Números 29
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Mmemme Opi Ike
1“ ‘Ụbọchị unu ga-egbu opi ike ga-adị nʼabalị mbụ nke ọnwa asaa nʼafọ ọbụla. Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke mmadụ niile. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ. 2Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụ aja nsure ọkụ a ga-eji otu oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ. Nke a bụ aja na-adị Onyenwe anyị ezi mma, ma na-esi ya isi ụtọ. 3Aja mkpụrụ ọka ka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi oke ehi ahụ, lita anọ na ọkara, nʼisi ebule, 4na lita abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla. 5Tinyere otu mkpi a ga-eji chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu. 6Aja ndị a niile bụ nke a ga-etinye nye nʼaja nsure ọkụ a na-achụ kwa ọnwa, na aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, ha na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e depụtara. Ha bụ aja ihe oriri a na-achụrụ Onyenwe anyị, aja nwere isisi dị ụtọ.
Aja ikpuchi mmehie
7“ ‘Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwekwa nzukọ dị nsọ. Unu ga-ebudata onwe unu nʼala. O nweghịkwa ụdị ọrụ ọbụla unu ga-arụ. 8Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, nke isisi ya na-atọ ya ụtọ. A ga-eji otu nwa oke ehi, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja a. 9Aja mkpụrụ ọka ga-eso ya. A ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ aja nwa oke ehi ahụ. Jiri lita ụtụ ọka anọ na ọkara chụọ aja ebule, 10jirikwa lita ụtụ ọka abụọ chụọ aja nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla. 11Tinyekwa otu mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie. A ga-atụkwasị nke a nʼaja mkpuchi mmehie a na-achụ, tinyere aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ niile.
Mmemme Ụlọ Ikwu
12“ ‘Nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke ụmụ Izrel niile. Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmalite mmemme abalị asaa nʼihu Onyenwe anyị. 13Cheenụ onyinye a na-enye site nʼọkụ nʼihu Onyenwe anyị nke isisi ya na-atọ ya ụtọ, jirinụ oke ehi iri na atọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị na-enweghị ntụpọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja nsure ọkụ. 14A ga-atụkwasịkwa aja mkpụrụ ọka nke e ji lita ụtụ ọka isii na ọkara gwakọta ya na mmanụ, nʼisi otu nʼime oke ehi iri na atọ ndị ahụ niile. Lita anọ na ọkara nʼisi otu ebule nʼime ebule abụọ ndị ahụ, 15ma lita abụọ nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla. 16Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
17“ ‘Nʼụbọchị abụọ nke mmemme a, a ga-eji oke ehi iri na abụọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja. 18Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha, bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 19Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
20“ ‘Nʼụbọchị nke atọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri na otu, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja. 21Ihe ga-eso aja oke ehi na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 22Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
23“ ‘Nʼụbọchị nke anọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja. 24Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 25Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
26“ ‘Nʼụbọchị nke ise nke mmemme a, ị ga-ewere ụmụ oke ehi itoolu, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja. 27Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 28Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
29“ ‘Nʼụbọchị nke isii nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi asatọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja. 30Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 31Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
32“ ‘Nʼụbọchị nke asaa nke mmemme ahụ, were ụmụ oke ehi asaa, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja. 33Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 34Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
35“ ‘Nʼụbọchị nke asatọ ndị Izrel niile ga-enwe oke nzukọ. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ. 36Chụọ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. Ị ga-eji otu nwa oke ehi, otu ebule na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, chụọ ya. 37Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 38Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
39“ ‘Tinyere onyinye a na-enye dịka nkwa e kwere si dị, na onyinye afọ ofufu unu, unu ga-akwadoro Onyenwe anyị onyinye ndị a nʼoge mmemme a kara aka unu: aja nsure ọkụ unu, onyinye mkpụrụ ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ na aja udo.’ ”
40Ya mere Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ịgwa ha.

Você sabia?
As ofertas do sétimo mês
- O sétimo mês no calendário bíblico era marcado por importantes convocações sagradas: o toque das trombetas no primeiro dia, um dia solene de humilhação no décimo dia e uma festa de sete dias a partir do décimo quinto dia, concluída com uma assembleia no oitavo dia.Fontes: o próprio texto bíblico
- Durante a festa de uma semana que começava no décimo quinto dia, os holocaustos diários seguiam um padrão decrescente único para os novilhos: começavam com treze novilhos no primeiro dia e diminuíam um a cada dia até que sete fossem oferecidos no sétimo dia.Fontes: o próprio texto bíblico
- Esses sacrifícios prescritos para as festas não substituíam o culto padrão; eles eram oferecidos além dos holocaustos diários regulares, das ofertas mensais e de quaisquer ofertas voluntárias, de votos ou de comunhão trazidas pelos adoradores.Fontes: o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org