Nations Bible

Apocalipse 2

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Nzukọ dị nʼEfesọs

1“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị nʼEfesọs, sị ya:

Ihe ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ na-ejide kpakpando asaa nʼaka ya, ma na-ejegharịkwa nʼetiti ihe ịdọba oriọna ọlaedo asaa ndị ahụ.

2Amaara m ihe niile banyere ọrụ gị niile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachiobi gị. Amaara m na ị dịghị anagide ndị ajọ omume, na ị nwaleela ndị ahụ niile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nʼezie, chọpụtakwa na ha bụ ndị ụgha. 3I jirila ntachiobi nagide nhụju anya nʼihi aha m, ma ike agwụghị gị.

4Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị hapụla ịhụnanya mbụ ahụ i nwere. 5Cheta ọnọdụ i si na ya daa. Chegharịa, mekwa ihe ndị ahụ ị na-eme na mbụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m abịa wepụ ihe ịdọba oriọna gị site nʼọnọdụ ya. 6Ọ bụladị otu a, o nwere ihe ụfọdụ dị mma banyere gị. Ị kpọrọ ọrụ ọjọọ nke ndị Nikolaitan asị, dịka mụ onwe m si kpọọ ya asị.

7Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye ike iri mkpụrụ sitere nʼosisi ndụ ahụ nke dị na paradaịs nke Chineke.

Nzukọ dị na Smyrna

8“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smyrna, sị ya:

Ihe ndị a bụ okwu ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe niile. Onye nwụrụ anwụ ma dịkwa ndụ ọzọ.

9Amaara m mkpagbu gị niile na ịda ogbenye gị. Ma nʼezie, ị bụ ọgaranya. Amaara m ihe banyere nkwutọ niile ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị Juu na-ekwutọ gị, ma ha abụghị ndị Juu, nʼezie ha bụ ụlọ nzukọ ekwensu. 10Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ.

11Onye ọbụla nwere ntị ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Onye ọbụla na-emeri emeri, ọnwụ nke ugboro abụọ agaghị emekpa ya ahụ.

Nzukọ dị nʼobodo Pegamọm

12“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị Pegamọm, sị ya:

Ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ ji mma agha ahụ dị nkọ nke nwere ihu abụọ nʼaka ya.

13Amaara m ebe i bi, bụ obodo ebe ekwensu nwere ocheeze ya. Ma ị na-anọgidesi ike nʼaha m. Ị jụrụ ịgọnarị okwukwe gị nʼime m, ọ bụladị nʼoge Antipas onyeama m kwesiri ntụkwasị obi, bụ onye e gburu nʼobodo unu, ebe ekwensu bi.

14Ma enwere m ihe ole ma ole megide gị. I nwere ụfọdụ mmadụ ebe ahụ, ndị jidesiri nkuzi Belam ike, bụ onye kuziiri Balak ka o raa ụmụ Izrel ụra nke mere ka ha mehie, rie ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị, kwaakwa iko. 15Nʼotu aka ahụ, i nwekwara ụfọdụ mmadụ ndị jidesiri nkuzi Nikolaitan ike. 16Ya mere, chegharịa! Ma ọ bụghị otu a, aga m abịakwute gị ọsịịsọ jiri mma agha dị m nʼọnụ buso ha agha.

17Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Ọ bụ naanị onye na-emeri emeri ka m ga-enye ụfọdụ nʼime achịcha mánà ahụ e zoro ezo. Aga m enyekwa onye ahụ ezi nkume ọcha ahụ, nke edekwasịrị aha ọhụrụ nʼelu ya, nke onye ọbụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ natara ya.

Nzukọ dị nʼobodo Tiatira

18“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Tiatira, sị ya:

Ndị a bụ okwu sitere nʼaka Ọkpara Chineke, onye anya ya na-enwuba nʼebe niile dị ka ire ọkụ. Ụkwụ ya kwa na-egbu maramara dị ka bronz a nụchara nke ọma.

19Amaara m ọrụ gị niile, na ịhụnanya gị, na okwukwe gị. Amakwaara m ije ozi gị na ntachiobi gị, na-ahụkwa na ị na-arụ ọrụ ugbu a karịa ka i mere na mbụ.

20Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezebel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị nye ya ohere ka o were nkuzi asị na-eduhie ndị ohu m ụzọ, ka ha kwaa iko, riekwa ihe e ji chụọrọ arụsị aja. 21Enyela m ya ohere ka o si na mmehie ya chegharịa, ma ọ jụrụ ichegharị site na ndụ ịkwa iko. 22Lee, aga m etinye ya nʼute ahụhụ, meekwa ka ndị ya na ha na-akwa iko taa ahụhụ dị ukwuu. Ọ bụ naanị ma ha chegharịrị ka ihe ndị a na-agaghị abịakwasị ha. 23Ma nʼebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ niile ga-amata na abụ m onye na-enyocha mmụọ na mkpụrụobi niile. Aga m akwụghachikwa onye ọbụla nʼime unu ụgwọ ọrụ kwesiri ọrụ ya.

24Ugbu a, ana m agwa unu ndị fọdụrụ na Tiatira, unu ndị na-agbasoghị ozizi ya, ndị na-amụtabekwaghị ihe ndị ahụ ekwensu kpọrọ ihe nzuzo dị omimi, ‘O nweghị ibu arọ ọzọ m ga-ebokwasị unu, 25ma ọ bụghị, unu jidesienụ ihe unu nwere aka ike tutu ruo mgbe m ga-abịa.’

26Ma onye ọbụla na-emeri emeri, na-anọgidekwa na-eme uche m ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka m ga-enye ikike nʼebe mba niile nọ. 27Onye ahụ, ‘ga-eji mkpara igwe chịa ha, dịka mgbe a kụwachara ite aja na mpekele na mpekele.’ Ọ bụladị ka Nna m si nye m ike, 28a ga-enye onye nke meririnụ kpakpando ụtụtụ. 29Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Mensagens às Quatro Igrejas

  • Éfeso era a capital da Ásia proconsular e detinha o título romano de primeira e maior metrópole da província. Era famosa no mundo antigo pelo seu teatro ao ar livre para 50.000 espectadores e por abrigar o principal santuário e templo de Diana.Fontes: Ephesus · o próprio texto bíblico
  • Pérgamo, a principal cidade da Mísia situada perto do rio Caico, é descrita na carta como o lugar onde está o trono de Satanás. O texto elogia os crentes locais por manterem a fé mesmo quando Antipas, chamado de testemunha fiel, foi morto na cidade.Fontes: Pergamum · Antipas · o próprio texto bíblico
  • Localizada entre a Lídia e a Mísia, a cidade de Tiatira era renomada pela indústria de tinturaria, como confirmam inscrições antigas que mencionam sua guilda de tintureiros. No Novo Testamento, Lídia, uma vendedora de tecidos tingidos de púrpura, era natural dessa cidade.Fontes: Thyatira · o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Ephesus · 37.939, 27.341 · versículo 1
  • Smyrna · Hoje: Izmir · 38.419, 27.138 · versículo 8
  • Pergamum · Hoje: Pergamon · 39.132, 27.184 · versículo 12
  • Thyatira · Hoje: Akhisar · 38.920, 27.837 · versículos 18, 24

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.