Nations Bible

2 Kings 21

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Manase eze Juda

1Manase gbara afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ ise na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Hefziba. 2O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, site nʼịgbaso ihe arụ niile nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na mbụ mere, bụ ndị Onyenwe anyị chụpụrụ nʼihu ndị Izrel. 3O wugharịrị ebe dị elu niile nke nna ya Hezekaya lara nʼiyi. O wukwara ebe ịchụ aja dị iche iche nye Baal, pịakwa ogidi Ashera, dịka Ehab eze Izrel mere. Ọ kpọrọ isiala nye usuu ihe niile nke dị na mbara eluigwe, feekwa ha ofufe. 4O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya sị, “Ọ bụ na Jerusalem ka m ga-etinye Aha m.” 5O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe, nʼogige abụọ nke nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 6O jikwa nwa ya nwoke chụọ aja nʼime ọkụ, ọ gbara aja, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.

7O were chi Ashera a pịrị apị, bụ nke o mere, debe nʼime ụlọnsọ ahụ, nke Onyenwe anyị gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu, sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi. 8Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel wagharịa ọzọ site nʼala ahụ nke m nyere ndị nna nna ha, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu ma debekwa iwu niile nke ohu m bụ Mosis nyere ha.” 9Ma ha egeghị ntị, Manase duhiere ha, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel.

10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ ndị amụma ya, sị, 11“Nʼihi na Manase, eze Juda emeela ihe arụ ndị a, o meela ihe dị njọ karịa nke ndị Amọrait, bụ ndị bụ ya ụzọ, o werela arụsị ya duba Juda nʼime mmehie. 12Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, sịrị: Lee, ana m aga iweta mbibi dị ukwuu nke ga-adakwasị Jerusalem na Juda, nke ntị ọbụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru. 13Aga m esetipụ eriri ịtụ ọtụtụ nke m ji megide Sameria na ihe ịtụ mgbidi nke m ji megide ụlọ Ehab, nʼelu Jerusalem. Aga m ehichapụ Jerusalem dịka mmadụ si ehichapụ efere, hichaa ya ihu na azụ ma kpuo ya ihu nʼala. 14Aga m agbakụtakwa ndị fọdụrụ nʼihe nketa m azụ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha ga-aghọ ihe anaara nʼike, ghọọkwa ihe nkwata nʼagha nye ndị iro ha niile, 15nʼihi na ha emeela ihe dị njọ nʼanya m, kpasukwaa m iwe, site nʼụbọchị nna nna ha si Ijipt pụta ọbụladị ruo taa.”

16Nke ka nke, Manase gbukwara ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha, ruo na ọ wụsaara ọbara ha site nʼotu akụkụ Jerusalem ruo nʼakụkụ nke ọzọ ya, nke a agụnyeghị mmehie ahụ nke o dubara ndị Juda ime, nke mere ka ha mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.

17Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ihe niile o mere, tinyere mmehie niile nke o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 18Manase soro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼime ubi a gbara ogige nʼụlọeze ya, bụ ubi Ụza a gbara ogige. Amọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Amọn eze Juda

19Amọn gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ abụọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Meshulemet, ada Haruz onye Jotba. 20O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Manase mere. 21Ọ gbasoro ụzọ ahụ niile dị iche nke nna ya gbasoro. O fere arụsị niile nke nna ya fere, kpọọkwa isiala nye ha. 22Ọ jụrụ iso Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ya ha, jụkwa ibi ndụ irube isi nye ya.

23Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu eze nʼime ụlọeze ya. 24Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya.

25Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amọn na ihe ndị o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 26E liri ya nʼili nke aka ya, dị nʼogige Ụza. Josaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Did you know?

The Reigns of Manasseh and Amon

  • Manasseh ruled Judah for fifty-five years, the longest reign of any king in Jerusalem. He completely reversed the religious reforms of his father Hezekiah by building altars to Baal, introducing astral worship into the temple courtyards, and setting up a carved Asherah pole.Sources: the Bible text itself · Hezekiah
  • In pronouncing judgment, the prophets compared Jerusalem to Samaria and the house of Ahab of the northern kingdom of Israel, who had similarly introduced Baal worship. The metaphor of a measuring line and plumb line indicated that Jerusalem would face the same destruction as Samaria.Sources: the Bible text itself · Ahab · Samaria
  • Both Manasseh and his son Amon were buried in the garden of Uzza, located near the royal palace grounds in Jerusalem, rather than in the traditional royal tombs. After Amon was assassinated by palace servants following a two-year reign, the people executed the conspirators and crowned his eight-year-old son Josiah.Sources: the Bible text itself · Uzza · Amon · Josiah

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 1, 4, 7, 12, 13, 16, 19
  • Samaria · 32.276, 35.195 · verse 13
  • Egypt · 30.129, 31.308 · verse 15
  • Uzza · Today: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 18, 26

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.