Nations Bible

Joshua 11

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Mmeri nke ndị eze si nʼugwu

1Mgbe Jabin eze Hazọ nụrụ nke a, o ziri ozi zigara Jobab eze ndị Madọn, zigakwara ndị eze obodo Shịmrọn na Akshaf, 2na ndị eze bi nʼobodo ugwu ugwu, na ndị bi nʼime Araba, na ndịda Kineret, na ndagwurugwu ọdịda anyanwụ, na nʼime Nafọt Doa, nke dị nʼọdịda anyanwụ, 3zigakwara eze ndị Kenan ndị bi nʼọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ, zigakwara eze ndị Amọrait, na eze ndị Het, na eze ndị Periz, na nke ndị Jebus nke dị nʼala ugwu. O zigakwara eze ndị Hiv ndị bi na ndịda Hemon, na mpaghara Mizpa. 4Ndị eze a niile kwekọrịtara chịkọtaa ndị agha ha niile nʼotu. Ndị agha ha chịkọtara dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha ji ọtụtụ ịnyịnya na ọtụtụ ụgbọ agha. 5Eze ndị a niile zukọrọ maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri Merọm, maka ibuso Izrel agha.

6Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla ha egwu, nʼihi na echi, nʼoge dịka ugbu a, aga m ewere ha niile nʼọnọdụ ndị egburu egbu nyefee ha nʼaka Izrel. Ị ga-ebipụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, kpọọkwa ụgbọ agha ha niile ọkụ.”

7Ya mere, Joshua na ndị agha ya niile bịaruru akụkụ mmiri Merọm na mberede, lụso ha agha. 8Onyenwe anyị nyefere ndị agha ha nʼaka ndị Izrel, ndị lụgburu ha, chụọ ha ọsọ ruo nʼoke ala Saịdọn, ruokwa ebe a na-akpọ Mizrefot Maim, na ruo nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼime Ndagwurugwu Mizpa. Ya mere, o nweghị ọ bụladị otu onye iro a hapụrụ ndụ nʼagha ahụ. 9Joshua na ndị agha ya mere ha ihe Onyenwe anyị kwuru na a ga-eme ha. Ha gbupụrụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, surekwaa ụgbọ agha ha niile nʼọkụ.

10Mgbe ahụ, Joshua laghachiri azụ busoo Hazọ agha merie ya, were mma agha gbuo eze ya, nʼihi na Hazọ bụrịị isi obodo alaeze ahụ niile. 11Ha ji mma agha gbuo ndị niile bi nʼobodo ahụ, bibie ha kpamkpam, ọ dịghị onye a hapụrụ nke na-eku ume. O sukwara Hazọ ọkụ.

12Joshua weere obodo niile nke ndị eze ahụ na ndị eze ha niile, jiri mma agha gbuchapụ ha. Ọ lakwara ha niile nʼiyi, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu. 13Ma ndị Izrel esughị obodo ọbụla nʼime ndị ahụ niile e wuru na mkputamkpu ala ọkụ, karịakwa obodo Hazọ, nke Joshua kpọrọ ọkụ. 14Ihe niile a kwatara nʼagha nʼobodo ndị a, na anụ ụlọ ha niile, ka ndị Izrel weere. Ma ha gburu mmadụ niile. Ha ahapụghị ọ bụladị otu onye ndụ. 15Nʼihi na nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis onyeozi ya. Mosis nyekwara Joshua otu iwu a. Ugbu a Joshua emeela dịka a gwara ya. O mezuru ihe ndị a niile, bụ nke Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

16Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile, bụ ala ugwu ugwu ahụ, na ala Negeb, na ala Goshen, na obosara ala ọdịda anyanwụ ahụ niile, na ala Araba, na ala ugwu ahụ niile, na ala ahụ dị na mgbada ugwu Izrel. 17Nʼihi nke a, ala ndị Izrel nwere gbasara nʼụzọ niile site nʼugwu Halak, nke dị nso na Sia, ruo Baal-Gad nke dị na Ndagwurugwu Lebanọn, na ndịda ugwu Hemon. Joshua jidere ma gbukwaa ndị eze ndị ala ahụ niile. 18O were Joshua ogologo oge imeri obodo ndị a niile na eze ha nʼagha. 19Ọ dịkwaghị obodo ọzọ e mere ka ha na ụmụ Izrel dị nʼudo karịa naanị ndị Hiv, ndị bi na Gibiọn. Obodo ndị ọzọ niile ka a lara nʼiyi. 20Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼonwe ya, mere ka ndị eze ahụ nyịchie obi ha, ka ha lụso Izrel agha, ka o si otu a laa ha nʼiyi, kpochapụkwa ha niile, na-emereghị ha amara, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

21Nʼoge ahụ kwa, Joshua gara kpochapụ ndị Anak ahụ bi nʼala ugwu ugwu, ya bụ, na Hebrọn, na Debịa, na Anab, na ala ugwu ugwu Juda, na ala ugwu ugwu Izrel. O gburu ha niile, laa obodo ha nʼiyi. 22Ọ dịkwaghị otu onye Anak a hapụrụ ndụ nʼoke ala Izrel niile, karịakwa ndị fọdụrụ na Gaza, na Gat, na nʼime Ashdọd.

23Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu. O nyekwara ndị Izrel ala ahụ dịka ihe nketa ha. O kenyere ha ala ahụ dịka ebo ha si dị. Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, ala ahụ dara jụụ. Ibu agha adịghịkwa nʼime ya ọzọ.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Northern Conquest and the Fall of Hazor

  • Hazor was described as the head of all the northern Canaanite kingdoms. Although the Israelites captured many towns established on mounds during this campaign, Hazor was the only fortified city that Joshua completely burned to the ground.Sources: the Bible text itself · Hazor
  • The battle at the waters of Merom was the decisive conflict that completed Joshua's northern campaign. Here, the Israelites faced a vast coalition armed with horses and war chariots, encountering this form of Canaanite military technology for the first time.Sources: the Bible text itself · Jabin · Merom
  • The narrative notes that, with the exception of the Hivite inhabitants of Gibeon, none of the Canaanite cities made peace treaties with Israel, resulting in a prolonged war that eventually subdued the entire region.Sources: the Bible text itself · Hivite

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Hazor · Today: Tel Hazor · 33.018, 35.569 · verses 1, 10, 11, 13
  • Arabah · 30.417, 35.151 · verses 2, 16
  • Shephelah · 31.692, 34.875 · verses 2, 16
  • Canaan · 32.767, 35.333 · verse 3
  • Mount Hermon · 33.400, 35.850 · verses 3, 17
  • Sidon · Today: Sandikli archaeological site in Sidon · 33.561, 35.372 · verse 8
  • Valley of Mizpeh · Today: about 30 km around Mount Hermon · 33.400, 35.850 · verse 8
  • Negeb · 31.245, 34.841 · verse 16
  • Valley of Lebanon · Today: Beqaa Valley · 34.009, 36.145 · verse 17
  • Gibeon · Today: El Jib · 31.847, 35.183 · verse 19
  • Hebron · Today: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · verse 21
  • Ashdod · Today: Tel Ashdod · 31.757, 34.658 · verse 22
  • Gaza · Today: Tell Harube · 31.504, 34.464 · verse 22

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.