Nations Bible

Números 2

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Usoro ebo dị iche iche

1Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị ha, 2“Ụmụ Izrel ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute, nʼebe dịpụturu adịpụ site nʼụlọ nzute ahụ. Onye ọbụla ga-ama ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ọkọlọtọ ebo ya, ha na ihe ịrịbama nke ụlọ ha.”

3Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ,

usuu ndị agha ebo Juda, ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha ga-abụ Nashọn nwa Aminadab. 4Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ya dị puku iri asaa na anọ, na narị isii (74,600)

5Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Isaka ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Netanel nwa Zua. 6Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ (54,400).

7Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Zebụlọn ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Eliab nwa Helọn. 8Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ (57,400). 9Ọnụọgụgụ ndị niile a gụkọtara ha na Juda nʼọwụwa anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku asatọ na puku isii na narị anọ (186,400). Ha ga-ebu ụzọ bulie ije.

10Nʼakụkụ ndịda ka

usuu ndị agha ebo Ruben ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Elizọ nwa Shedeua. 11Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500).

12Nʼakụkụ ha ka ebo Simiọn ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Shelumiel nwa Zurishadai. 13Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ (59,300).

14Ebo Gad ga-esokwa ha. Onyendu ha bụ Eliasaf nwa Deuel. 15Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise (45,650). 16Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ruben bikọrọ na ndịda ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na otu, na narị anọ na iri ise (151,450) dịka usuu ndị agha ha si dị. Ebo atọ a bụ ndị na-eso ebo atọ nke mbụ ahụ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.

17Ka ụlọ nzute na-azọli ije, ụlọ ikwu ndị Livayị ga-anọ nʼetiti ụlọ ikwu ndị ọzọ. Ha ga-ebili ije nʼusoro dịka ha si maa ụlọ ikwu ha. Ndị ọbụla nʼọnọdụ ha, nʼokpuru ọkọlọtọ nke na-akọwa ndị ha bụ.

18Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ

ka ebo Ifrem ga-ama ụlọ ikwu ha dịka ọkọlọtọ ha si dị. Onyendu ha bụ Elishama nwa Amihud. 19Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ na narị ise (40,500).

20Ebo Manase ga-amakwa ụlọ ikwu nʼakụkụ ha. Onyendu ha bụ Gamaliel nwa Pedazo. 21Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ (32,200).

22Nʼakụkụ ha ka ebo Benjamin ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Abidan nwa Gidiọn. 23Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ (35,400). 24Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ifrem bikọrọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, puku asatọ na narị mmadụ (108,100). Ha niile na-esokwa nʼazụ ndị Livayị na ụlọ nzute ahụ. Ndị a bụ ndị na-eso nʼọnọdụ nke atọ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.

25Ebo Dan na usuu ndị agha ha

ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ elu elu nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai 26Ọnụọgụgụ usuu ha dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa (62,700).

27Nʼakụkụ ha ka ebo Asha ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Pagịel nwa Okran. 28Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500).

29Otu aka ahụ ka ebo Naftalị ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Ahira nwa Enan. 30Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400). 31Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii (157,600). Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha.

32Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise (603,550) nʼọnụọgụgụ. 33Ma otu ọ dị, a gụnyeghị ebo Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel ndị ọzọ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

34Ya mere, ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Otu a ka ha si maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Otu a kwa ka ha si ebuli ije. Onye ọbụla nʼime ha dịka ebo ha na ezinaụlọ ha si dị.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A Organização do Acampamento

  • Os israelitas foram instruídos a acampar ao redor da Tenda do Encontro voltados para os quatro pontos cardeais, deixando o santuário e os levitas posicionados no centro do acampamento.Fontes: o próprio texto bíblico
  • As doze tribos foram organizadas em quatro grupos de três, cada um sob o estandarte principal de uma tribo: Judá acampava a leste e partia primeiro, seguido por Rúben ao sul, Efraim a oeste e Dã na retaguarda ao norte.Fontes: o próprio texto bíblico · Dan · Issachar
  • Naassom, filho de Aminadabe, foi designado líder de Judá, que formava a maior divisão com 186.400 homens; sua irmã Eliseba era casada com Arão.Fontes: o próprio texto bíblico · Nahshon · Aaron · Amminadab

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.