Nations Bible

Apocalipse 9

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Opi ike nke ise

1Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu kpakpando si nʼeluigwe daa nʼala. E nyere ya ihe ọtụghe igodo nke e ji atụghe olulu nke Abis ahụ. 2Mgbe o meghere olulu Abis ahụ, anwụrụ ọkụ dị ukwu sitere nʼime ya pụta dịka anwụrụ ọkụ si nʼọkụ icheku ọkụ ya dị ukwuu, mee ka oke ọchịchịrị kpuchie ihu anyanwụ na mbara eluigwe. 3Igurube sitere nʼanwụrụ ọkụ ahụ pụta fedakwasa ụwa. E nyekwara ha ike ịta mmadụ ọbụla dịka akpị si agba mmadụ. 4E nyere ha iwu si ha emebila ahịhịa ndụ ọbụla, maọbụ osisi na ihe ọbụla a kụrụ nʼala. Kama ọrụ ha bụ ịbịakwasị mmadụ ọbụla na-enweghị akara Chineke nʼegedege ihu ya. 5Iwu e nyere ha abụghị ka ha gbuo ndị a, kama ọ bụ ka ha mekpaa ha ahụ ọnwa ise. Mmekpa ahụ ha dịka ahụ ụfụ na nhụju anya nke akpị mgbe ọ gbara mmadụ. 6Nʼime ụbọchị ndị ahụ, ọtụtụ mmadụ ga-achọ iji aka ha gbuo onwe ha ma ha agaghị enwe ike mee ya. Agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụ ha, ma ọnwụ ga-esi nʼebe ha nọ wezuga onwe ya.

7Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka ịnyịnya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ. 8Agịrị isi ha dịka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze ha dịkwa ka eze ọdụm. 9Ha yikwasịrị onwe ha ihe ikpuchi obi dịka nke e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka ụda nzọ ụkwụ ọtụtụ ịnyịnya nke ụgbọ agha na-esekpu na-abanye nʼọgbọ agha. 10Ha nwere ọdụdụ dịka akpị. Ma ike niile e nyere ha bụ imerụ ndị mmadụ ahụ ọnwa ise site nʼike dị nʼọdụdụ ha. 11Ha nwere mmụọ ozi nke Abis, onye na-achịkọta ha dịka eze. Aha ya nʼasụsụ Hibru bụ Abadọn, ma nʼasụsụ Griik ọ bụ Apolion.

12Ahụhụ nke mbụ agafeela, ebe ahụhụ abụọ ọzọ na-abịa nʼihu.

Opi ike nke isii

13Mgbe mmụọ ozi nke isii fụrụ opi ike ya, anụrụ m olu sitere na mpi anọ ahụ dị nʼebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo wuo, nke dị nʼihu ocheeze Chineke, 14na-agwa mmụọ ozi nke isii ahụ, nke ji opi ike okwu, “Tọpụ mmụọ ozi anọ ndị ahụ e kere agbụ nʼebe osimiri Yufretis dị.” 15A tọhapụrụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ, ndị e jibu eji na njikere maka oge awa ahụ, na ụbọchị ahụ, na ọnwa ahụ, na afọ ahụ, iji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ. 16Ndị agha ahụ, ọnụọgụgụ ha bụ narị nde abụọ. Anụrụ m mgbe e kwuru ole ha dị.

17Nʼime ọhụ m, ahụrụ m ịnyịnya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nʼelu. Ndị nọ nʼelu ịnyịnya ndị a yi ihe ikpuchi obi nke ụfọdụ nʼime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dịka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dịka anwụrụ ọkụ. Isi ịnyịnya ha dịka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ sị ha nʼọnụ na-apụta. 18E sitere nʼihe mmekpa ahụ ndị a, ire ọkụ, anwụrụ ọkụ na nkume ọkụ na-adịghị anyụ anyụ, ka ha ji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ niile bi nʼụwa. 19Ike ịnyịnya ndị a dị nʼọnụ ha, na ọdụdụ ha. Ọdụdụ ha dị ka agwọ, nwee isi agwọ nke ha ji emerụ mmadụ ahụ.

20Ma ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ, bụ ndị a na-egbughị site nʼihe ntaramahụhụ ọrịa ndị a, echegharịghị site nʼọrụ aka ha maọbụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha niile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na bronz na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị na-apụghị ịhụ ụzọ, maọbụ ịnụ ihe, maọbụ ije ije. 21Ha echegharịghị site nʼigbu mmadụ ha, maọbụ ụzọ mgbaasị ha, maọbụ ndụ ịkwa iko ha, na izu ohi ha pụta.

Você sabia?

O abismo, o destruidor e o Eufrates

  • Em Apocalipse 9, os gafanhotos são governados pelo anjo do Abismo, chamado Abadom em hebraico e Apoliom em grego. O Dicionário Bíblico de Easton (1897) explica o nome hebraico como destruição e o grego como destruidor, e sugere tomar a palavra como personificação da ideia de destruição ou como o Sheol, o reino dos mortos. Observa que o termo hebraico é traduzido como destruição em Jó e Provérbios, enquanto a Revised Version conserva Abaddon nas três últimas dessas passagens.Fontes: o próprio texto bíblico · Apollyon
  • Em Apocalipse 9, a sexta trombeta solta quatro anjos presos junto ao grande rio Eufrates. O Dicionário Bíblico de Easton (1897) registra o nome hebraico Perath, o assírio Purat e a forma persa em cuneiforme Ufratush, da qual vem o grego Eufrates; diz que o nome grego significa água doce e o assírio, a corrente ou a grande corrente. Nas Escrituras, o rio é muitas vezes apenas o rio ou o grande rio, citado como um dos rios do Paraíso e como limite da terra prometida aos descendentes de Abraão.Fontes: o próprio texto bíblico · Euphrates
  • Apocalipse 9 apresenta a quinta trombeta como o primeiro de três ais. Seus gafanhotos podem atormentar as pessoas por cinco meses com uma ferroada como a de um escorpião, mas não lhes é permitido matar. Passado esse ai, os cavalos vistos na sexta trombeta matam um terço da humanidade com o fogo, a fumaça e o enxofre que saem de suas bocas.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Euphrates · Hoje: Euphrates River · 31.004, 47.442 · versículo 14

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.