Romanos 9
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Chineke na ndị ya ọ họpụtara
1Ana m ekwu eziokwu nʼime Kraịst. Anaghị m ekwu okwu ụgha. Akọnuche m nke Mmụọ Nsọ na-achị na-agbakwara m ama. 2A nọ m nʼọnọdụ oke ihe mwute na ihe mgbu dị ukwuu nʼobi m. 3A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe mee, ejikeere m ịbụ onye a bụrụ ọnụ na onye e wepụrụ site nʼebe Kraịst nọ nʼihi ụmụnna m na ndị ikwu m, 4bụ ndị Izrel. Ndị Chineke họọrọ ka ha bụrụ ụmụ ya, ndị o nyere ebube ya na ọgbụgba ndụ ya. O nyekwara ha iwu na ife ofufe nʼụlọnsọ ukwu ahụ na ọtụtụ nkwa dị iche iche. 5Ha si nʼagbụrụ nna nna anyị ochie ha. Kraịst nʼonwe ya, nʼụdịdị mmadụ, sikwa nʼagbụrụ ha pụta, onye bụ Chineke nke ihe niile, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen.
Chineke adịghị ala azụ na nkwa ya
6Ọ bụghị dị ka a ga-asị na okwu Chineke na-ala azụ. Nʼihi na ọ bụghị onye ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị Izrel bụ onye Izrel. 7Na ha sitere nʼagbụrụ Ebraham pụta emeghị ka ha bụrụ ụmụ Ebraham nʼezie. Ma nʼakụkụ nke ọzọ, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.” 8Nke a na-egosi na ọ bụghị ndị niile a mụrụ na-anụ ahụ bụ ụmụ Chineke, kama ụmụ ndị ahụ e kwere na nkwa bụ ndị a na-agụnye dị ka ụmụ Ebraham site na nkwa ahụ. 9Lee ka e si kwee nkwa ahụ, “Mgbe oge ahụ a kara aka ruru, aga m alọghachi, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.”
10Ọ bụghị naanị nke a. Ụmụ Ribeka si nʼotu nna, ya bụ nna nna anyị Aịzik. 11Ma tupu a mụọ ụmụ ejima ndị a, ma ọ bụkwanụ tupu ha emee ihe ọbụla dị mma maọbụ nke dị njọ, iji mee ka ọchịchọ Chineke banyere nhọpụta ha guzoro, 12ọ bụghị site nʼọrụ kama ọ bụ site nʼonye ahụ nke na-akpọ, nʼihi na a gwara ya sị, “Nke okenye ga-ejere nke nta ozi.” 13Dịka e dere ya, “Jekọb ka m hụrụ nʼanya ma Ịsọ ka m kpọrọ asị.”
14Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ bụ onye ajọ omume? Mba! 15Nʼihi na ọ gwara Mosis,
“Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere,
ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.”
16Ya mere, ọ dabereghị nʼọchịchọ nke mmadụ maọbụ ịrụsị ọrụ ike ya kama ọ dabere nʼebere Chineke. 17Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ gwara Fero, “Emere m ka ị bụrụ ihe ị bụ nʼihi nke a, ka m were gị zipụta ike m, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.” 18Ọ pụtara ihe na ọ bụ naanị ndị Chineke chọrọ ka ọ na-emere ebere, ndị ọ chọkwara ka ọ na-eme ka ha bụrụ ndị obi ha kpọchiri akpọchi.
Iwe Chineke na ebere ya
19Ma eleghị anya unu pụrụ ịgwa m, “Gịnị kwanụ mere o ji ata anyị ụta? Onye kwanụ pụrụ iguzogide ihe o zubere ime?” 20Onye ka ị bụ gị mmadụ efu, iji ajụ Chineke ajụjụ? “Nkata mmadụ na-akpa ọ ga-ajụ onye na-akpa ya ajụjụ, ‘Onye sị gị kpaa m otu a?’ ” 21Otu a kwa, onye ọkpụ ite o nweghị ike isite nʼotu ụrọ ahụ o nwere kpụọ ụdị ite ọbụla masịrị ya, ụfọdụ ite pụrụ iche na ụfọdụ e ji eje ozi nʼụlọ?
22Ọ bụrụkwanụ na Chineke ekpebie igosi iwe ya na ime ka a mara ike ya site nʼinwe oke ndidi banyere ndị oke iwe ya ga-adakwasị bụ ndị a kwadoro maka mbibi? 23Ma ọ bụrụkwanụ na o mere nke a iji mee ka ndị ahụ ọ na-emere ebere mata ịba ụba nke ebube ya, bụ ndị o bururị ụzọ kwadoo maka ebube a. 24Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ? 25Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya,
“Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m.
Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.”
26Ma,
“Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha,
‘Unu abụghị ndị m,’
bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ nke Chineke dị ndụ. ’ ”
27Aịzaya bere akwa nʼihi ụmụ Izrel,
“Ọ bụ ezie na ọnụọgụgụ ụmụ Izrel dịka uzuzu dị nʼakụkụ osimiri,
maọbụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta.
28Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe.
Ọ ga-eme ọsịịsọ nʼikpe ahụ ma kpebie ya.”
29Ọ bụkwa dịka Aịzaya kwuru na mbụ,
“Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
ahapụrụghị anyị ụmụ ụmụ,
anyị gara adị ka Sọdọm,
anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.”
Ihe mere e ji jụ ndị Izrel
30Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na o enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ha gbasoro ezi omume, ma ha natara ya, bụ ezi omume nke sitere nʼokwukwe, 31ma ndị Izrel na-agbaso iwu nke ezi omume, enwebeghị ike ime onwe ha ndị a ga-anabata. 32Gịnị gbochiri ha? Ọ bụ nʼihi na ha agbasoghị ya site nʼokwukwe. Kama ha chere na ọ bụ site nʼọrụ. Ha zọhiere ụkwụ nʼoke nkume ịsọ ngọngọ ahụ. 33Dịka e dere ya,
“Lee, ana m atọgbọ na Zayọn nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ,
oke nkume nke na-eme ka ha daa.
Ma onye nke kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”

Você sabia?
Israel e os filhos da promessa
- Estes versículos argumentam que a palavra de Deus não falhou: nem todos os descendentes de Israel são Israel, e nem todos os descendentes de Abraão são filhos dele. Isaque foi o único filho de Abraão com Sara, e a promessa citada aqui segue essa linha: a descendência seria contada por meio de Isaque e, no tempo determinado, Sara teria um filho. O nome Sara, que significa princesa, foi dado quando se anunciou que ela seria a mãe do filho prometido.Fontes: o próprio texto bíblico · Isaac · Sarah
- O argumento passa então aos gêmeos de Rebeca, concebidos por um só homem, Isaque. Esaú, o primogênito, também foi chamado Edom, "vermelho", por causa do cozido de lentilhas vermelhas pelo qual vendeu o direito de primogenitura; Jacó, o mais novo, tem um nome que significa quem segue os calcanhares de outro, ou suplantador. Antes de os gêmeos nascerem ou de fazerem qualquer coisa boa ou má, foi dito a Rebeca que o mais velho serviria ao mais novo, e está escrito: "Amei Jacó, mas odiei Esaú".Fontes: o próprio texto bíblico · Esau (Edom) · Jacob (Israel)
- Isaías, filho de Amoz, é citado a respeito de um remanescente: ainda que os israelitas fossem como a areia do mar, só o remanescente seria salvo e, sem descendentes deixados pelo Senhor dos Exércitos, teriam ficado como Sodoma e semelhantes a Gomorra. Sodoma, cidade no vale de Sidim, foi destruída por fogo do céu, destruição que este capítulo recorda, e não se encontrou vestígio dela nem das outras cidades da planície. O capítulo termina com uma pedra de tropeço posta em Sião, a colina do sudeste de Jerusalém, que Davi tomou dos jebuseus, onde construiu uma cidadela e um palácio, e que se tornou a cidade de Davi.Fontes: o próprio texto bíblico · Isaiah · Sodom · Zion
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Zion · Hoje: Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 33
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org