Ezekiel 25
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Amụma megide Amọn
1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼala ụmụ Amọn buo amụma megide ha. 3Gwa ndị Amọn, ‘Nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na ị sịrị “Aha!” megide ebe nsọ m mgbe e merụrụ ya na megide ala Izrel, mgbe e mere ka ọ tọgbọrọ nʼefu, na mgbe a dọtara ndị Juda nʼagha duru ha gaa mba ọzọ dịka ohu, 4nʼihi ya, aga m ewere gị nyefee nʼaka ndị si nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ị bụrụ ihe nketa ha. Ha ga-ewu ebe obibi nʼetiti gị, rie mkpụrụ ubi gị, ṅụọkwa mmiri ara ehi gị. 5Aga m eme ka obodo Raba ghọọ ebe ịta nri nye ịnyịnya kamel, meekwa ka ala Amọn ghọọ ebe igwe ewu na atụrụ na-amakpu. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 6Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Nʼihi na ị kụrụ aka gị, zọọ ụkwụ gị nʼala gidim, ma sitekwa nʼịkpọ asị nke obi gị ṅụrịa ọṅụ megide ala Izrel, 7nʼihi ya, lee, aga m esetipụ aka m megide gị, were gị nyefee nʼaka ọtụtụ mba, ndị ga-alụta gị nʼagha. Aga m eme ka ị gwụsịa, mee ka ị hapụ ịdịkwa ọzọ. Aga m ala gị nʼiyi. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
Amụma megide Moab
8“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Moab na Sia sịrị, “Lee, Juda adịrịla ka mba ndị ọzọ niile,” 9nʼihi nke a, aga m emeghe akụkụ Moab, site nʼobodo nke nsọtụ oke ala ya niile, bụ Bet-Jeshimọt, Baal-Meon na Kiriatem, nke bụ ebube nke ala ahụ. 10Aga m ewere Moab na Amọn nyefee ha nʼaka ndị ga-esi nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ọ bụrụ nke ha. Nʼụzọ dị otu a, a gaghị agụkwa maọbụ cheta Amọn nʼetiti mba niile. 11Aga m ata Moab ahụhụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
Amụma megide Edọm
12“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Edọm bọọrọ onwe ha ọbọ megide ụlọ Juda sitekwa nʼịbọ ọbọ ha bụrụ ndị ikpe mara, 13nʼihi nke a, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esetipụ aka m megide Edọm, gbuo ndị bi nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ. Aga m eme ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ndị niile bi nʼala ahụ site na Teman ruo na Dedan ka a ga-eji mma agha gbuo. 14Ọ bụ site nʼaka ndị nke m Izrel ka m ga-esi bọọ ọbọ megide Edọm, ha ga-emeso ndị Edọm dịka ịba ụba nke iwe m na ọnụma m si dị, ha ga-amata ihe ịbọ ọbọ bụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
Amụma megide Filistia
15“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: ‘Nʼihi na ndị Filistia esitela na mmụọ nke ịbọ ọbọ, na mmụọ ịkpọ asị nke dị ha nʼobi bọọrọ onwe ha ọbọ, chọọ ịla ha nʼiyi. 16Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ana m aga isetipụ aka m megide ndị Filistia. Aga m ebipụ ndị Keret, bibie ndị ahụ niile bi nʼọnụ mmiri osimiri. 17Aga m esite nʼoke ọnụma bọọ ha ọbọ site na ịta ha ahụhụ. Mgbe ahụ ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m ga-abọgwata ha ọbọ.’ ”

Did you know?
Judgments on Surrounding Nations
- Ammon lay east of the Jordan River with Rabbah as its chief city. Ezekiel prophesied that because Ammon gloated over the fall of Jerusalem and the profanation of the sanctuary, its territory and capital would be handed over to nomadic tribes from the East as pastures for camels and sheep.Sources: the Bible text itself · Ammon · Rabbah · East
- The neighboring regions of Moab and Mount Seir—the rugged hill country inhabited by the descendants of Esau—were rebuked for claiming Judah was just like all the other nations. Ezekiel warned that their frontier cities would be left exposed and given as a possession to peoples from the East.Sources: the Bible text itself · Moab · Seir · Esau (Edom)
- The chapter concludes with divine judgments against Edom and the Philistines, condemning both peoples for acting out of ancient hostility and taking malicious vengeance against Judah during its time of calamity.Sources: the Bible text itself · Edom
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Ammon · 31.955, 35.934 · verses 2, 3, 5, 10
- East · Today: region around Amman · 31.955, 35.934 · verses 4, 10
- Rabbah · Today: Amman · 31.955, 35.934 · verse 5
- Moab · Today: Moab 1 · 31.181, 35.701 · verses 8, 9, 10, 11
- Edom · 30.746, 35.604 · verses 12, 13, 14
- Philistia · 31.664, 34.546 · verse 15
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org