Nations Bible

Ezra 3

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Mwugharị ebe ịchụ aja

1Mgbe o ruru ọnwa asaa nʼafọ, ndị Izrel nọkwa nʼobodo ha niile, ndị mmadụ zukọtara nʼotu na Jerusalem. 2Mgbe ahụ, Jeshua, nwa Jozadak na ndị nchụaja ndị ọzọ, na Zerubabel nwa Shealtiel na ndị na-enyere ya aka malitere iwugharị ebe ịchụ aja Chineke Izrel maka ịchụ aja nsure ọkụ nʼelu ya dịka Mosis onye nke Chineke si nye nʼiwu. 3Nʼagbanyeghị oke egwu maka ndị niile gbara ha gburugburu, ha gara nʼihu wughachikwa ebe ịchụ aja ahụ na ntọala ya chụọkwa aja nʼelu ya nye Onyenwe anyị, bụ aja nsure ọkụ nke ụtụtụ na nke uhuruchi. 4Ha mekwara mmemme ụlọ Ikwu dịka e dere ya nʼiwu Mosis, chụọkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nʼụbọchị niile nke mmemme ahụ. 5Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha chụrụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ mgbe niile, na nke aja maka ọnwa ọhụrụ, na aja ndị ọzọ maka mmemme ndị ọzọ dị nsọ a kara aka nke Onyenwe anyị. Ha chụkwara aja onyinye nke ha ji nye Onyenwe anyị onyinye afọ ofufu. 6Ndị nchụaja bidoro ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼabalị mbụ nke ọnwa nke asaa. Ọ bụ ezie na a tọbeghị ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

Mwugharị ụlọnsọ ukwu

7Ha nyere ndị ọrụ na-edo nkume na ndị ọkpọ ǹtu ego, nyekwa ndị Saịdọn na ndị Taịa ihe oriri, na ihe ọṅụṅụ na mmanụ oliv, ka ha nwee ike isite nʼosimiri Lebanọn budata osisi sida ndị ahụ rute Jopa, dịka ikike Sairọs bụ eze Peshịa si kwadoo ya.

8Nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ site mgbe ha bịarutere nʼụlọ Chineke na Jerusalem. Mmadụ niile ahụ lọtara Juda so rụọ ọrụ. Zerubabel nwa Shealtiel, Jeshua nwa Jozadak na ndị fọdụrụ na ụmụnne ha, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị niile si na ndọta nʼagha lọta Jerusalem, malitere ịrụ ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livayị niile gbara iri afọ abụọ rigoo ka ha lekọta ihe banyere ọrụ ụlọ Onyenwe anyị. 9Jeshua na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụnne ya, Kadmiel na ụmụ ya, ndị si nʼikwu Hodavaya, ha na ụmụ Henadad na ụmụ ha, na ụmụnna ha, ha niile bụ ndị Livayị, jikọtara aka na-elekọta ndị na-arụ ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ.

10Mgbe ndị na-ewu ụlọ tọrọ ntọala ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ, ndị nchụaja ahụ niile yii uwe ha jide opi nʼaka. Otu a kwa ndị Livayị, ụmụ ndị ikom Asaf jikwa ogene ha na-eto Onyenwe anyị dịka usoro iwu Devid, eze Izrel nyere ha si dị. 11Ha ji abụ otuto na ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ sị:

“Ọ dị mma,

ịhụnanya ya nʼebe Izrel nọ na-adị ruo ebighị ebi.”

Mmadụ niile jiri oke olu too Onyenwe anyị nʼihi ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ ha tọrọ. 12Ma ụfọdụ ndị merela agadi nʼetiti ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị ndu nke ikwu dị iche iche, bụ ndị chetara ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru, kwara akwa hie nne, mgbe ndị ọzọ nọ na-eti mkpu ọṅụ. 13Ya mere, e sitere nʼebe dị nnọọ anya nụ ụzụ ọṅụ na ụda akwa ndị mmadụ ahụ. Ma o nweghị onye nwere ike ịkọwata nke bụ mkpu akwa maọbụ mkpu ọṅụ, nʼihi na ụzụ ahụ dị ukwuu.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Rebuilding the Altar and Temple Foundation

  • The returned exiles restored sacrificial worship on the temple mount before beginning major construction. Under Zerubbabel and the priest Jeshua, they rebuilt the altar on its original site to resume daily offerings and celebrate the Feast of Tabernacles before laying the temple foundation.Sources: the Bible text itself · Zerubbabel · Joshua
  • To secure timber for the rebuilding effort, the community paid masons and carpenters, and sent food, drink, and oil to Tyre and Sidon to transport cedar logs from Lebanon by sea to the port of Joppa, as permitted by Cyrus, king of Persia.Sources: the Bible text itself · Lebanon · Joppa · Cyrus
  • Laying the foundation of the house of the Lord triggered intense, mixed reactions. While many shouted joyfully to the accompaniment of trumpets and cymbals, older priests, Levites, and family heads who remembered the first temple wept aloud.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 1, 8
  • Great Sea · Today: Mediterranean Sea · 31.805, 34.170 · verse 7
  • Joppa · Today: Jaffa · 32.054, 34.753 · verse 7
  • Lebanon · 33.540, 35.584 · verse 7
  • Persia · 34.806, 48.516 · verse 7
  • Sidon · Today: Sandikli archaeological site in Sidon · 33.561, 35.372 · verse 7
  • Tyre · 33.271, 35.196 · verse 7

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.