Números 25
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Moab emee ka Izrel mehie
1Mgbe Izrel bi na Shitim, ndị ikom ha malitere isoro ndị inyom Moab na-akwa iko. 2Ndị inyom a kpọrọ ha ka ha bịa soro na mmemme ịchụ aja nye chi ha niile. Ndị Izrel riri nri ihe aja ahụ, kpọọkwa isiala nye chi ndị a niile. 3Ya mere, ndị Izrel sonyere na-akpọ isiala nye chi Baal nke Peoa. Nke a mere ka iwe Onyenwe anyị nwuru ọkụ megide ha.
4Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Duru ndị ndu ebo niile nke Izrel gbuo ha ma kwụnye ha nʼosisi nʼihu Onyenwe anyị nʼetiti ehihie, ka oke iwe Onyenwe anyị dị ọkụ ghara ịbịakwasị ndị Izrel.”
5Ya mere, Mosis sịrị ndị ọkaikpe Izrel, “Onye ọbụla nʼime unu aghaghị igbu ndị unu, bụ ndị jikọtara onwe ha na Baal nke Peoa.”
6Mgbe ahụ, otu nwoke onye Izrel kpọbatara nʼime ụlọ ikwu otu nwanyị onye Midia, nʼihu Mosis na nzukọ Izrel niile, mgbe ha niile nọ na-akwa akwa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 7Mgbe Finehaz na Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja hụrụ ihe a, ọ hapụrụ ọgbakọ Izrel. O were ùbe nʼaka ya, 8soro nwoke ahụ baa nʼime ụlọ, ebe ya na nwaagbọghọ ahụ dina. Ọ mara ha ùbe ahụ, nke si nʼahụ nwoke ahụ gafee mikpuo nʼafọ nwaagbọghọ ahụ. Nke a mere ka ihe otiti ahụ na-emegide ndị Izrel kwụsị. 9Ma tupu ihe otiti ahụ akwụsị, ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ruru iri puku abụọ na anọ (24,000) anwụọlarị.
10Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 11“Finehaz nwa Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja, emeela ka iwe m megide Izrel dajụọ. Nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi dịka mụ onwe m banyere idebe nsọpụrụ m nsọ nʼetiti ha, ka m ghara isite nʼịnụ ọkụ nke obi m bibie ha. 12Ya mere, gwa ya, na m na-eme ka ọgbụgba ndụ udo m dịrị ya. 13Ya na ụmụ ụmụ ya ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke ịrụ ọrụ nchụaja ga-adịrị, nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi banyere nsọpụrụ nke Chineke ya, si otu a chụọrọ ndị Izrel aja ikpuchi mmehie.”
14Aha nwoke Izrel ahụ e gburu ya na nwanyị onye Midia ahụ bụ Zimri, nwa Salu, onyendu otu ezinaụlọ nʼebo Simiọn. 15Aha nwanyị Midia ahụ e gburu bụ Kozbi, nwa nwanyị Zua, onye bụ otu nʼime ndịisi ezinaụlọ na Midia.
16Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 17“Mesoo ndị Midia mmeso dịka ndị iro. Gbukwaa ha. 18Nʼihi na ha mesoro unu mmeso dịka ndị iro mgbe ha ji ụzọ aghụghọ ghọgbuo unu nʼokwu Peoa, na nʼokwu Kozbi nwanne ha nwanyị, bụ nwa nwanyị otu nʼime ndịisi Midia, onye e gburu mgbe ihe otiti ahụ bịara nʼihi okwu Peoa.”
Você sabia?
Uma Crise de Idolatria em Sitim
- O nome Sitim significa "acácias". Localizado nas planícies de Moabe, a leste do rio Jordão, esse vale serviu como o último acampamento dos israelitas antes de entrarem na terra de Canaã.Fontes: Shittim · Moab · o próprio texto bíblico
- Baal era a principal divindade masculina na religião fenícia e cananeia. Associado ao cume do monte Peor, o culto local a Baal-Peor incluía sacrifícios e refeições sagradas que seduziram os israelitas à apostasia.Fontes: Baal · Peor · o próprio texto bíblico
- Fineias era filho do sumo sacerdote Eleazar e neto de Arão. Após sua intervenção interromper uma praga devastadora que matou 24.000 israelitas, Deus lhe concedeu uma aliança permanente de paz e de sacerdócio para os seus descendentes.Fontes: Phinehas (Levite) · Eleazar · o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Moab · Hoje: Moab 1 · 31.181, 35.701 · versículos 1, 2
- Peor · Hoje: within 1 km of Khirbet Ayun Musa · 31.777, 35.738 · versículos 3, 5, 18
- Midian · 28.495, 35.012 · versículos 15, 18
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org