2 Samuel 4
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Ọnwụ Ishboshet
1Mgbe Ishboshet nwa Sọl nụrụ na Abna anwụọla na Hebrọn. Ọ tụrụ egwu. Ndị Izrel tụkwara egwu hie nne. 2Nʼoge a, nwa Sọl nwere mmadụ abụọ ndị bụ ndịisi ndị na-aga apụnara ndị mmadụ ihe. Aha otu onye bụ Baana, aha onye nke ọzọ bụ Rekab. Ha abụọ bụ ụmụ Rimọn onye Beerọt, nke dị nʼebo Benjamin. A na-agụ ndị Beerọt dịka ndị Benjamin, 3nʼihi na ndị Beerọt gbara ọsọ agha gbalaa Gitaim, obodo ndị Benjamin. Ha bikwa nʼebe ahụ ruo taa dịka ndị ọbịa.
4(Jonatan nwa Sọl nwere otu nwa nwoke dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ. Ọ gbara afọ ise mgbe akụkọ banyere Sọl na Jonatan si Jezril bịarute ha. Nwanyị na-eku ya kuuru ya bido ịgbapụ ọsọ, ma dịka ọ na-agba ọsọ, nwantakịrị nwoke ahụ dara nʼala ghọọ onye ngwụrọ. Aha ya bụ Mefiboshet.)
5Nʼoge a, Rekab na Baana ụmụ Rimọn, onye Beerọt bịaruru nʼụlọ Ishboshet nʼoge ehihie, mgbe ọ nọ na-ezu ike. 6Ha banyere nʼime ime ụlọ, dịka a ga-asị na ha na-aga iburu ọka wiiti. Mgbe ha banyere nʼebe ahụ, ha mara Ishboshet mma nʼafọ. Emesịa, Rekab na nwanne ya Baana si nʼụlọ ahụ zopu onwe ha.
7Ha abatala nʼụlọ mgbe Ishboshet dinara nʼelu ihe ndina ya, nʼime ụlọ ndina ya. Mgbe ha machara ya mma, gbuo ya, ha bipụrụ ya isi. Buru isi ya gbalaga. Jee ije abalị ahụ niile gafee ọzara. 8Ha buuru isi Ishboshet butere Devid na Hebrọn, sị eze, “Taa ka Onyenwe anyị bọọrọ onyenwe m eze ọbọ megide Sọl na mkpụrụ ya. Nke a bụ isi Ishboshet, nwa onye iro gị Sọl, onye chọsịrị ike iwepụ ndụ gị.”
9Ma Devid zara Rekab na Baana ụmụ Rimọn onye Beerọt okwu sị ha, “Dịka Onyenwe anyị si adị ndụ, onye napụtara m site na nsogbu m niile, 10mgbe otu onye bịakwutere m gwa m na Sọl anwụọla, na-eche nʼobi ya na o wetaara m oziọma. Egburu m ya na Ziklag, si otu ahụ kwụọ ya ụgwọ oziọma ahụ o chere na ọ wetaara m. 11Ọ bụladị karịa nke a, mgbe ndị ikom ajọ omume gburu nwoke onye aka ya dị ọcha nʼụlọ ya, nʼelu ihe ndina ya? M ga-ahapụ ịbọtara onye e gburu egbu ọbọ, si otu a kpochapụ unu nʼụwa!”
12Devid nyere ụmụ okorobịa ya iwu ka ha gbuo mmadụ abụọ ahụ. Ha gbukwara ha. Emesịa, ha bipụrụ aka ha na ụkwụ ha. Were ozu ha kwụba ya nʼakụkụ ọdọ mmiri Hebrọn. Ha wekwaara isi Ishboshet, lie ya nʼili Abna na Hebrọn.

Did you know?
The Assassination of Ish-bosheth
- The assassins Baanah and Rechab were from Beeroth, an ancient Gibeonite town assigned to the territory of Benjamin. The biblical text notes that the Beerothites had previously fled to Gittaim, where they resided as foreigners.Sources: the Bible text itself · Beeroth · Gittaim · Rimmon
- The chapter introduces Mephibosheth, the surviving son of Jonathan and grandson of Saul. When news of the royal family's defeat arrived from Jezreel, the five-year-old child was dropped by his fleeing nurse, leaving him permanently lame in both feet.Sources: the Bible text itself · Mephibosheth
- When Rechab and Baanah brought Ish-bosheth's severed head to Hebron expecting praise, David recalled his earlier execution of the Amalekite messenger at Ziklag. David condemned the murder of an innocent man in his own bed, ordering the conspirators executed and burying Ish-bosheth's head in Abner's tomb.Sources: the Bible text itself · Baanah · Ziklag · Abner
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org