Nations Bible

Ezekiel 26

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Amụma megide Taịa

1Nʼụbọchị nke mbụ nʼọnwa, nʼafọ nke iri na otu, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị sị, 2“Nwa nke mmadụ, Taịa aṅụrịala ọṅụ nʼihi ọdịda Jerusalem. Ọ na-ekwukwa na-asị, ‘Ahaa, agbajiela obodo ahụ bụ ọnụ ụzọ e si eje mba dị iche iche. Ọnụ ụzọ ama ya niile egherekwala oghe nye m. Ugbu a, e mebirila ya, ihe ga-agara m nke ọma karịa.’ 3Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Lee, ana m eguzo imegide gị Taịa. Aga m emekwa ka ọtụtụ mba bilie bịakwasị gị dịka ebili mmiri nke oke osimiri. 4Ha ga-etida mgbidi Taịa niile, kwadakwa ụlọ elu ya niile. Aga m akọchapụ aja mgbidi ya dakpọrọ adakpọ mee ka ala ahụ ghọọ ala nkume nkume. 5Ọ ga-aghọkwa ebe ndị ọkụ azụ na-agbasa ụgbụ ha nʼetiti oke osimiri. Nʼihi na mụ onwe m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Ọ ga-aghọkwara mba niile dị iche iche ihe a kwatara nʼagha. 6Ma a ga-eji mma agha laa ụmụada ya bi nʼelu ala nʼiyi. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

7“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esite na mgbago ugwu kpọta Nebukadneza eze Babilọn, onye bụ eze ndị eze, ọ ga-achị ọtụtụ ndị agha na ụgbọala, na ndị na-agba ịnyịnya bilie imegide Taịa. 8Ọ ga-ebu ụzọ jiri mma agha bibie ndị gị bi nʼelu ala. Ọ ga-agbakwa obodo gị gburugburu, wulie mgbidi agha ya elu, imegide mgbidi obodo gị. Ọ ga-ewelikwa ọta agha ya elu. 9Ọ ga-echezikwa ihe agha e ji akwatu mgbidi nʼebe mgbidi gị dị, jiri ngwa agha ya kwada ụlọ elu gị niile. 10Ịnyịnya ya ga-adị ọtụtụ nke ga-eme ka ha jiri uzuzu kpuchie gị. Mgbidi gị ga-ama jijiji nʼihi oke ụzụ nke ịnyịnya agha ndị a, na ụgbọ agha, na wagọn ịnyịnya na-adọkpụ ga-eme, mgbe ha na-abata nʼọnụ ụzọ ama gị, dị ka mgbe ọtụtụ mmadụ na-abanye nʼime obodo e tidara mgbidi ya. 11Ọ ga-eji ụkwụ ịnyịnya ya niile zọtọọ okporoụzọ gị niile, jirikwa mma agha gbuchapụ ndị gị niile. Ogidi niile nke ike gị ga-adaru ala. 12Ha ga-akwara akụ gị niile, na ihe ahịa gị niile dịka ihe ha dọtara nʼagha. Ha ga-akwatu mgbidi gị niile, na ụlọ ọma gị niile, kpokọtaa osisi gị niile, na nkume niile, na ngwongwo niile nʼabaghị uru wụnye ha nʼime osimiri. 13Aga m emekwa ka ụzụ nke abụ gị niile kwụsị. A gaghị anụkwa ụda ụbọ akwara gị ọzọ. 14Aga m emekwa ka ala gị ghọọ ala nkume nkume, nke ihe na-adịghị nʼime ya. Ị ga-abụkwa ebe ndị ọkụ azụ ga na-agbasa ụgbụ ha. Ọ dịghị onye ga-ewuzi gị ọzọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

15“Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Taịa, Ọ bụ na agaghị anụ mkpọtụ ọdịda gị na mba ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri, mgbe ndị e merụrụ ahụ ga na-asụ ude nʼoge a na-egbu ndị bi nʼime gị? 16Mgbe ahụ, ndị ndu nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri ga-esi nʼocheeze ha rịdata. Ha ga-eyipụ uwe mwụda ha, yipụsịakwa uwe ha niile a kpara nke ọma. Ha ga-anọdụ ọdụ nʼala na-ama jijiji site nʼoke egwu nʼihi ihe ha hụrụ dakwasịrị gị. 17Ha ga-ebulikwa abụ akwa banyere gị, sị gị,

“ ‘Lee ka i si laa nʼiyi, gị obodo a maara aha ya,

nke ndị na-ejegharị nʼosimiri bi nʼime ya.

Na mbụ, ị bụ obodo nke ịdị ike ya pụtara ihe nʼosimiri niile,

gị na ndị bi nʼime gị.

Ị na-emenyekwa

ndị bi nʼime ya egwu.

18Ugbu a, lee na ala niile dị nʼọnụ mmiri nke osimiri

na-ama jijiji nʼihi ọdịda gị.

Ọ bụladị agwa etiti niile ka ụjọ juru obi

nʼihi nkwatu a kwatụrụ gị.’

19“Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe m mere ka ị ghọọ obodo tọgbọrọ nʼefu, dịka obodo niile nke mmadụ na-ebighị, mgbe m mekwara ka ogbu mmiri nke oke osimiri bịakwasị gị, mgbe ọtụtụ mmiri ya kpuchiri gị, 20mgbe ahụ ka m ga-eme ka ị rịdaruo nʼala mmụọ, gị na ndị na-arịda nʼolulu, ka i jekwuru ndị mgbe ochie. Aga m eme ka ebe obibi gị bụrụ nʼokpuru ime ime ala, ka ị dịrị ka obodo ndị ochie ahụ e tikpọrọ etikpọ. Gị na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ị gaghị esitekwa nʼebe ahụ lọghachi ịbịa isoro ndị dị ndụ birikwa. 21Aga m eme ka ọgwụgwụ gị bụrụ ihe a ga-atụ egwu. Ị gaghị adịkwa. A ga-achọ gị, ma agaghị achọta gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Prophecy against Tyre

  • Tyre was a renowned Phoenician port city whose seafaring merchants dominated Mediterranean commerce. In this chapter, Tyre rejoices at the downfall of Jerusalem, anticipating that the collapse of the inland city would redirect wealth and lucrative trade routes to its own harbors.Sources: Tyre · the Bible text itself
  • The name Tyre means "a rock." Ezekiel emphasizes this identity by prophesying that the prosperous maritime city would be scraped bare of its soil like a rock, becoming nothing more than a deserted flat where fishermen spread out their nets to dry.Sources: Tyre · the Bible text itself
  • Nebuchadnezzar II, the powerful king of Babylon, is identified by name as the instrument of judgment brought against Tyre. Ezekiel describes his army advancing with cavalry, chariots, siege ramps, and battering rams against the coastal settlements and city fortifications.Sources: Nebuchadnezzar · the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verse 2
  • Tyre · 33.271, 35.196 · verses 2, 3, 4, 5, 7, 15, 19
  • Babylon · 32.543, 44.422 · verse 7

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.