Apocalipse 13
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Anụ si nʼosimiri pụta
1Agwọ ochie ahụ guzoro nʼakụkụ nʼọnụ oke osimiri ahụ. Ma ahụrụ m otu anụ ọhịa ka o si nʼime oke osimiri na-arịpụta. Anụ ọhịa a nwere isi asaa na mpi iri. Okpueze iri dịkwa nʼelu mpi ndị a. Aha e dekwasịrị nʼisi asaa ahụ nʼotu nʼotu bụ ikwutọ na ikwuhie Chineke. 2Anụ ọhịa a m hụrụ dị ka agụ, ma ụkwụ ya dịka ụkwụ anụ ọhịa bịa. Ọnụ ya dịkwa ka nke ọdụm. Agwọ ochie ahụ nyere ya ike ya, na ocheeze ya na ikike dị ukwuu. 3Otu nʼime isi ya nwere ọnya buru ibu, nke pụrụ iwetara ya ọnwụ, e mere ka ọnya ahụ laa. Ụwa niile sobere anụ ọhịa ahụ nʼazụ nʼịtụnanya. 4Ha kpọrọ isiala nye agwọ ochie ahụ nʼihi na o nyere anụ ọhịa ahụ ikike dị otu a. Ha bidokwara ịkpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ, na-asị, “Ebee ka onye ahụ nọ, nke dị ukwuu karịa ya, onye pụkwara ibu agha megide ya?”
5E nyekwara anụ ọhịa ahụ ọnụ na ike ikwu okwu mpako na ikike ikwulu ekwulu ọnwa iri anọ na abụọ. 6O meghere ọnụ ya malite ikwulu Chineke, na aha ya na ebe obibi ya, na ndụ ahụ bụ ndị bi nʼeluigwe. 7E nyere ya ike ibuso ndị nsọ agha na imeri ha. E nyekwara ya ikike ịchị agbụrụ niile, na ebo niile, na ndị niile, na mba niile na asụsụ niile. 8Ndị niile bi nʼelu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya, bụ onye ọbụla a na-edeghị aha ya nʼime akwụkwọ nke ndụ nke Nwa atụrụ ahụ e gbururị, site nʼoge e kere ụwa.
9Onye nwere ntị ya nụrụ.
10“Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla a ga-adọta nʼagha,
ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nʼagha.
Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla ga-anwụ site na mma agha,
aghaghị iji mma agha gbuo ha.”
Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume na iguzosikwa ike nʼokwukwe nke ndị Chineke.
Anụ ọjọọ si nʼime ala pụta
11Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhịa ọzọ dị iche ka o si nʼala na-arịpụta. O nwere mpi nta abụọ dịka mpi Nwa atụrụ, kama ọ na-ekwu okwu dịka agwọ ochie ahụ. 12Ọ na-achị isi nʼọnọdụ anụ ọhịa nke mbụ. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagide ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka ha kpọọ isiala nye anụ ọhịa mbụ ahụ nke a gwọrọ ọnya ya na-eweta ọnwụ. 13Ọ na-emekwa ọtụtụ oke ihe ịrịbama dị iche iche. O mere ọbụladị ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nʼụwa nʼihu mmadụ niile. 14O duhiekwara ndị mmadụ bi nʼụwa site nʼọrụ ịrịbama ya niile nke e nyere ya ike ịrụ nʼọnọdụ anụ ọhịa ahụ. Ọ gwakwara ndị niile bi nʼụwa ka ha kpụọ ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ nke e jiri mma agha merụchaa ahụ, ma mechaa dị ndụ. 15E nyere ya ike ikunye ume ndụ nʼime oyiyi nke anụ ọhịa mbụ ahụ, ime ka ihe a kpụrụ akpụ kwuo okwu mekwa ka e gbuo ndị niile na-akpọghị isiala nye ya. 16O nyere iwu ka onye ọbụla, onye ukwu na onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya, nata akara nʼaka nri maọbụ nʼegedege ihu ha. 17Ya mere, ọ dịghị onye ọbụla nwere ike ịzụ ahịa maọbụ ree ahịa ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị akara a, nke bụ aha anụ ọhịa ahụ, maọbụ ihe e ji mara ya, maọbụ ọnụọgụgụ nọchiri aha ya.
18Nke a ka chọrọ amamihe maka ịghọta ya. Ka onye ọbụla nwere ọgụgụisi, gụọ ọnụọgụgụ nke anụ ọhịa ahụ, nʼihi na ọ bụ ọnụọgụgụ mmadụ. Ọnụọgụgụ ahụ bụkwa narị isi na iri isi na isii, ya bụ 666.
Você sabia?
Duas bestas, adoração e o número 666
- A primeira besta sobe do mar com sete cabeças e dez chifres, com dez coroas reais nos chifres e nomes blasfemos nas cabeças. Ela é como um leopardo, com pés de urso e boca de leão, e o dragão lhe dá o seu poder, o seu trono e grande autoridade.Fontes: o próprio texto bíblico
- Uma das cabeças parece mortalmente ferida, mas a ferida mortal é curada, e o mundo inteiro se maravilha e segue a besta. As pessoas adoram o dragão que deu autoridade à besta, e adoram a besta; a ela é permitido falar blasfêmias arrogantes e agir por quarenta e dois meses, guerrear contra os santos e vencê-los, e ter autoridade sobre toda tribo, povo, língua e nação.Fontes: o próprio texto bíblico
- Uma segunda besta sobe da terra com dois chifres como os de um cordeiro, mas fala como um dragão e exerce toda a autoridade da primeira besta. Por meio de grandes sinais, até fogo descendo do céu, ela engana os habitantes da terra para que façam uma imagem da besta que foi ferida pela espada e ainda assim viveu, e exige que todas as pessoas, pequenas e grandes, ricas e pobres, livres e escravos, recebam uma marca na mão direita ou na testa, de modo que ninguém possa comprar ou vender sem ela. O capítulo pede sabedoria para calcular o número da besta, o número de um homem: 666.Fontes: o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org