1 Kings 2
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Ndụmọdụ Devid nyere Solomọn
1Mgbe ụbọchị ọnwụ eze Devid na-abịaru nso, o nyere nwa ya Solomọn iwu sị ya,
2“Oge ọnwụ m eruola,” ka ọ sịrị, “Ya mere, dị ike, meekwa dịka nwoke. 3Debe iwu niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị nyere, bie ndụ nʼụzọ ya niile. Debekwa ụkpụrụ na ihe niile o nyere nʼiwu, na ntụziaka ya niile dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mee nke a ka ihe niile ị ga-eme gaara gị nke ọma, nʼihe niile ị na-eme, nʼebe ọbụla ị na-eche ihu gị. 4Ka Onyenwe anyị mezuo nkwa o kwere banyere m, sị ‘Ọ bụrụ na ụmụ gị na ụmụ ụmụ ha elezie anya nʼotu ha si ebi ndụ, ọ bụrụ na ha ejegharịa nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi nʼihu m, jiri obi ha niile na mkpụrụobi ha mee nke a, ị gaghị achọ onye ga-anọkwasị nʼoche eze Izrel achọ.’
5“Ugbu a, gị onwe gị maara ihe Joab nwa Zeruaya mere m, ya bụ ihe o mere mmadụ abụọ bụ ndịisi agha Izrel, Abna nwa Nea, na Amasa nwa Jeta. O gburu ha, wufuo ọbara ha nʼoge udo, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe e mere nʼagha. O jikwa ọbara ahụ merụọ ihe okike o kere nʼukwu na akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ. 6Ị bụ nwoke maara ihe, ị makwaara ihe ị ga-eme. Ekwela ka Joab, nʼagbanyeghị isi awọ ya, nwụọ nʼudo.
7“Ma meere ụmụ Bazilai onye Gilead ebere. Meekwa ka ha bụrụ ndị na-eso gị rie ihe na tebul gị nʼihi na ha ji obi ha zute m mgbe m na-agba ọsọ ndụ nʼihi nwanne gị Absalọm.
8“Cheta Shimei, nwa Gera, onye Benjamin ahụ bi nʼobodo Bahurim, onye kọchara m nkọcha jọgburu onwe ya nʼụbọchị ahụ m jere Mahanaim. Mgbe ọ bịara izute m na Jọdan, eji m aha Onyenwe anyị ṅụọrọ ya iyi sị ya, ‘Agaghị m eji mma agha gbuo gị.’ 9Ma achọghị m ka ị hapụ ya dịka onye ikpe na-amaghị. Ị bụ nwoke maara ihe. Ị makwaara ihe ị ga-eme ya. Mee ka o jiri isi awọ ọbara juru baa nʼili.”
10Emesịa, Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. E liri ya na obodo Devid. 11Ma ọ chịrị Izrel iri afọ anọ; ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem. 12Solomọn nọdụrụ nʼocheeze nna ya Devid dịka eze. Alaeze ya guzosiri ike nke ukwuu. Ọchịchị ya gakwara nke ọma.
Iguzosi ike nke ịchị eze Solomọn
13Otu ụbọchị, Adonaịja nwa Hagit, bịakwutere Batsheba, nne Solomọn. Mgbe Batsheba hụrụ ya, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụkwa ọbịbịa udo ka ị bịara?”
Adonaịja zara sị ya, “E, abịara m nʼudo.” 14O kwuru sị, “O nwere ihe m nwere ịgwa gị.”
Nne Solomọn zara sị ya, “Kwuo.”
15Ọ zara sị, “Dịka ị maara, ọ bụ m nwe alaeze a. Ndị Izrel niile lekwara anya na m ga-abụ eze ha. Ma otu ọ dị, ihe niile adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, alaeze a aghọọla nke nwanne m, nʼihi na o si nʼaka Onyenwe anyị rute ya aka. 16Ugbu a, enwere m otu ihe m na-arịọ nʼaka gị. Biko ajụkwala imere m ya.”
Batsheba sịrị ya, “Gịnị bụ arịrịọ gị? Kwuo ihe ọ bụ.”
17Ọ zaghachiri ya sị, “Biko rịọrọ m Solomọn eze, nʼihi na amaara m na ọ ga-eme ihe ọbụla ị rịọrọ ya, ka ọ kpọnye m Abishag, nwanyị Shunem ahụ, ka ọ bụrụ nwunye m.”
18Batsheba zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m agwara gị eze okwu.”
19Emesịa, Batsheba bịakwutere eze Solomọn ịgwa ya okwu banyere Adonaịja. Mgbe ọ na-abata, eze sitere nʼocheeze ya bilie gaa izute ya, kpọkwaa isiala nye ya nọdụ ala nʼocheeze ya. O mere ka e butere nne eze ocheeze, ọ nọdụkwara ala nʼaka nri ya.
20Ọ sịrị, “Enwere m arịrịọ nta m chọrọ ịrịọ gị. Ajụkwala i mere m ya.”
Eze zaghachiri, “Rịọọ ya nne m. Agaghị m ajụ i mere gị ya.”
21Ya mere ọ sịrị, “Biko, kwere ka enye nwanne gị nwoke Adonaịja Abishag nwanyị Shunem, ka ọ bụrụ nwunye ya.”
22Eze Solomọn zara nne ya sị, “Gịnị mere i ji rịọọ m ka m nye Adonaịja naanị Abishag nwanyị Shunem ka ọ bụrụ nwunye ya? Ị gaara arịọkwa m sị m nye ya alaeze m. Nʼihi na ọ bụ ya tọrọ m” Ị gaara arịọkwa nʼihi Abịata onye nchụaja ma Joab nwa Zeruaya.
23Mgbe ahụ, eze Solomọn ji Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na Adonaịja ejighị ndụ ya kwụọ ụgwọ nʼihi arịrịọ a. 24Ugbu a, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ mere ka m nọgidesie ike nʼocheeze nna m Devid, onye mere ka ọchịchị eze m malite dịka o kwere na nkwa, a ga-eme ka Adonaịja nwụọ taa.” 25Eze Solomọn zigara Benaya nwa Jehoiada ka ọ gaa gbuo Adonaịja. Benaya gakwara tigbuo Adonaịja.
26Eze kpọkwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Laghachi azụ nʼubi gị nʼAnatot. I kwesiri ịnwụ ọnwụ ma ọ bụghị ugbu a ka a ga-egbu gị nʼihi na i buru igbe ọgbụgba ndụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼoge nna m Devid dị ndụ. I sokwa ya hụọ ahụhụ nʼoge ahụ niile o nwere nsogbu.” 27Ya mere, Solomọn chụpụrụ Abịata ka ọ ghara ịbụ onye nchụaja Onyenwe anyị ọzọ. Otu a ka o si mezuo bụ okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru banyere ezinaụlọ Elayị na Shaịlo.
28Ma mgbe Joab nụrụ na Adonaịja anwụọla, ọ gbaara ọsọ gaa nʼụlọ nzute Onyenwe anyị jigide mpi dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja aka. Ọ bụ ezie na Joab so Adonaịja gbaa izu imegide Solomọn, ma o soghị Absalọm gbaa izu imegide Devid. 29Mgbe a gwara eze Solomọn, na Joab a gbabala nʼụlọ ikwu Onyenwe anyị, nọdụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja. Solomọn nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu sị, “Gaa, tituo ya nʼala.”
30Benaya banyere nʼime ụlọ nzute Onyenwe anyị, sị Joab, “Eze sị gị, ‘pụta ezi!’ ”
Ma ọ zara, “Mba, aga m anwụ nʼebe a.”
Nʼihi nke a, Benaya jekwuru eze gwa ya ihe Joab kwuru.
31Mgbe ahụ, eze nyere Benaya iwu sị ya, “Gaa mee dịka o kwuru. Gbuo ya, liekwa ya. Nke a ga-eme ka ikpe ọmụma ghara ịdịrị mụ na ezinaụlọ nna m Devid nʼihi ikpe ọmụma dịrị Joab maka ọbara ndị aka ha dị ọcha ọ wụsiri. 32Onyenwe anyị ga-emekwa ka ọbara ọ wụsiri laa ya nʼisi, nʼihi na o ji mma agha gbuo ndị ikom abụọ, ma nna m Devid amaghị maka ya. Ha abụọ, ya bụ Abna nwa Nea, ọchịagha ndị Izrel, na Amasa nwa Jeta, ọchịagha ndị Juda, ndị dị mma ma bụrụkwa ndị ezi omume karịa ya. 33Ka ikpe ọmụma dị nʼihi igbu ọchụ ndị a dịkwasị Joab na ụmụ ụmụ ya nʼisi ruo mgbe ebighị ebi. Ma nʼebe Devid na ụmụ ụmụ ya, na ụlọ ya, na ocheeze ya dị, ka udo Onyenwe anyị dịkwasị ha ruo mgbe ebighị ebi.”
34Benaya nwa Jehoiada gara gbuo Joab. E liri ya nʼala nke ya dị nʼọzara. 35Mgbe ahụ, eze họpụtara Benaya, nwa Jehoiada ka ọ bụrụ onyeisi ndị agha ya niile, ma mee Zadọk onye nchụaja nʼọnọdụ Abịata.
36Emesịa, eze ziri Shimei ozi sị ya, “wuoro onwe gị ụlọ na Jerusalem, biri nʼebe ahụ, esitekwala nʼebe ahụ pụọ jee ebe ọbụla. 37Nʼihi na ụbọchị ị ga-apụ gafee iyi dị na Ndagwurugwu Kidrọn, mara nke ọma na ị ghaghị ịnwụ. Ọbara gị ga-adịkwa gị nʼisi.”
38Shimei zara eze, “Okwu gị dị mma. Ohu gị ga-eme dịka onyenwe m bụ eze kwuru.” Shimei biiri nʼime Jerusalem, nọọkwa ọtụtụ ụbọchị.
39Ma nʼọgwụgwụ afọ atọ, ndị ohu abụọ Shimei nwere gbapụrụ ọsọ gbakwuru Akish, nwa Maaka, eze Gat. Ndị mmadụ bịara gwa Shimei sị ya, “Lee, ndị ohu gị nọ na Gat.” 40Nke a mere ka o bilie, rịkwasị nʼelu ịnyịnya ibu ya, gaa Gat, jekwuru Akish nʼihi ịchọ ndị ohu ya. Shimei gara mee ka ndị ohu ya soro ya laghachite azụ.
41Mgbe a gwara Solomọn na Shimei hapụrụ Jerusalem gaa Gat ma lọghachikwa azụ, 42eze ziri ozi kpọọ Shimei sị ya, “Ọ bụ na m adọghị gị aka na ntị, jiri aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, ‘Mara nke ọma nʼụbọchị ọbụla ị ga-esi nʼebe a pụọ gaa nʼebe ọbụla ọzọ, na ị ga-anwụ?’ Nʼoge ahụ, ị zara m sị m, ‘Okwu gị dị mma. Aga m emekwa ya.’ 43Ọ bụ gịnị mere i ji mebie iyi ị ṅụrụ nye Onyenwe anyị, jụkwa idebe ihe m nyere gị nʼiwu?”
44Eze gwakwara Shimei okwu sị ya, “I maara ihe ọjọọ niile i mere megide nna m Devid. Ugbu a Onyenwe anyị ga-akwụghachi gị ụgwọ nʼihi omume ọjọọ gị. 45Ma eze Solomọn ga-abụ onye a gọziri agọzi. Ocheeze Devid ga-eguzosikwa ike nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”
46Mgbe ahụ, eze nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu ka o gbuo Shimei. Ọ pụkwara tituo ya, ọ nwụọ.
Sitekwa nʼoge ahụ, alaeze Solomọn guzosiri ike nʼaka ya.

Did you know?
Solomon Establishes His Kingdom
- David died after reigning for forty years—seven in Hebron and thirty-three in Jerusalem—and was buried in the City of David. Before his death, he urged Solomon to observe the Law of Moses and gave specific instructions regarding figures from his reign, including Joab, the sons of Barzillai, and Shimei.Sources: the Bible text itself · Hebron · Jerusalem · David
- Adonijah, David's fourth son, asked Bathsheba to plead with Solomon so that he might marry Abishag the Shunammite, who had attended the late king. In ancient royal succession, requesting a late monarch's wife was treated as an aspiration to the throne, prompting Solomon to order Adonijah's execution.Sources: the Bible text itself · Abishag · Adonijah · Bathsheba
- Solomon consolidated his rule by removing leaders who had supported Adonijah, banishing the high priest Abiathar to Anathoth and executing Joab at the altar. Benaiah son of Jehoiada was then appointed commander over the army in place of Joab, while Zadok replaced Abiathar in the priesthood.Sources: the Bible text itself · Abiathar · Benaiah · Joab
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Gilead · Today: Gilead 1 · 32.187, 35.692 · verse 7
- Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verse 8
- City of David · 31.774, 35.236 · verse 10
- Hebron · Today: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · verse 11
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 11, 36, 38, 40, 41
- Shunem · Today: Sulam · 32.606, 35.334 · verses 17, 21
- Shiloh · Today: Khirbet Seilun · 32.056, 35.290 · verse 27
- Kidron · Today: Kidron River · 31.780, 35.240 · verse 37
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org