Nations Bible

Ezra 4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ndị iro

1Mgbe ndị iro Juda na Benjamin nụrụ na ndị ahụ a dọtara nʼagha alọtala, nụkwa na ha na-ewugharị ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, Chineke Izrel, 2ha bịakwutere Zerubabel na ndịisi ezinaụlọ sị ha, “Kwerenụ ka anyị nyere unu aka nʼọrụ iwu ụlọ a, nʼihi na anyị hụrụ Chineke unu nʼanya dịka unu onwe unu si hụ ya nʼanya. Lee na kemgbe Isahadon eze Asịrịa butere anyị nʼebe a, anyị alabeghị azụ ịchụrụ ya aja.”

3Ma Zerubabel, na Jeshua na ndịisi ọzọ zara sị ha, “Unu enweghị oke ọbụla nʼọrụ iwuru Chineke anyị ụlọnsọ. Naanị ndị anyị ga-ewuru Onyenwe anyị, Chineke Izrel ụlọ ukwu a dịka Sairọs eze Peshịa nyere nʼiwu.”

4Ya mere ndị niile nọ ha gburugburu malitere ime ihe ga-ewetara ndị Juda ịda mba nʼobi, na ihe ga-eme ka ụjọ tụọ ha ịga nʼihu nʼọrụ iwu ụlọ ahụ. 5Ha ji ngarị gota ụfọdụ ndịisi ka ha megide ha, mebikwaa atụmatụ ha niile nʼoge niile Sairọs bụ eze Peshịa, ruokwa nʼoge Daraiọs ghọrọ eze ọhụrụ Peshịa.

Mmegide nʼoge ọchịchị eze Ahasuerọs na Ataksekses

6Na mmalite ọchịchị Sekses, ha deere ya akwụkwọ ebubo megide ndị Juda na Jerusalem.

7Nʼụbọchị niile ahụ Ataksekses bụ eze ndị Peshịa, ka Bishlam, na Mitredat, na Tabeel, na ndị otu ya fọdụrụ degaara Ataksekses akwụkwọ. E dere akwụkwọ ozi ahụ nʼodide akwụkwọ ndị Aramaik, a sụgharịkwara ya nʼasụsụ Aramaik.

8Ndị ọzọ soro ha gbaa ajọ izu a bụ Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ. Ha deere Ataksekses akwụkwọ megide ndị Jerusalem sị ya:

9“Akwụkwọ ozi a si nʼaka Rehum, onyeisi agha na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu anyị ndị ọzọ, na ndị ikpe, na ndịisi obodo na-elekọta ndị ahụ niile si Tripolis, na Peshịa, na Erek, na Babilọn, na Susa nke dị nʼElam, 10na ọtụtụ ndị ọzọ ahụ onye ukwu ahụ na onye a na-asọpụrụ bụ Ashobanipal si nʼala ha bupụ bute na Sameria, na obodo ndị ọzọ dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis.”

11Nke a bụ ihe ha dere nʼakwụkwọ ha zigaara

Eze Ataksekses.

Ọ bụ gị, eze ukwu Ataksekses, ka ndị ohu gị bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis na-edetara akwụkwọ a.

12Nke a bụ ime ka ị mata na ndị Juu si Babilọn lọta Jerusalem ọhụrụ a ebidola iwughachi obodo ọjọọ nke nnupu isi ahụ. Ha ewuolarị mgbidi ya, tọkwaa ntọala ya.

13Anyị chọrọ ka o doo gị anya na ọ bụrụ na ha ewuchaa ya, ọ ga-abụ nsogbu nye alaeze gị, nʼihi na ndị Juu agaghị ekwekwa ịtụrụ gị ụtụ isi ha. 14Ebe anyị na-asọpụrụ gị dịka nna anyị ukwu, anyị achọghị ka ihe ọjọọ mee nʼalaeze gị, ya mere anyị ji kpebie idere gị akwụkwọ a. 15Anyị chọrọ ka i leba anya nʼakwụkwọ akụkọ nke mgbe ochie, ka ị chọpụta na ọ dịghị mgbe Jerusalem na-ejighị bụrụ obodo nnupu isi. Nʼezie, ọ bụ nʼihi nnupu isi a na nkwulu nke ha na-ekwulu ndị eze dị iche iche, ka e ji bibie ya na mbụ. 16Anyị chọrọ ka ị mata na ọ bụrụ na e wuchaa mgbidi obodo a, ọ ga-esi ike ka akụkụ alaeze gị a, nke dị ruo nʼosimiri Yufretis, bụrụkwa nke gị ọzọ.

17Eze ahụ si otu a saa akwụkwọ ahụ,

Ọ sịrị ha, Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu ha bi na Sameria ruo nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis.

Ndeewonụ.

18Akwụkwọ ozi ahụ unu zitere anyị, agụọla ma tapịakwaa ya nʼihu m. 19Enyere m iwu ka e nyochaa chọpụta, e mere nyochaa, a chọpụtakwara ya nʼakwụkwọ na obodo a siterị nʼoge gara aga bụ obodo na-ebuli onwe ya megide ọtụtụ ndị eze, bụrụkwa ebe na-akpali nnupu isi na okwu na-eweta ọgbaaghara. 20Jerusalem e nweela ụfọdụ ndị eze nke chịrị nʼIzrel, ndị dị ike a maara aha ha, ndị alaeze ha gbasara rute nʼosimiri Yufretis, ndị a na-atụkwara ụtụ dị iche iche. 21Ugbu a, nye iwu ka ndị ikom ndị ahụ kwụsị ọrụ, ka a ghara iwuzi obodo a tutu ruo mgbe m ga-enye iwu. 22Lezienụ anya ka unu ghara i lepụrụ okwu a anya. Gịnị ga-eme ka a hapụ ihe iyi egwu a ka ọ gaa nʼihu, ime ka ihe jọrọ alaeze a njọ karịa?

23Ngwangwa a gụrụ akwụkwọ ozi si nʼaka eze Ataksekses, nye Rehum na Shimshai bụ ode akwụkwọ, na ndị otu ha, ha mere ọsịịsọ gakwuru ndị Juu na Jerusalem jiri ike kwagide ha ka ha kwụsị ịrụ ọrụ ahụ.

24Ya mere, ha kwụsịrị ịrụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke na Jerusalem tutu ruo nʼafọ abụọ nke ọchịchị Daraiọs eze Peshịa.

Did you know?

Opposition to the Rebuilding in Jerusalem

  • When the returned exiles began rebuilding the temple, neighboring peoples offered to join, stating they had sacrificed to God since King Esar-haddon of Assyria resettled them in the region. When Zerubbabel and the Jewish leaders refused the offer, these neighbors actively opposed the project and intimidated the builders.Sources: the Bible text itself · Zerubbabel · Esar-haddon
  • Opposition leaders, including Rehum the commander and Shimshai the scribe, sent an Aramaic letter to King Artaxerxes warning that rebuilding Jerusalem would lead to lost tax revenue and rebellion. Artaxerxes searched royal records, confirmed past revolts, and ordered the work stopped by force until the reign of King Darius of Persia.Sources: the Bible text itself · Rehum · Shimshai · Artaxerxes

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Assyria · 36.359, 43.153 · verse 2
  • Persia · 34.806, 48.516 · verses 3, 5, 7, 9, 24
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 6, 8, 12, 19, 20, 23, 24
  • Babylon · 32.543, 44.422 · verses 9, 12
  • Elam · 32.189, 48.258 · verse 9
  • Erech · Today: Uruk · 31.322, 45.636 · verse 9
  • Susa · Today: Shush · 32.189, 48.258 · verse 9
  • Beyond the River · 31.777, 35.234 · verses 10, 11, 16, 17, 20
  • Samaria · 32.276, 35.195 · verses 10, 17

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.