Nations Bible

2 Kings 20

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ọrịa Hezekaya

1Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma nwa Emọz bịakwutere ya sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”

2Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ, kpee ekpere nye Onyenwe anyị, sị, 3“Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.

4Tupu Aịzaya esite nʼetiti ogige ụlọeze pụọ, okwu nke Onyenwe anyị rutere ya ntị, sị ya: 5“Gaghachi azụ, gaa gwa Hezekaya, onye na-achị ndị m, ‘Otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke nna gị Devid, kwuru: Anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị, aga m agwọ gị. Aga m eme ka ahụ dị gị ike nʼụbọchị nke atọ site taa, mgbe ahụ ị ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 6Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a nʼihi mụ onwe m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’ ”

7Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ.” Ha mere nke a, teekwasị ya nʼelu etuto ahụ, ahụ dịkwara ya mma.

8Mgbe ahụ, Hezekaya jụrụ Aịzaya sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na Onyenwe anyị ga-agwọ m, na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nʼụbọchị nke atọ na-abịa nʼihu?”

9Aịzaya zara, “Nke a bụ ihe ama Onyenwe anyị nye gị na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kwere na nkwa. Ị chọrọ ka onyinyo a gaa nʼihu ihe nrigo iri, ka ọ bụ ka ọ laa azụ ihe nrigo iri?”

10Hezekaya zara sị, “Ọ dị mfe ka onyinyo gaa nʼihu nzọ ụkwụ iri. Ma mee ka onyinyo a laa azụ ihe nrigo iri.”

11Mgbe ahụ, Aịzaya, onye amụma rịọrọ Onyenwe anyị ka o meere Hezekaya nke a. Onyenwe anyị mekwara ka onyinyo laghachi azụ ihe nrigo iri dịka o si gbada nʼihe nrigo ụlọ Ehaz.

Ndị ozi si Babilọn

12Nʼoge ahụ, Merodak-Baladan, nwa Baladan, bụ eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa. 13Hezekaya nabatara ndị ozi ahụ gosi ha ihe niile dị nʼụlọakụ ya, ọlaọcha, na ọlaedo, ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ na ezigbo mmanụ oliv, ụlọ ebe ngwa agha ya niile dị, na ihe niile bụ akụ o nwere. Ọ dịghị ihe dị nʼụlọeze ya maọbụ nʼalaeze ya niile nke ọ na-egosighị ha.

14Mgbe ahụ, Aịzaya onye amụma jekwuru eze Hezekaya jụọ ya sị, “Gịnị ka ndị ikom ndị ahụ kwuru? Ebeekwa ka ha si bịakwute gị?”

Hezekaya zara sị, “Ọ bụ nʼala dị anya ka ha si, ha si Babilọn.”

15Onye amụma jụrụ, “Gịnị ka ha hụrụ nʼụlọ gị?”

Hezekaya zara sị, “Ihe niile nke dị nʼụlọ m ka ha hụrụ. Ọ dịghị ihe niile dị nʼụlọakụ m nke m na-egosighị ha.”

16Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị Hezekaya, “Gee ntị nụrụ okwu Onyenwe anyị. 17Lee, oge na-abịa mgbe a ga-eburu ihe niile dị nʼụlọeze gị, na ihe niile nke nna nna gị ha debere nʼụlọakụ ruo taa, buru ha bulaa Babilọn. Ọ dịkwaghị ihe ga-afọdụ, otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 18A ga-ebupụ ụfọdụ nʼime ụmụ gị, ndị bụ ahụ na ọbara gị, ndị a ga-amụtara gị, buru ha pụọ nʼebe dị anya, ha ga-abụ ndị onozi nʼụlọeze nke eze Babilọn.”

19Hezekaya zaghachiri, “Okwu Onyenwe anyị nke i kwuru dị mma.” Nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụ na udo na nchekwa agaghị adị nʼoge ndụ m?”

20Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, ọrụ niile ọ rụrụ, tinyere ọdọ mmiri o gwuru, na olulu ọwa mmiri na-aga o gwuru, nke o ji webata mmiri nʼime obodo, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 21Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Hezekiah's Illness and the Babylonian Envoys

  • When Hezekiah asked for a confirming sign that he would recover from his mortal illness, the shadow retreated ten steps on the stairway of his father and predecessor, Ahaz.Sources: the Bible text itself · Ahaz · Hezekiah
  • Merodach-baladan, son of Baladan and king of Babylon, sent letters and a gift upon hearing of Hezekiah's recovery. After Hezekiah showed the envoys all the silver, gold, spices, and weapons in his storehouses, Isaiah announced that these treasures and royal descendants would one day be carried off to Babylon.Sources: the Bible text itself · Baladan · Babylon
  • Beyond his religious reforms and military defenses, the biblical text records Hezekiah's engineering feat of constructing a pool and a tunnel to bring water directly into the city of Jerusalem.Sources: the Bible text itself · Hezekiah

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Assyria · 36.359, 43.153 · verse 6
  • Babylon · 32.543, 44.422 · verses 12, 14, 17, 18

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.