Zacarias 8
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Onyenwe anyị ekwe nkwa ịgọzi Jerusalem
1Okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị,
2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “Ana m ekwo ekworo dị ukwuu nʼihi Zayọn. Nʼezie, ekworo ahụ na-anụ m ọkụ dị ukwuu nʼahụ.”
3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Aga m alọghachi na Zayọn, bịa biri na Jerusalem. Mgbe ahụ, a ga-akpọ Jerusalem, obodo Eziokwu. A ga-akpọkwa ugwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile Ugwu Nsọ.”
4Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Agadi ndị ikom na agadi ndị inyom ga-anọdụkwa ala ọzọ na mbara ụzọ niile nke Jerusalem, onye ọbụla ga-ejidekwa mkpara nʼaka ya nʼihi ọnụọgụgụ afọ ha gbara. 5Okporoụzọ nke obodo ahụ niile ga-ejupụtakwa nʼụmụntakịrị ndị nwoke na ndị nwanyị na-egwugharị egwu na ama ebe ahụ.”
6Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “O nwere ike bụrụ na ihe ndị a ga-adị ka ihe dịkarịrị ike imezu nʼanya ndị ahụ ga-afọdụ nʼoge ahụ, ma ọ ga-abụ ihe dịkarịrị ike ime nʼanya m?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m azọpụta ndị m site na mba niile dị nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ. 8Aga m akpọghachitekwa ha, mee ka ha biri na Jerusalem. Ha ga-abụkwa ndị m, mụ onwe m ga-abụ Chineke ha, onye ezi omume na onye kwesiri ntụkwasị obi.”
9Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “Ka aka unu sie ike, ka enwe ike wuo ụlọnsọ a, unu ndị na-anụ ugbu a otu okwu ahụ, nke ndị amụma kwuru mgbe a tọrọ ntọala iwugharị ụlọnsọ m, bụ ụlọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 10Tupu ụbọchị ahụ, akwụbeghị ma ndị mmadụ ma ụmụ anụmanụ ụgwọ ọrụ ha. Ọ dịghịkwa udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼihi ndị iro ya, ebe m mere ka onye ọbụla bụrụ onye na-emegide ibe ya. 11Ma ugbu a, agaghị m emeso ndị fọdụrụ nʼala a, dịka m si meso ha nʼoge gara aga.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
12“Nʼihi na mkpụrụ ga-eto nke ọma, osisi vaịnị ga-amị mkpụrụ ya, ala ubi ga-ewepụtakwa ihe omume, igirigi eluigwe ga-ezokwasịkwa ala. Ihe ndị a niile ka m ga-enye ndị fọdụrụ nʼala a ka ọ bụụrụ ha ihe nketa. 13Dịka unu bụ Juda na Izrel si bụrụ ihe a na-abụ ọnụ nʼetiti mba dị iche iche, otu a ka m ga-esi zọpụta unu, unu ga-abụkwa ngọzị. Unu atụla ụjọ, kama meenụ ka aka unu sie ike nʼọrụ unu.”
14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Dịka m si kpebie ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu, na dịka m na-egosighị ebere nʼahụ nna nna unu ha mgbe ha kpasuru m iwe,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, 15“otu a ka m kpebikwara ọzọ nʼụbọchị ndị a imere Jerusalem na Juda ihe ọma. Unu atụla ụjọ. 16Ihe ndị a ka unu ga-eme: Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, kpeenụ ikpe eziokwu nʼụlọikpe unu, nke a na-eweta udo. 17Unu echela echiche ọjọọ megide ibe unu; unu ahụla ịṅụ iyi ụgha nʼanya. Ihe ndị a niile ka m kpọrọ asị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
18Okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị,
19Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu: “Ibu ọnụ unu na-ebu nʼọnwa nke anọ, ọnwa nke ise, ọnwa nke asaa na nʼọnwa nke iri ga-aghọrọ unu oge ịṅụrị ọṅụ na oge obi ụtọ. Ha ga-abụrụ Juda mmemme obi ụtọ. Nʼihi ya, hụnụ eziokwu na udo nʼanya.”
20Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwukwa: “Ndị dị iche iche na ndị bi nʼọtụtụ obodo dị iche iche ka ga-abịa. 21Ndị bi nʼotu obodo ga-ejekwa nʼobodo ọzọ, sị, ‘Ka anyị jee na-atụfughị oge gaa rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ, ka anyị chọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Mụ onwe m na-ejekwa.’ 22Ọtụtụ ndị mmadụ na ọtụtụ mba dị ike ga-abịa Jerusalem ịchọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ịrịọ ya arịrịọ.”
23Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼụbọchị ndị ahụ, mmadụ iri, ndị ga-esi na mba dị iche iche, ndị na-asụkwa asụsụ dị iche iche, ga-ejide otu onye Juda aka nʼọnụ ọnụ uwe ya na-asị, ‘Kwere ka anyị soro gị jee, nʼihi na anyị anụla na Chineke nọnyeere unu.’ ”

Você sabia?
A restauração e a futura bênção de Jerusalém
- Zacarias profetizou por volta de 519 a.C. para encorajar o remanescente que havia retornado para reconstruir o templo em Jerusalém após anos de adversidades e conflitos.Fontes: Prophecies of Zechariah · o próprio texto bíblico
- A profecia descreve Jerusalém—historicamente ligada ao Monte Sião—transformada de ruínas vulneráveis em uma cidade segura e próspera, onde idosos apoiados em seus bordões e crianças brincando enchem as praças.Fontes: Jerusalem · Zion · o próprio texto bíblico
- Os jejuns tradicionais guardados no quarto, quinto, sétimo e décimo meses seriam transformados em festas alegres, antecipando uma época em que pessoas de muitas nações estrangeiras buscariam a Deus em Jerusalém.Fontes: o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 2, 3, 4, 8, 15, 20, 21, 22
- Zion · Hoje: Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 2, 3
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org