2 Samuel 16
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Devid na Ziba
1Mgbe Devid gafechara elu ugwu ahụ na-agbada nʼakụkụ nke ọzọ ya, Ziba, onye na-elekọta akụ Mefiboshet, guzo na-eche ya. Ọ chị ịnyịnya ibu bu narị ogbe achịcha abụọ, na otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị ụyọkọ mkpụrụ osisi ndị ọzọ, na karama akpụkpọ buru ibu mmanya juru nʼime ya.
2Eze jụrụ Ziba sị, “Gịnị mere i ji bute ihe ndị a?”
Ziba zara sị, “Ịnyịnya ibu ndị a bụ nke ndị ụlọeze ga-anọkwasị. Achịcha na mkpụrụ osisi ndị a bụ nke ndị ikom gị ga-eri. Mmanya a bụ nke ndị na-ada mba nʼọzara ga-aṅụ.”
3Eze jụrụ ya sị, “Ebeekwanụ ka nwa nna gị ukwu nọ?”
Ziba zara ya sị, “Ọ nọ na Jerusalem nʼihi na ọ sịrị, ‘Taa ụlọ Izrel ga-enyeghachi m alaeze nna nna m.’ ”
4Eze gwara Ziba sị ya, “Nʼihi ya, enyela m gị ihe niile Mefiboshet nwere, ha ga-abụkwa nke gị.”
Ziba sịrị, “Ka m hụta amara nʼihu eze, bụ onyenwe m.”
Shimei abụọ Devid ọnụ
5Dịka eze bụ Devid na-abịaru obodo Bahurim, lee, otu nwoke sitere nʼagbụrụ ụlọ Sọl sitere nʼebe ahụ pụta. Ọ bụ Shimei nwa Gera. Ọ na-akọcha mgbe ọ na-apụta ya. 6Ọ chịịrị nkume na-atụ Devid na ndị ozi eze niile. Ọ bụ ezie na ndị agha Izrel na ndị na-eche Devid nche gbara ya gburugburu nʼaka nri na aka ekpe. 7Ma dịka Shimei na-akọcha, ọ sịrị, “Si nʼebe a pụọ, si nʼebe a pụọ, gị ogbu mmadụ, gị onye ọjọọ! 8Onyenwe anyị akwụghachila gị ụgwọ ọbara niile ị wụsiri nʼezinaụlọ Sọl, onye ị nọchiri ọnọdụ ya dịka eze. Onyenwe anyị anapụla gị alaeze ahụ, were ya nye Absalọm nwa gị! Ugbu a, ihe i metara abịala gị ụgwọ, gị ogbu mmadụ.”
9Abishai, nwa Zeruaya gwara eze okwu sị, “Nʼihi gịnị ka nkịta a nwụrụ anwụ ga-eji na-akọcha onyenwe m bụ eze? Biko, ka m gafee gaa bipụ ya isi.”
10Ma eze zara sị, “Gịnị jikọrọ mụ na unu, unu ụmụ ndị ikom Zeruaya. Ọ bụrụ na ọ na-akọcha m nʼihi na Onyenwe anyị sị ya ‘Kọchaa Devid,’ onye pụrụ ịjụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere ị ji na-eme ihe dị otu a?’ ”
11Mgbe ahụ, Devid gwara Abishai na ndị ozi ya okwu sị, “Nwa m nwoke, onye si nʼahụ m na-agbalị ịnapụ m ndụ m. Gịnị ga-eme ka onye Benjamin a ghara ime karịa? Hapụ ya, ya kọchaa, nʼihi na Onyenwe anyị agwala ya ka ọ kọchaa m. 12Ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-ahụ ọnọdụ ahụhụ m, nyeghachikwa m ngọzị nʼọnọdụ nkọcha ndị a.”
13Ya mere, Devid na ndị ya gakwara nʼihu ije ha nʼụzọ ahụ ma Shimei sokwara ha na-aga nʼakụkụ ugwu ahụ na-akọcha ha. Ọ nọgidekwara na-atụ Devid nkume, na-ekpolikwa aja elu ka ọ na-awụsa ha nʼahụ. 14Ya mere, eze na ndị niile so ya gagidere bịaruo nʼakụkụ Jọdan nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ. Nʼihi ya, ha nọdụrụ nʼebe ahụ zuo ike.
Ndụmọdụ Hushaị na Ahitofel
15Ma Absalọm na ndị Izrel abatalarị Jerusalem. Ahitofel sokwa ya. 16Mgbe Hushaị, enyi Devid, onye Akai bịaruru, ọ gara hụ Absalọm sị ya, “Ka eze dị ogologo ndụ, ka eze dị ndụ.”
17Absalọm sịrị Hushaị, “Ọ bụ otu a ka i si egosi ịhụnanya i nwere na-ebe enyi gị nọ? Gịnị mere i soghị ya?”
18Hushaị zara Absalọm sị, “Mba! Onye ahụ Onyenwe anyị na ọha mmadụ na ndị Izrel niile họpụtara, nke onye ahụ ka m ga-abụ. Ọ bụkwa onye ahụ ka m ga-adịnyere. 19Ma onye kwanụ ka m kwesiri ijere ozi? Ọ bụghị nwa eze? Ejeere m nna gị ozi, ugbu a anọkwa m jikere ijere gị ozi!”
20Absalọm tụgharịrị gwa Ahitofel okwu sị, “Gịnị ọzọ ka m ga-eme? Nye anyị ndụmọdụ gị. Gịnị ka anyị kwesiri ime?”
21Ahitofel zara, “Ga dinaa ndị iko nwanyị nna gị ndị ahụ ọ hapụrụ ka ha lekọtaa ụlọ. Mgbe ahụ, Izrel niile ga-anụ na ị meela onwe gị ihe na-asọ oyi nʼebe nna gị nọ, aka ndị niile nọnyere gị ga-akwụkwa chịm.” 22Ya mere, ha manyeere Absalọm ụlọ ikwu nʼelu ụlọ; ọ kpọkwaara ndị iko nwanyị nna ya dinaa ha nʼotu nʼotu, nʼihu ndị Izrel niile.
23Nʼoge ahụ, ndụmọdụ ọbụla Ahitofel dụrụ dị ka a ga-asị na ọ bụ ozi si nʼọnụ Chineke nʼonwe ya bịa. Ọ bụladị nʼebe Devid nọ, na nʼebe Absalọm nọkwa, otu a ka esi bulie ndụmọdụ ọbụla Ahitofel nyere elu.

Did you know?
David's Flight and Absalom's Entry
- As David fled down toward the Jordan valley, he passed near Bahurim, where a Benjamite named Shimei son of Gera walked along the opposite ridge. Belonging to the family of the house of Saul, Shimei cursed David, threw stones, and cast dust, accusing him of bringing ruin upon Saul's family.Sources: Shimei · Bahurim · the Bible text itself
- Ziba, a former servant of Saul's house, brought donkeys, bread, fruit, and wine to David during his flight. Ziba claimed that Jonathan's disabled son Mephibosheth had stayed in Jerusalem hoping the kingdom would be restored to his grandfather Saul, leading David to grant all of Mephibosheth's possessions to Ziba.Sources: Ziba · Mephibosheth · the Bible text itself
- After taking Jerusalem, Absalom received counsel from Ahithophel, whose advice was revered like the word of God. To thwart Ahithophel's strategies, David's loyal friend Hushai the Archite feigned allegiance to Absalom to remain inside the rebel court.Sources: Ahithophel · Hushai · the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Mount of Olives · 31.778, 35.246 · verse 1
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 3, 15
- Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verse 14
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org