Nations Bible

1 Thessalonians 2

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ọrụ Pọl rụrụ na Tesalonaịka

1Unu onwe unu maara, ụmụnna, na ọbịbịa anyị bịakwutere unu abụghị ihe lara nʼiyi. 2Anyị tara ahụhụ na mbụ e mekwara anyị ihe ihere na Filipai dịka unu maara, ma site nʼinyeaka Chineke anyị nwere obi ike ịgwa unu oziọma ya, ọ bụladị mgbe a na-eguzogide anyị nʼebe ọ dị ukwuu. 3Nʼihi na arịrịọ anyị na-arịọ unu esiteghị na njehie pụta maọbụ nʼọchịchọ nke na-adịghị ọcha ma ọ bụkwanụ nʼaghụghọ. 4Nʼaka nke ọzọ, anyị na-ekwu okwu dị ka ndị ozi Chineke nwapụtara, ndị o tinyere ọrụ oziọma a nʼaka na ntụkwasị obi idebe. Anyị adịghị agbalị ime ihe ga-atọ mmadụ ụtọ, kama anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, bụ onye na-enyocha echiche obi anyị. 5Ọ dịghị mgbe ọbụla, dị ka unu maara, anyị kwuru okwu nrafu maọbụ were ụzọ aghụghọ zoo anya ukwu anyị nwere. Chineke bụ onye akaebe anyị. 6Ọ dịghị mgbe anyị chọrọ ka ndị mmadụ ọbụla maọbụ unu, maọbụ ndị ọzọ, too anyị. 7Ọ bụ ezie, dị ka ndị ozi Kraịst, anyị gara abụ ibu arụ nye unu.

Kama, anyị biri nʼetiti unu site nʼịdị nwayọọ dị ka ndị bụ nne na-azụ ụmụntakịrị ha, na-elekọta ha. 8Nʼihi na anyị hụrụ unu nʼanya nke ukwuu ruo na ọ bụghị naanị na anyị kwusaara unu oziọma Chineke kama anyị nyekwara unu ndụ anyị. Nʼihi na unu dị anyị nʼobi nke ukwu. 9Nʼezie ụmụnna m, amaara m na unu ga-echeta otu anyị si rụọ ọrụ hụjuokwa anya nʼetiti unu. Anyị na-arụ ọrụ ehihie na abalị ịhụ na anyị rụtara ego ga-ezuru anyị, nʼihi na anyị achọghị ịbụ oke ibu nye onye ọbụla mgbe anyị na-ezisara unu oziọma Chineke. 10Unu onwe unu bụkwa ndị akaebe dị ka Chineke si bụrụ onye akaebe, na mmekọrịta anyị na unu bụ ndị kwere ekwe, bụ nwekọrịta dị ọcha na nke ezi omume, na nke ịta ụta ọbụla na-adịghị na ya. 11Nʼihi na anyị mesoro onye ọbụla nʼime unu dị ka nna si emeso ụmụ nke ya, 12na-agba unu ume, na-akasị unu obi, na-akwagidekwa unu na unu kwesiri ibi ndụ kwesiri ụmụ Chineke, onye kpọbatara unu nʼime alaeze ya na ebube ya.

13Nʼihi nke a, anyị ga-aga nʼihu na-ekele Chineke na-esepụghị aka, nʼihi na mgbe unu nabatara okwu Chineke, bụ nke unu nụrụ nʼọnụ anyị, unu anabataghị ya dị ka okwu mmadụ, kama otu ọ dịkwa nʼeziokwu, ya bụ okwu Chineke, nke na-arụsikwa ọrụ ike nʼime unu bụ ndị kweere ya. 14Unu onwe unu, ụmụnna m, ghọọnụ ndị na-eṅomi nzukọ nke Chineke nʼime Kraịst Jisọs, ndị nọ na Judịa. Nʼihi na unu onwe unu hụkwara otu ụdị ahụhụ ahụ nʼaka ndị ala unu, dị ka ha onwe ha hụrụ nʼaka ndị Juu. 15Ndị gburu ndị amụma, gbukwaa Onyenwe anyị Jisọs. Ugbu a ha na-akpagbukwa anyị na-achụpụ anyị. Ha na-emegide Chineke na mmadụ niile 16site nʼigbochi anyị izisara ndị mba ọzọ oziọma ka a ghara ịzọpụta ha. Ha na-esite nʼụzọ dị otu a na-eme ka iko mmehie ha na-eju. Ma ikpe Chineke adakwasịlarị ha.

Nzube Pọl

17Otu ọ dị, ụmụnna anyị, mgbe anyị si nʼetiti unu pụọ, nọọ nwa oge nta, ọnọdụ a mere anyị ndị na-enweghị nne na nna (maọbụ na-anụ ahụ ọ bụghị nʼime mmụọ), nʼihi otu unu si gụọ anyị agụụ, anyị gbalịrị ihu unu. 18Anyị gbalịsịrị ike ịbịakwute unu, karịsịa, mụ onwe m bụ Pọl gbalịrị, gbalịa ịbịa, ma ekwensu gbochiri anyị. 19Nʼihi na olee ihe bụ olileanya anyị, maọbụ ọṅụ anyị, maọbụ okpueze anyị, nke anyị ga-eji nyaa isi mgbe a ga-eme ka anyị niile guzo nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, mgbe ọ ga-abịa? Ọ bụ na ọ bụghị unu onwe unu? 20Nʼezie, unu onwe unu bụ ọṅụ na otuto anyị.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Ministry, suffering, and a blocked return

  • Paul reminds the readers that he and his companions had already endured suffering and shameful treatment in Philippi, yet were bold to speak the gospel despite strong opposition. Philippi, formerly called Crenides, was the capital of the province of Macedonia; Philip of Macedonia fortified the old Thracian town and gave it his own name, and under the emperor Augustus it became a Roman colony, a military settlement of Roman soldiers planted to control the recently conquered district, described as a miniature Rome.Sources: the Bible text itself · Philippi
  • Paul says that he tried again and again to return, but Satan obstructed him, though the desire to see the readers face to face had grown even stronger. The name Satan means adversary or accuser, and in the New Testament it is used interchangeably with the devil more than thirty times.Sources: the Bible text itself · Satan
  • The readers are described as imitators of the churches of God in Judea that are in Christ Jesus, having suffered from their own countrymen what those churches suffered. Under the Romans, in the time of Christ, Judea was the southernmost of the three divisions of Palestine and part of the province of Syria, including the territories of Judah, Benjamin, Dan, Simeon, and part of Ephraim.Sources: the Bible text itself · Judea

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Philippi · 41.012, 24.285 · verse 2
  • Judea · Today: Judea 1 · 31.777, 35.234 · verse 14

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.