Nations Bible

Joshua 10

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Nguzo nke anyanwụ

1Mgbe Adoni-Zedek, eze Jerusalem nụrụ na Joshua emeriela Ai, laa ya nʼiyi, gbukwaa eze ya, dịka ọ lara Jeriko na eze ya nʼiyi, mgbe ọ hụkwara na ndị Gibiọn na ndị Izrel emeela udo, na ha bikwa nso ndị Izrel, 2ọ tụrụ egwu nke ukwuu, ya na ndị ya. Nʼihi na Gibiọn bụ obodo a ma ama, dịka otu nʼime obodo ndị eze, ndị ikom ya bụkwa ndị dị ike, nʼihi na ọ dịkwa ukwuu karịa Ai. Ndị ikom ya niile maara otu e si ebu agha. 3Ya mere, Adoni-Zedek, eze Jerusalem ziri ozi zigara eze ndị a: Homa, eze Hebrọn, Piram, eze Jamut, Jafia, eze Lakish, na Debịa, eze Eglọn, na-asị, 4“Bịanụ nyere m aka, ka anyị gaa tigbuo Gibiọn, nʼihi na ha na Joshua na ụmụ Izrel emeela udo.”

5Mgbe ahụ, eze ise ndị Amọrait ndị a, eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish na eze Eglọn chịkọtara ndị agha. Ha na ndị agha ha gara were ọnọdụ ha imegide Gibiọn, ha lụsokwara ha ọgụ.

6Ma ndị Gibiọn mere ngwangwa zigara Joshua ozi nʼụlọ ikwu dị na Gilgal sị ya, “Bịa nyere ndị ohu gị aka. Bịa ngwangwa zọpụta anyị, nʼihi na eze niile nke ndị Amọrait, ndị bi nʼugwu, abịala nʼebe a, ha na ndị agha ha ibuso anyị agha.”

7Joshua na ndị agha ya niile, tinyere ndị ahụ niile ibu agha were anya, hapụrụ Gilgal gawa ịzọpụta Gibiọn. 8Ma Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Atụla ha egwu! Nʼihi na ha bụ ndị e meriri emeri. Enyela m ha nʼaka unu ịla ha nʼiyi. Ọ dịkwaghị otu onye nʼetiti ha nwere ike iguzo nʼihu unu.”

9Joshua bịakwutere ha na mberede, nʼihi na ogologo abalị niile ka o si Gilgal gaa njem. 10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tinyere ha nʼọnọdụ ọgbaaghara mgbe ha zutere ndị Izrel. Nke a mere ka ndị agha Izrel lụgbuo ha na Gibiọn. Nʼezie, ọnụọgụgụ ndị ha tigburu na Gibiọn dị nnọọ ukwuu. Ma ha chụkwara ndị fọdụrụ ọsọ chụruo ha Bet-Horon, na Azeka, na Makeda, na-egbu ha nʼụzọ. 11Mgbe ha si nʼihu Izrel gbapụ ọsọ nʼụzọ nrịda Bet-Horon na-aga Azeka, Onyenwe anyị sitere nʼelu na-atụdakwasị ha ọtụtụ mkpụrụ mmiri. Ọnụọgụgụ ndị mkpụrụ mmiri ndị a dagburu dị ukwuu karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha ha gbuo.

12Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel lụgbuo ndị Amọrait. Joshua gwara Onyenwe anyị okwu nʼihu ndị Izrel niile sị,

“Gị, anyanwụ, guzo nʼotu ebe na mbara eluigwe Gibiọn.

Gị, ọnwa, guzokwa nʼotu ebe na mbara eluigwe na Ndagwurugwu Aijalon”

13Anyanwụ guzoro,

ọnwa guzokwa.

Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha.

Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha.

Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu. 14O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị Onyenwe anyị mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na Onyenwe anyị na-eburu Izrel agha.

15Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu dị na Gilgal.

Ogbugbu ndị eze Amọrị ise

16Ma nʼoge ahụ a na-alụ agha ahụ, ndị eze ise ahụ si nʼọgbọ agha gbapụ, zoo onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda. 17Mgbe ozi ruru Joshua ntị, na a chọtala eze ise ndị ahụ, ebe ha zoro onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda, 18Joshua nyere iwu sị, “Werenụ nkume buru ibu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Debekwanụ ndị nche nʼebe ahụ, ka ha chee ndị eze ahụ nche. 19Ma unu eguzola nʼebe ahụ nʼonwe unu, chụsonụ ndị iro unu, na-egbukwanụ ha site nʼazụ. Unu ekwela ka ha gbaba nʼobodo ha dị iche iche, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu enyefeela ha nʼaka unu.”

20Ya mere, Joshua na ndị Izrel tigbuchara ha kpamkpam nʼụzọ dị egwu, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nʼime ha nwere ike gbaba nʼime obodo ha e wusiri ike. 21Ndị agha niile laghachikwuru Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu ha dị na Makeda nʼudo. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nwara anwa kwuo okwu megide ndị Izrel nʼala ahụ.

22Mgbe ahụ Joshua sịrị, “Megheenụ ọnụ ọgba nkume ahụ, wepụtanụ ndị eze ise ahụ.” 23Ya mere, ha kpọpụtara ndị eze ise ahụ site nʼọgba nkume ahụ, ha bụ eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish, na eze Eglọn. 24Mgbe a kpụtara ha nʼihu Joshua, ọ kpọrọ ndị ikom Izrel niile ka ha zụkọta, ọ gwara ndịisi agha bụ ndị so ya jee, “Bịanụ nso, zọkwasịnụ ụkwụ unu nʼolu eze ndị a.” Ya mere, ha bịara zọkwasị ụkwụ ha nʼolu ha.

25Joshua sịrị ha, “Unu atụla egwu, maọbụ daa mba. Dịnụ ike, nweekwanụ ume, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị ga-eme ndị iro unu niile bụ ndị na-ebuso unu agha.” 26Emesịa, Joshua ji mma agha ya gbuo eze ise ndị a. Ọ kwụbara ha nʼelu osisi ise, ebe ha nọ ruo nʼoge anyasị.

27Ma mgbe anwụ bidoro ịda, Joshua nyere iwu ka e site nʼosisi wedata ozu ndị eze ise ahụ, tụba ha nʼime ọgba nkume ahụ, ebe ha zoro onwe ha. Ha ji nkume dị ukwuu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Nkume ukwuu ahụ dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.

Obodo ndị ọzọ Joshua lụgburu

28Nʼotu ụbọchị ahụ, Joshua lara obodo Makeda nʼiyi, jiri mma agha gbuo eze ya, na onye ọbụla bi nʼime ya. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nọ nʼime obodo ahụ ọ hapụrụ ndụ. Otu ihe ahụ o mere eze Jeriko ka o mere eze Makeda.

29Joshua na ndị Izrel niile so ya sitere na Makeda gaa na Libna lụso ya agha. 30Onyenwe anyị nyekwara obodo a na eze ya nʼaka Izrel. Joshua weere mma agha ya tigbuo mmadụ niile dị nʼime ya. O nweghị onye ọbụla nke ọ hapụrụ ndụ nʼebe ahụ. O mekwara eze obodo a ihe o mere eze Jeriko.

31Site na Libna, Joshua na ndị Izrel gara ruo Lakish, lụso ha agha. 32Ma Onyenwe anyị nyefere Lakish nʼaka ụmụ Izrel. Joshua lụgburu ya nʼụbọchị nke abụọ ya. Ha weere mma agha ha tigbuo mmadụ niile bi nʼime ya, dịka ha mere Libna. 33Ma mgbe a na-alụ agha na Lakish, Horam eze Gaza, duuru ndị agha ya bịa inyere ndị obodo Lakish aka, ka ha si otu a gbochie ndị agha Izrel ịbata nʼime ya. Ma ndị agha Joshua gburu ya, laa ndị agha ya niile nʼiyi, ruo na ọ fọdụghị otu onye.

34Emesịa, nʼụbọchị ahụ kwa, Joshua na ndị Izrel hapụrụ Lakish gaa Eglọn lụgbuo ya. 35Ha were obodo ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, jiri mma agha ha tigbuo mmadụ niile dị nʼime obodo ahụ, dịka ha mere na Lakish.

36Mgbe Joshua na ndị Izrel sitere nʼEglọn pụọ, ha gara Hebrọn buso ya agha. 37Ha weere obodo ahụ, jiri mma agha gbuo eze ha, na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha gburu ndị mmadụ niile bi nʼime ya dịka ha mere nʼEglọn. Ọ dịkwaghị otu onye a hapụrụ ndụ.

38Joshua na ndị Izrel niile ya na ha so laghachiri azụ gaa busoo Debịa agha. 39Ha meriri obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, na eze ya, jiri mma agha gbuchapụ ha niile, mmadụ niile nọ nʼime ya ka ha gburu kpamkpam. Ha ahapụghị onye ọbụla ndụ, ha mere Debịa na eze ya dịka ha mere Libna na eze ya, na Hebrọn kwa.

40Ya mere, Joshua na ndị agha ya meriri obodo ahụ niile, na ala ahụ niile. O meriri eze niile nke obodo ugwu ahụ, na ndị bi na Negeb, na mgbada ala ugwu dị nʼọdịda anyanwụ, na mgbada ala ugwu ugwu ahụ. O gbuchara mmadụ niile bi nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya iwu. 41Joshua tigburu ha niile site na Kadesh Banea ruo Gaza, sitekwa na Goshen ruo Gibiọn. 42Eze ndị a niile, na ala ha niile, ka Joshua meriri nʼotu oge ibu agha, nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-alụrụ Izrel agha.

43Emesịa, Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu ha dị na Gilgal.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Battle for Gibeon and the Southern Conquest

  • When the large city of Gibeon made a peace treaty with Israel, Adoni-zedek of Jerusalem formed an alliance with four other Amorite kings from Hebron, Jarmuth, Lachish, and Eglon to attack it, prompting Gibeon to call on Joshua for aid.Sources: Gibeon · the Bible text itself
  • The passage cites the Book of Jashar, an ancient Hebrew collection of songs and heroic deeds. Outside this battle account, the only other surviving quotation attributed to this lost collection in the biblical text is David's lament for Saul and Jonathan in 2 Samuel.Sources: Jasher · the Bible text itself
  • During the retreat, the five allied kings hid in a cave at Makkedah. Joshua had large stones rolled across the entrance to seal them inside while the army pursued the fleeing forces, before later executing the kings and taking the city.Sources: Makkedah · Debir · the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Gibeon · Today: El Jib · 31.847, 35.183 · verses 1, 2, 4, 5, 6, 7, 10, 12, 41
  • Jericho · Today: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · verses 1, 28, 30
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 1, 2, 3, 5, 23
  • Hebron · Today: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · verses 3, 5, 23, 36, 37, 39
  • Jarmuth · Today: Tel Yarmuth · 31.708, 34.975 · verses 3, 5, 23
  • Lachish · Today: Tell ed Duweir · 31.565, 34.849 · verses 3, 5, 23, 31, 32, 33, 34, 35
  • Beth-horon · Today: Beit Ur al Tahta · 31.895, 35.084 · verses 10, 11
  • Valley of Aijalon · Today: Ayalon Valley · 31.867, 34.959 · verse 12
  • Gezer · Today: Tel Gezer · 31.859, 34.919 · verse 33
  • Negeb · 31.245, 34.841 · verse 40
  • Shephelah · 31.692, 34.875 · verse 40
  • Gaza · Today: Tell Harube · 31.504, 34.464 · verse 41

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.