2 Samuel 17
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
1Ahitofel gwara Absalọm sị ya, “Kwere ka m họpụta puku ndị ikom iri na abụọ ka m duru ha chụso Devid ọsọ nʼazụ nʼabalị taa. 2Aga m abịakwasị ya mgbe ike gwụrụ ya, mgbe obi ya na-ada mba. Aga m emenye ya egwu nke ga-eme ka ọ maa jijiji. Mgbe ahụ, ndị niile so ya ga-agbasasịkwa. Ọ bụ naanị eze ka m ga-egbu 3Aga m eme ka ndị ya niile lọghachikwute gị. Ọnwụ nke otu nwoke a ị na-achọsi ndụ ya ike ga-eme ndị ọzọ niile ịlọghachikwute gị, onye ọbụla ga-anọ nʼudo.” 4Atụmatụ ahụ ziri ezi nʼanya Absalọm na ndị okenye niile nke Izrel.
5Ma Absalọm kwuru sị, “Kpọọ Hushaị onye Akai ka anyị jụọ ya ihe ọ chere banyere okwu a.” 6Mgbe Hushaị bịakwutere ya, Absalọm sịrị ya, “Ahitofel nyere ndụmọdụ dị otu a. Gịnị ka ị chere? Anyị ga-eme ihe o kwuru? Ọ bụrụ na anyị agaghị eme ya, gị onwe gị kwuo nke gị.”
7Hushaị zara Absalọm sị, “Ndụmọdụ Ahitofel dụrụ nʼoge a adịghị mma. 8Ọ sịrị, Gị onwe gị maara nna gị na ndị ikom ya; ha bụ ndị dike nʼagha, mkpụrụobi ha dịkwa ilu ugbu a dịka anụ ọhịa bịa a gbabara aka nwa nʼọhịa. Nna gị bụ onye ihe banyere agha doro anya. Ọ gaghị eso ndị ya nọọ ọnọdụ abalị. 9Ọ bụladị ugbu a, o zoola onwe ya nʼime otu olulu maọbụ nʼime ọgba nkume. Ọ bụrụ na ọ pụta buru ụzọ buso ndị agha gị agha, onye ọbụla nụrụ ya ga-ekwu sị, ‘Etigbuola ndị agha Absalọm oke ntigbu.’ 10Mgbe ahụ, ọ bụladị dimkpa nʼagha ndị nwere obi ọdụm, ụjọ ga-atụkwa ha. Ha agaghị ekwekwa ịga nʼihu ọgụ. Nʼihi na Izrel niile maara na nna gị bụ dike. Ha maakwara na ndị agha ya bụkwa ndị obi kara aka.
11“Ndụmọdụ m na-enye bụ nke a: chịkọtaa ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, ha dịka aja nke dị nʼakụkụ oke osimiri. Ọ bụkwa gị ga-edu ha nʼagha ahụ. 12Mgbe ahụ, anyị ga-ebuso ya agha ebe ọbụla anyị hụrụ ya; anyị ga-abịakwasị ya dịka igirigi si adakwasị ala. Anyị ga-egbu ya, gbukwaa ndị niile so ya. Otu onye agaghị afọdụkwa nʼime ha. 13Ọ bụrụkwa na o zoo onwe ya nʼotu obodo, mgbe ahụ Izrel niile ga-eweta ụdọ nʼobodo ahụ, anyị ga-adọtu ya dọbanye ya na ndagwurugwu, ruo mgbe ọ bụladị otu nkume ga-afọdụ nʼebe ahụ.”
14Absalọm na ndị ikom Izrel niile sịrị, “Ndụmọdụ Hushaị, onye Akai dị mma karịa nke Ahitofel.” Ma Onyenwe anyị ekpebielarị imebi ezi ndụmọdụ Ahitofel ka o si otu a wetara Absalọm ihe ndakwasị ọjọọ.
15Hushaị gwara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja, “Otu a na ihe ndị a ka Ahitofel dụrụ Absalọm na ndị okenye Izrel nʼọdụ ka ha mee, ma otu a na nke a ka mụ onwe dụkwaranụ nʼọdụ. 16Ugbu a, meenụ ngwa, ziga ozi gwa Devid sị, ‘Anọkwala ọnọdụ abalị nʼụzọ ngabiga nke osimiri nʼime ọzara, kama gabiga na-atụfughị oge, ma ọ bụghị otu a, ma eze ma ndị niile ya na ha soo ga-abụ ndị elodara.’ ”
17Jonatan na Ahimaaz nọ nʼakụkụ En-Rogel ka a ghara ihu ha mgbe ha na-abata nʼobodo. Otu nwaagbọghọ na-eje ozi na-aga zie ha ozi, ha onwe ha agaa zie eze Devid. 18Ma otu nwokorobịa hụrụ ha gaa gwa Absalọm. Ya mere, ha abụọ mere ngwangwa baa nʼụlọ otu nwoke onye Bahurim, onye nwere olulu mmiri nʼogige ya, ha rịdara nʼime olulu ahụ 19Nwunye nwoke ahụ weere ihe mkpuchi ya tụsaa nʼọnụ olulu mmiri ahụ gbasaakwa mkpụrụ ọka nʼelu ya. Ọ dịghị onye maara maka ya.
20Mgbe ndị ozi Absalọm bịaruru jụọ nwanyị ahụ, “Olee ebe Ahimaaz na Jonatan nọ”?
Nwanyị ahụ zara, “Ha agafeela mmiri iyi.” Ndị ozi Absalọm chọrọ ha ma ha ahụghị ha. Ha laghachiri na Jerusalem.
21Mgbe ha lawara, mmadụ abụọ ahụ sitere nʼolulu mmiri ahụ rigopụta, gaa gwa eze Devid. Ha sịrị ya, “Bilie gafeenụ mmiri ngwangwa, nʼihi na Ahitofel adụọla Absalọm ọdụ otu a na otu a megide gị.” 22Nke a mere Devid na ndị niile so ya biliri gafee osimiri Jọdan. Mgbe chi ụtụtụ na-abọ, ha niile nọ nʼofe nke ọzọ Jọdan.
23Mgbe Ahitofel hụrụ na-emeghị ndụmọdụ ya, o biliri jikwaa ịnyịnya ibu ya, laa nʼụlọ ya nʼobodo ya. Mgbe o ruru nʼụlọ ya, o doziri nʼezinaụlọ ya nʼusoro, were ụdọ kwụgbuo onwe ya. Ọ nwụrụ. E lie ya nʼili nna ya.
Ọnwụ Absalọm
24Devid batara Mahanaim oge Absalọm gabigara Jọdan, ya na ndị ikom Izrel so ya. 25Absalọm họpụtakwara Amasa mee ya onyeisi ndị agha, nʼọnọdụ Joab. Amasa bụ nwa nwoke Itra, onye Ishmel, onye lụrụ Abigel, nwa nwanyị Nahash, onye bụkwa nwanne nwanyị Zeruaya nne Joab. 26Absalọm na ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼala Gilead.
27Mgbe Devid bịarutere Mahanaim, Shobi nwa Nahash onye obodo Raba nke dị nʼala ndị Amọn, na Makia nwa Amiel onye si Lo Deba, na Bazilai, onye Gilead si Rogelim 28wetara ute e ji edina ala, na ite isi nri, na efere e ji eri nri bụ ọrụ onye ọkpụ ite. Tinyere ọka wiiti na ọka balị, ụtụ ọka na ọka a ṅara nʼọkụ, akịdị na lentil. 29O wetakwara mmanụ aṅụ, na bọta, atụrụ na chiizi nke sitere na mmiri ara ehi nye Devid na ndị so ya ka ha rie. Nʼihi na ha sịrị, “Ike agwụla ndị mmadụ, agụụ na-agụ ha, akpịrị na-akpọkwa ha nkụ, nʼime ọzara.”
Did you know?
Conflicting Counsel and David's Escape
- Hushai intentionally advised Absalom to delay his attack and gather all Israel "from Dan to Beersheba," a traditional expression designating the entire extent of the land. This strategic delay thwarted Ahithophel's plan for a swift strike and bought King David enough time to lead his people across the Jordan River.Sources: the Bible text itself · Hushai · Beersheba
- To relay intelligence to David, the young priests Ahimaaz and Jonathan stationed themselves at the spring of En-rogel outside Jerusalem. When Absalom's scouts detected them, the messengers hid inside a courtyard well in Bahurim, where a resident woman concealed them under a spread cloth and scattered grain.Sources: the Bible text itself · Ahimaaz · Jonathan
- After crossing the Jordan, David found refuge in Mahanaim, a fortified town east of the river. There, prominent local leaders supplied the exhausted royal party with bedding, pottery, and food including lentils, roasted grain, honey, and cheese.Sources: the Bible text itself · Mahanaim
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Dan · Today: Tel Dan · 33.249, 35.652 · verse 11
- Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verses 16, 21, 22, 24
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · verse 20
- Gilead · Today: Gilead 1 · 32.187, 35.692 · verses 26, 27
- Ammon · 31.955, 35.934 · verse 27
- Rabbah · Today: Amman · 31.955, 35.934 · verse 27
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org