gbara ha niile gburugburu.

33Obodo niile ndị a dị na ndịda ugwu ka e nyekwara ebo Juda. Obodo ndị a bụ,

Eshtaol, Zora, Ashna, 34Zanoa, En-Ganim, Tapụọa, Enam, 35Jamut, Adulam, Soko, Azeka, 36Shaaraim, Aditaịm na Gedera (maọbụ Gederotaịm). Ha niile dị obodo iri na anọ. Obodo nta ndị ọzọ gbakwara ha gburugburu.

37Ebo Juda ketara Zenan, Hadasha, Migdal Gad, 38Dilean, Mizpa, Jekteel, 39Lakish, Bozkat, Eglọn, 40Kabọn, Laamam, Kitlish, 41Gederọt, Bet-Dagọn, Naama na Makeda. Obodo ndị a dị iri na isii, tinyekwara obodo nta ha. Ndị Juda ketakwara:

42Libna, Eta, Ashan 43Ifta, Ashna, Nezib, 44Keila, Akzib na Maresha. Ha niile dị obodo itoolu, tinyekwara obodo nta ha niile.

45Ha ketakwara Ekrọn, na obodo nta ya niile. 46Ọ bụ ha nwekwa obodo niile dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Ekrọn, ndị dị nso nso Ashdọd, na obodo nta niile dị ha nso. 47Ma Ashdọd nʼonwe ya, na ụmụ obodo nta ya niile, na Gaza na obodo nta ya niile, ruo nʼiyi Ijipt, na ruo nʼoke osimiri Mediterenịa.

48Ha nwetakwara ala ndị dị nʼugwu ugwu bụ,

Shamia, Jatịa, Sokoh, 49Dana, Kiriat-Sana (ya bụ Debịa), 50Anab, Eshtemo, Anim, 51Goshen, Họlọn na Gailo, ha niile dị obodo iri na otu tinyere obodo nta ha niile.

52Obodo ndị ọzọ bụ Arab, Duma, Eshan, 53Janim, Bet-Tapụọa, Afeka, 54Humta, Kiriat Aba nke bụ Hebrọn na Zior, obodo itoolu tinyere obodo nta ha niile.

55Maon, Kamel, Zif, Juta, 56Jezril, na Jokdeam, Zanoa, 57Kain, Gibea na Timna, obodo iri tinyere obodo nta ha niile.

58Halhaul, Bet Zoa, Gedoa, 59Maarat, Bet-Anot na Eltekọn, obodo isii tinyere obodo nta ha niile.

60Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim na Raba, obodo abụọ tinyere obodo nta ha niile.

61Obodo ha ndị dị nʼọzara bụ ndị a:

Bet-Araba, Midin, Sekaka, 62Nibshan, Obodo Nnu na En-Gedi, obodo isii tinyere obodo nta ha niile.

63Ma ebo Juda enweghị ike ịchụpụ ndị Jebus bi nʼime Jerusalem; ruo taa ndị Jebus bi na Jerusalem, nʼetiti ụmụ Juda.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Allotment of Judah and Caleb's Inheritance

  • In accordance with the command given to Joshua, Caleb received Kiriath-arba (Hebron), named after Arba the forefather of Anak. From there, Caleb drove out the three descendants of Anak: Sheshai, Ahiman, and Talmai.Sources: the Bible text itself · Caleb · Anak
  • When Othniel captured Kiriath-sepher (Debir), he won Caleb's daughter Achsah as his wife. Recognizing the arid nature of her land in the Negev, Achsah asked her father for water sources and was granted both the upper and lower springs.Sources: the Bible text itself · Achsah · Caleb
  • The territory allotted to the tribe of Judah spanned widely from the Dead Sea to the Mediterranean coastline, reaching south toward Edom and the Brook of Egypt. Despite this vast allotment of towns and villages, the people of Judah were unable to dislodge the Jebusites inhabiting Jerusalem.Sources: the Bible text itself · Jerusalem · Edom · Salt Sea

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Edom · 30.746, 35.604 · verses 1, 21
  • Negeb · 31.245, 34.841 · verses 1, 19, 21
  • Zin · Today: Zin Desert · 30.971, 35.325 · verse 1
  • Salt Sea · Today: Dead Sea · 31.500, 35.500 · verses 2, 5
  • Great Sea · Today: Mediterranean Sea · 31.805, 34.170 · verses 4, 11, 12, 47
  • Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verse 5
  • Adummim · 31.817, 35.362 · verse 7
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 8, 63
  • Valley of Hinnom · Today: Hinnom Valley · 31.769, 35.228 · verse 8
  • Valley of Rephaim · 31.763, 35.219 · verse 8
  • Baalah · Today: Deir el Azar · 31.809, 35.104 · verses 9, 10
  • Kiriath-jearim · Today: Deir el Azar · 31.809, 35.104 · verses 9, 60
  • Mount Jearim · Today: within 1 km of Kesla · 31.781, 35.051 · verse 10
  • Ekron · Today: Tel Miqne · 31.777, 34.852 · verses 11, 45, 46
  • Hebron · Today: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · verses 13, 14, 54
  • Gulloth-mayim · Today: within 5 km of Khirbet Rabud · 31.432, 35.015 · verse 19
  • Lower Gulloth · Today: within 5 km of Khirbet Rabud · 31.432, 35.015 · verse 19
  • Upper Gulloth · Today: within 5 km of Khirbet Rabud · 31.432, 35.015 · verse 19
  • Shephelah · 31.692, 34.875 · verse 33
  • Jarmuth · Today: Tel Yarmuth · 31.708, 34.975 · verse 35
  • Socoh · Today: Tel Socho · 31.682, 34.975 · verse 35
  • Lachish · Today: Tell ed Duweir · 31.565, 34.849 · verse 39
  • Mareshah · Today: Tel Maresha · 31.593, 34.898 · verse 44
  • Ashdod · Today: Tel Ashdod · 31.757, 34.658 · verses 46, 47
  • Gaza · Today: Tell Harube · 31.504, 34.464 · verse 47
  • Jattir · Today: Khirbet Attir · 31.352, 35.016 · verse 48
  • Maon · Today: Tel Main · 31.409, 35.134 · verse 55
  • Engedi · Today: Ein Gedi · 31.450, 35.383 · verse 62

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.