Nations Bible

Joshua 14

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Okike ala dị nʼọwụwa anyanwụ Jọdan

1Otu a ka esi kenye ndị Izrel ala Kenan, bụ nke Elieza onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndị ndu ikwu niile dị nʼebo Izrel kere. 2Ebo ọbụla nʼime ebo itoolu na ọkara ahụ fọdụrụ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu. 3Ma Mosis enyelarị ebo abụọ na ọkara ala nke ha nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. Ma o kenyeghị ndị Livayị ihe nketa ọbụla nʼetiti ha. 4Nʼihi na ụmụ Josef dị ebo abụọ, ya bụ Manase na Ifrem. Enyeghị ndị Livayị oke nʼala ahụ, karịa obodo ụfọdụ ebe ha ga-ebi na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. 5Ndị Izrel keere ala ahụ nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

Ala Kaleb ketara

6Nʼoge a, ụmụ Juda zipụrụ ndị ozi ndị jekwuuru Joshua na Gilgal. Kaleb, nwa Jefune, onye Keniz so ha nʼije a. Mgbe ha bịarutere, Kaleb gwara Joshua okwu sị ya, “I chetakwara okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis onye nke Chineke banyere gị na banyere mụ onwe m, mgbe anyị nọ na Kadesh Banea? 7Agbara m iri afọ anọ nʼoge ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ anyị ịga iledo ala ndị Kenan anya. Mgbe anyị lọghachiri, agwara m ya okwu, kọwaara ya ihe m chere nʼobi m bụ eziokwu. 8Ma ụmụnna anyị, ndị anyị na ha so gaa, menyere ụmụ Izrel egwu, mee ka obi ha daa mba ịchọ ịbanye nʼala ahụ e kwere anyị na nkwa. Ma ebe m nọgidere jiri obi m niile soro Onyenwe anyị Chineke m, 9Mosis ṅụrụ iyi sị m, ‘Ebe ọ bụ na i ji obi gị niile soro Onyenwe anyị Chineke m, ala ahụ i jegharịrị ije nʼelu ya ga-abụ ihe nketa nye gị na ụmụ gị ruo mgbe ebighị ebi.’

10“Ugbu a, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa, o meela ka m dị ndụ. Nke a bụ iri afọ anọ na ise kemgbe Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a, mgbe Izrel na-awagharị nʼọzara. Ma ugbu a, lee, agbaala m iri afọ asatọ na ise taa. 11M dị ike taa dịka m dị nʼụbọchị ahụ Mosis zipụrụ m. Dịka ike m dị mgbe ahụ, adịkwa m ike ugbu a, ịpụ buo agha ma batakwa 12Ya mere, nye m ala ugwu ugwu ahụ Onyenwe anyị kwere m nkwa nʼụbọchị ahụ. Gị onwe gị nụrụ nʼoge ahụ na ụmụ Anak bi nʼebe ahụ, na obodo ha bukwara ibu, na e jikwa mgbidi e wusiri ike gbaa ha gburugburu. Ma site nʼinyeaka Onyenwe anyị, aga m achụpụ ha dịka Onyenwe anyị kwuru.”

13Nʼihi nke a, Joshua gọziri Kaleb nwa Jefune. O nyere ya obodo Hebrọn ka ọ bụrụ ihe nketa ya. 14Ya mere, obodo Hebrọn ghọrọ ihe nketa Kaleb nwa Jefune onye Keniz bido mgbe ahụ, nʼihi na o ji obi ya niile soro Onyenwe anyị, Chineke Izrel. 15Tupu oge a, aha a na-akpọ Hebrọn bụ Kiriat Aaba, nke pụtara Obodo Aaba. Aaba bụkwa aha nwoke kachasị ịdị ukwuu nʼetiti ndị Anak niile.

Site nʼoge a gaa nʼihu, e nwere udo nʼala ahụ niile.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Caleb's Inheritance and the Division of Canaan

  • The distribution of land west of the Jordan was led by the high priest Eleazar, Joshua, and tribal heads using lots for nine and a half tribes. The tribe of Levi received no territorial territory, receiving only cities with pasturelands, while Joseph's sons, Ephraim and Manasseh, formed two distinct tribal inheritances.Sources: the Bible text itself · Eleazar · Joseph (son of Jacob)
  • At eighty-five years of age, Caleb approached Joshua at the camp in Gilgal to request the fortified hill country of Hebron, recalling the promise Moses made forty-five years earlier at Kadesh-barnea. The city of Hebron was previously known as Kiriath-arba, named after Arba, the greatest man among the Anakim.Sources: the Bible text itself · Caleb · Hebron · Kadesh-barnea

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Canaan · 32.767, 35.333 · verses 1, 7, 9
  • Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verse 3
  • Hebron · Today: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · verses 13, 14, 15

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.