Nations Bible

2 Samuel 3

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

1Agha dị nʼetiti ndị ụlọ Sọl na ụlọ Devid dịịrị ruo oge toro ogologo. Ma ka Devid na-aga nʼihu na-esiwanye ike, ụlọ Sọl na-aga azụ na-ada ada.

Ụmụ Devid

2A mụtaara ọtụtụ ụmụ ndị ikom nye Devid mgbe ọ nọ na Hebrọn.

Ọkpara ya bụ Amnọn nke, Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ.

3Nke abụọ bụ Kiliab, nke Abigel, nwunye ochie Nebal, onye Kamel mụrụ.

Nke atọ bụ Absalọm, nke Maaka nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua mụrụ.

4Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit.

Nke ise bụ Shefataya nwa Abital;

5nke isii bụ Itream, nwa nwoke Egla nwunye Devid.

Abna adịnyere Devid

6O ruo, mgbe agha na-aga nʼihu nʼetiti ụlọ Sọl na ụlọ Devid, na Abna nọ na-eme ka ọnọdụ ya sie ike nʼụlọ Sọl. 7Ma Sọl nwererịị otu iko nwanyị aha ya bụ Rizpa, nwa Aịa. Ishboshet jụrụ Abna ajụjụ sị, “Gịnị mere gị na iko nwanyị nna m ji dinaa?”

8Iwe were Abna nke ukwuu nʼihi ihe Ishboshet kwuru. Ya mere, ọ zara, “Ọ bụ isi nkịta nke ụlọ Juda ka m bụ? Taa ka m ji obi m niile na-ejere ụlọ nna gị, bụ Sọl, na ezinaụlọ ya, na ndị enyi ya ozi. Ewerebeghị m gị nyefee nʼaka Devid. Ma lee, ugbu a i na-ebo m ebubo ajọ omume nʼihe metụtara nwanyị a. 9Ka Chineke mesoo Abna mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m emereghị Devid ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye ya. 10Ịnapụ ụlọ Sọl alaeze ahụ, na ime ka ocheeze Devid guzosie ike nʼebe Izrel niile na Juda niile nọ, site na Dan ruo Bịasheba.” 11Ishboshet ekwughị ihe ọbụla nʼihi na ọ na-atụ Abna egwu.

12Ngwangwa, Abna zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Devid sị ya, “Onye nwee ala a? Ka mụ na gị gbaa ndụ. Aga m enyere gị aka kpọghachite ndị Izrel ka ha dịnyeere gị.”

13Devid sịrị, “Ọ dị mma. Mụ na unu ga-agba ndụ. Ma ọ dị otu ihe m chọrọ nʼaka unu. Unu agaghị ahụ ihu m anya ma ọ bụrụ na unu eduteghị Mikal, nwa Sọl, mgbe unu ga-abịa ịhụ m.” 14Devid ziri Ishboshet nwa Sọl ozi sị ya, “Dulatara m nwunye m Mikal, nʼihi na ọ bụ narị apị ndị Filistia ka m ji lụtara ya onwe m.”

15Na-atụfughị oge, Ishboshet nyere iwu ka e site nʼaka di ya bụ Paltiel, nwa Laish, kpọpụta ya. 16Mgbe ha du ya na-aga, Paltiel sogidere ya nʼazụ na-akwa akwa tutu ha eruo Bahurim. Nʼebe ahụ ka Abna nọ sị ya, “Laghachi ugbu a.” Ọ tụgharịrị laa.

17Abna na ndị okenye Izrel kparịtara ụka. Ọ chetaara ha sị ha, “Ọ dịla anya kemgbe unu na-achọ ka Devid bụrụ eze unu. 18Ugbu a meenụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị kweere Devid nkwa, ‘Site nʼaka ohu m bụ Devid ka m ga-esi zọpụta ndị m bụ Izrel site nʼaka ndị Filistia, nakwa site nʼaka ndị iro ha niile.’ ”

19Abna gwakwara ndị Benjamin okwu. Emesịa, o jere Hebrọn ịgwa Devid ihe niile ndị Izrel na ndị Benjamin zubere ime. 20Abna, ya na iri ndị ikom abụọ so gakwuru Devid na Hebrọn. Mgbe ha ruru, Devid meere ha oke oriri. 21Mgbe ahụ, Abna sịrị Devid, “Ka m gaa ngwangwa ga kpọkọtaa ndị Izrel niile, nye onyenwe m bụ eze, ka gị na ha gbaa ndụ, ka ị bụrụ eze ndị niile mkpụrụobi gị na-achọsi ike.” Ya mere Devid zilara Abna. Ọ laa nʼudo.

Joab egbuo Abna

22Nʼotu mgbe ahụ, ndị ikom Devid na Joab si nʼebe ha gara ịpụnara ndị mmadụ ihe lọta, bukọrọ ọtụtụ ihe nkwata. Ma Abna anọghịkwa na Hebrọn ya na Devid, nʼihi na Devid ezipụla ya, ọ pụọla nʼudo. 23Mgbe Joab na ndị agha ya lọtara, a kọọrọ ya na Abna, nwa Nea, bịara hụ eze, na ọ laakwala nʼudo.

24Ya mere Joab jekwuuru eze sị ya, “Gịnị ka i mere? Lee, Abna bịakwutere gị. Gịnị mere i ji hapụ ya ka ọ laa? Lee ya ugbu a, ọ laala! 25Ị maara onye Abna nwa Nea bụ? Ọ bịara ịghọ gị aghụghọ, na inyocha njegharị gị, ịchọpụta ihe niile ị na-eme.”

26Mgbe Joab si nʼihu Devid pụta, o zipụrụ ndị ozi ka ha sochie Abna azụ, gwa ya ka ọ laghachi. Ha hụrụ ya nʼolulu mmiri Sira. O sokwara ha laghachi, ma Devid amaghị ihe banyere nke a. 27Mgbe Abna lọghachiri na Hebrọn, Joab duuru ya gaa nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dịka ọ chọrọ ka ha kparịtaa ụka. Ngwangwa, ọ mịpụtara nwa mma ya, jiri ya magbuo Abna, nʼihi ịbọ ọbọ ọbara nwanne ya, bụ Asahel.

28Mgbe emesịrị, Devid nụrụ banyere ya, ọ sịrị, “Aka m dị ọcha, ya na nke alaeze m nʼihu Onyenwe anyị banyere ọbara Abna, nwa Nea. 29Ka ikpe ọmụma a dakwasị Joab nʼisi, nakwa ezinaụlọ nna ya niile, ka a gharakwa ịhụ nʼụlọ Joab onye na-adịghị arịa ọrịa ahụ ihe ntokasị, maọbụ ọrịa ekpenta, maọbụ onye ji mkpara eji akpa akwa, maọbụ onye ga-anwụ site na mma agha, maọbụ onye ụkọ nri adịghị akọ.”

30Ya mere, Joab na Abishai nwanne ya gburu Abna, nʼihi na Abna gburu nwanne ha Asahel nʼagha Gibiọn.

31Emesịa, Devid kpọrọ Joab na ndị niile so ya sị ha, “Dọwaanụ uwe unu, yikwasị onwe unu akwa mkpe, jegharịakwanụ nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi Abna.” Eze, bụ Devid nʼonwe ya so ndị bu ozu Abna nʼazụ. 32Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna.

33Eze bụrụ abụ akwa nʼihi Abna, sị,

“O kwesiri ka Abna nwụọ dịka onye nzuzu?

34E kekwaghị aka gị abụọ ihe.

E kekwaghị ụkwụ gị abụọ agbụ.

Ị nwụrụ dịka onye ndị ajọ omume gburu.”

Mmadụ niile bekwara akwa ọzọ nʼihi ya.

35Mgbe ahụ, ndị mmadụ bịakwutere Devid rịọọ ka o ritụ ihe, mgbe ìhè ụbọchị ka dị, ma Devid ṅụrụ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m edetụ achịcha maọbụ ihe ọbụla ọzọ ọnụ tutu ruo mgbe anyanwụ dara.”

36Ndị mmadụ nụrụ ihe o kwuru, okwu ahụ tọkwara ha ụtọ. Nʼezie, ihe niile eze mere tọrọ ha ụtọ. 37Nʼụbọchị ndị mmadụ niile nọ ebe ahụ ka Izrel niile matara na eze amaghị ihe banyere ọnwụ Abna, nwa Nea.

38Devid jụrụ ndị ikom ya ajụjụ sị, “Unu ghọtakwara na onye a dara nʼIzrel taa bụ nwa eze na onye dị mkpa? 39Ọ bụ ezie na m bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ ịbụ eze, ma o nweghị ihe m pụrụ ime ụmụ ndị ikom Zeruaya ndị a, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ka Onyenwe anyị kwụghachi onye ọjọọ ihe ọjọọ ọ mere.”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Abner's Defection and Death

  • When Abner broke ties with Ish-bosheth, he pledged to unite the entire realm under David from Dan to Beersheba. This geographical phrase was the traditional way to describe the whole Promised Land, spanning approximately 144 miles from its northernmost region to its southern boundary.Sources: the Bible text itself · Beersheba · Dan
  • Before concluding a covenant with Abner, David required the return of Saul's daughter Michal, who had been given in marriage to Paltiel after David fled from Saul. Reclaiming Michal reinforced David's lawful marriage and preserved his political and dynastic link to the house of Saul.Sources: the Bible text itself · Michal
  • Joab murdered Abner in the gateway of Hebron as blood vengeance for his brother Asahel, whom Abner had slain during the battle at Gibeon. To prove to Israel that he had no part in the assassination, King David publicly mourned, composed a funeral lament, and fasted until sunset.Sources: the Bible text itself · Joab · Asahel · Hebron

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Hebron · Today: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · verses 2, 5, 12, 19, 20, 22, 27, 32
  • Geshur · 32.767, 35.700 · verse 3
  • Dan · Today: Tel Dan · 33.249, 35.652 · verse 10
  • Gibeon · Today: El Jib · 31.847, 35.183 · verse 30

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.