2 Kings 5
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Neeman onye ekpenta
1Nʼoge a, Neeman bụ ọchịagha ndị agha eze Aram, Ọ bụ onye dị ukwuu nʼanya nna ya ukwu, bụrụkwa onye a na-enye nsọpụrụ nʼihi na Onyenwe anyị sitere nʼaka ya nye ndị agha Aram mmeri nʼọgbọ agha dị iche iche. Ọ bụ dike na dimkpa nʼagha, maọbụ onye ekpenta.
2Otu mgbe, ụfọdụ nʼime ndị agha Aram na-apụnara ndị mmadụ ihe pụrụ ga dọta otu nwaagbọghọ nta site nʼIzrel, onye na-ejere nwunye Neeman ozi. 3Ọ sịrị nne ya ukwu, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na nna m ukwu ga-aga hụ onye amụma nọ na Sameria. Ọ ga-agwọ ya ọrịa ekpenta a.”
4Neeman nụrụ nke a, bilie gaa kọọrọ eze Aram ihe niile nwaagbọghọ a si Izrel kwuru. 5Eze Aram sịrị, “Bilie, gaa, aga m ezigakwara eze Izrel akwụkwọ ozi.” Ya mere Neeman gara, ọ chịịrị talenti ọlaọcha iri, na puku shekel ọlaedo isii, na uwe ọma dị iche iche, nke dị iri nʼọnụọgụgụ. 6Nke a bụkwa ihe dị nʼime akwụkwọ ahụ eze Aram degaara eze Izrel: “Nwoke a ji akwụkwọ a bịakwute gị bụ Neeman, onyeisi ndị agha m. Biko, achọrọ m ka ị gwọọ ya ọrịa ekpenta dị ya nʼahụ.”
7Ngwangwa eze Izrel gụrụ akwụkwọ ahụ, ọ dọwara uwe ya sị, “Abụ m Chineke? A pụrụ m ime ka mmadụ nwụọ na ime ka mmadụ dị ndụ? Gịnị mere nwoke a ji ezitere m onye m ga-agwọ ọrịa ekpenta? Lee ka o si na-achọ ụzọ anyị ga-eji nwee esemokwu.”
8Mgbe Ịlaisha onye Chineke nụrụ na eze Izrel dọwara uwe ya, o ziri ozi a zigara ya sị, “Gịnị mere i ji dọwaa uwe gị? Zitere m Neeman. Ọ ga-amatakwa na e nwere onye amụma nʼIzrel.” 9Ya mere, Neeman bịarutere guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ Ịlaisha, ya na ịnyịnya ya, na ụgbọ agha ya. 10Ịlaisha zigara onyeozi ya nke bịara zie sị ya, “Jee saa ahụ gị ugboro asaa nʼosimiri Jọdan. I mee nke a, ekpenta ahụ ga-esi nʼakụkụ ahụ gị niile pụọ. Ị ga-adịkwa ọcha.”
11Ma Neeman were iwe nke ukwuu tụgharịa bido ịlaghachi ebe o si bịa. Mgbe ọ na-ala, ọ na-ekwu na-asị, “Echere m na ọ ga-apụkwute m, guzo, kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya, fufee aka ya nʼebe ahụ ọrịa m dị, gwọọ m ọrịa ekpenta m. 12Abana na Fapa, bụ osimiri dị na Damaskọs, ha adịghị mma karịa mmiri Izrel niile? Ọ bụ na m enweghị ike ịsa ahụ nʼime ha ma dị ọcha.” Ọ tụgharịrị jiri ọnụma pụọ.
13Ma ndị ozi Neeman jekwuru ya sị ya, “Nna anyị, a sị na ọ bụ ihe sịrị ike nke ukwuu ka onye amụma ahụ gwara gị sị gị mee, ị garaghị eme ya? Ma ihe ọ sị gị mee bụ naanị ‘Gaa saa ahụ gị ka ị dị ọcha.’ ” 14Ya mere, ọ gara sụnye onwe ya nʼime osimiri Jọdan ugboro asaa, dịka onye nke Chineke gwara ya. Anụ ahụ ya lọghachiri dị ọcha ka anụ ahụ nwantakịrị.
15Mgbe ahụ, Neeman na ndị niile ya na ha so laghachikwutere onye nke Chineke. O guzoro nʼihu ya sị, “Ugbu a amatala m na ọ dịghị Chineke ọzọ dị nʼụwa niile ma ọ bụghị naanị nʼIzrel. Ya mere, biko, nara onyinye a site nʼaka ohu gị.”
16Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye m na-ejere ozi, agaghị m ana gị ihe ọbụla.” Ma Neeman rịọrọ ya arịrịọ ka ọ nara ya, ma ọ jụrụ ajụ.
17Mgbe ahụ Neeman sịrị, “Ọ bụrụ na ị gaghị anara, biko, kwerenụ ka m kporo aja nke ịnyịnya abụọ nwere ike ibu. Nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, agaghị m achụrụ chi ọzọ aja nsure ọkụ, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị. 18Ma ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị naanị otu ihe a. Mgbe nna m ukwu banyere nʼụlọ arụsị Rimọn ịkpọ isiala, mgbe ọ na-adabere nʼaka m, nke ga-eme ka mụ onwe m kpọọkwa isiala. Mgbe m si otu a kpọọ isiala nʼụlọ arụsị Rimọn, ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị nʼihi nke a.”
19Ịlaisha zara sị ya, “Ọ dị mma, laa nʼudo.”
Mgbe Neeman lawara, o jerubeghị ebe dị anya, 20Gehazi, bụ onyeozi Ịlaisha onye nke Chineke, sịrị nʼobi ya, “Nna m ukwu emezighị ikwere ka Neeman onye Aram laa na-anataghị ya ihe o ji bịa. Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m eji ọsọ gbakwuru ya napụta ya ụfọdụ ihe ahụ.”
21Ya mere, Gehazi gbara ọsọ gbakwuru Neeman. Mgbe Neeman hụrụ ya ka ọ gba ọsọ na-abịa, o si nʼelu ụgbọ agha ya wudata gaa zute ya, jụọ ya sị: “Udo ọ dịkwa?”
22“E, udo dị,” ka Gehazi zara, “Onyenwe m zitere m ka m gwa gị, ‘Lee, ụmụ okorobịa abụọ nʼetiti ndị amụma si nʼugwu Ifrem bịakwute m. Biko nye ha otu talenti ọlaọcha na uwe mgbanwe abụọ.’ ”
23Ma Neeman zara sị ya, “Biko, were talenti abụọ.” Ọ kwagidere Gehazi ka ọ nara ha. O kechiri talenti ọlaọcha abụọ ahụ nʼakpa abụọ, tinyere uwe mgbanwe abụọ. O bunyere ndị ohu ya ka ha buru ya na-aga nʼihu Gehazi. 24Ma mgbe ha rutere nʼugwu, Gehazi naara ndị ohu Neeman ihe ndị ahụ, sị ha laghachikwa. O zoro ihe ndị ahụ nʼime ụlọ.
25Mgbe ọ batara nʼụlọ guzo nʼihu nna ya ukwu, Ịlaisha jụrụ ya sị, “Ebee ka i si na-abịa Gehazi?”
Ọ zara, “Ohu gị ejeghị ebe ọbụla.”
26Mgbe ahụ Ịlaisha zara ya, “Ọ bụ na mmụọ m esoghị gị mgbe nwoke ahụ si nʼụgbọ ya rịdata izute gị? Oge a ọ bụ oge ịnara ego, na ịnara uwe, na ịnara ubi oliv, na ubi vaịnị, na igwe ehi, na igwe atụrụ, na ndị ohu ndị ikom, na ndị ohu ndị inyom na-eje ozi? 27Nʼihi nke a, ekpenta ahụ dị Neeman ga-abịakwasị gị, na ụmụ ụmụ gị, ruo mgbe ebighị ebi.” Ya mere, Gehazi ghọrọ onye ekpenta si nʼihu ya pụọ. Anụ ahụ ya bidokwara ịcha ọcha dịka ogho ọcha.

Did you know?
The Healing of Naaman
- When Elisha instructed Naaman to wash in the Jordan, the commander was indignant, boasting that the Abana and Pharpar, the rivers of Damascus, were superior to all the waters of Israel.Sources: the Bible text itself · Abana · Pharpar
- After being healed of his leprosy, Naaman requested as much Israelite soil as two mules could carry so that he could offer sacrifices exclusively to the LORD upon it back in Aram.Sources: the Bible text itself · Naaman
- Elisha's servant Gehazi pursued Naaman to secretly claim silver and clothing under false pretenses, leading Elisha to declare that Naaman's leprosy would cling to Gehazi and his descendants.Sources: the Bible text itself · Gehazi
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Syria · Today: Aram · 33.511, 36.306 · verses 1, 2, 5
- Samaria · 32.276, 35.195 · verse 3
- Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verses 10, 14
- Abana · Today: Barada River · 33.514, 36.305 · verse 12
- Damascus · 33.511, 36.306 · verse 12
- Aram · 33.511, 36.306 · verse 18
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org