Números 19
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Mmiri ido ihe ọcha
1Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha, 2“Ndị a bụ ụkpụrụ dị nʼiwu ahụ Onyenwe anyị nyere. Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara gị nwa nne ehi na-acha uhie uhie nke na-enweghị ntụpọ, na nke ụdọ yoku na-agabeghị nʼolu ya. 3Nye ya Elieza onye nchụaja, ka ọ kpụrụ ya pụọ nʼazụ ogige, ebe otu onye ga-egbu ya mgbe ọ nọ na-ele ya anya. 4Elieza bụ onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara ya na mkpịsịaka ya, fesa ya na ncherita ihu ụlọ nzute ahụ ugboro asaa. 5Mgbe ahụ, onye ọzọ ga-akpọ nwa nne ehi ahụ ọkụ mgbe Elieza nọkwa na-ele ya anya. Ọ ga-akpọ akpụkpọ ya, anụ ya, ọbara na mgbịrị afọ ya ọkụ. 6Onye nchụaja ga-ewere osisi sida, na osisi hisọp, na ogho uhie, tụba ha nʼetiti ebe ahụ a kpọrọ nwa nne ehi ahụ ọkụ. 7Emesịa, onye nchụaja ahụ ga-asacha uwe niile o yi; sakwaa ahụ ya. Ọ ga-alọghachikwa azụ nʼime ogige ahụ ebe ọ ga-anọ dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. 8Onye ahụ kpọrọ nwa ehi ahụ ọkụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya. Ọ ga-anọkwa ọnọdụ onye na-adịghị ọcha ruo anyasị.
9“Mgbe ahụ, onye nke dị ọcha, ga-ekpokọta ntụ ozu nwa nne ehi ahụ, wụnye ya nʼebe dị ọcha nʼazụ ogige ahụ. Ebe ahụ ka nzukọ Izrel ga-edebe ya maka ikporo wụnye na mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha. Ọ bụ maka nsacha pụọ na mmehie. 10Ma onye ahụ ga-ekpokọta ntụ nsure ọkụ nwa nne ehi ahụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya, nọkwaa dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. Iwu a ga-adịgidere ndị Izrel na ndị ọbịa binyere ha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
11“Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa. 12Ha aghaghị iji mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha saa ahụ ha nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Mgbe ahụ, ha ga-adị ọcha. Ma ọ bụrụ na ha asaghị ahụ ha nʼụbọchị nke atọ nakwa nʼụbọchị nke asaa, ha ga-anọgide bụrụ ndị na-adịghị ọcha ọ bụladị mgbe ụbọchị asaa ahụ gafesịrị. 13Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ma ọ saghị ahụ ya dịka usoro a si dị, o merụọla ebe nsọ Onyenwe anyị. A ga-ewezuga onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel. Ebe ọ bụ na a wụsaghị ya mmiri nsacha ahụ; ọ ga-anọgide bụrụ onye na-adịghị ọcha.
14“Mgbe mmadụ nwụrụ nʼụlọ ikwu, ndị a ga-abụ iwu unu ga-eso. Ndị nọ nʼime ụlọ ikwu ahụ mgbe ọ nwụrụ na onye ọbụla banyere nʼụlọ ikwu ahụ, ga-abụ ndị na-adịghị ọcha ụbọchị asaa. 15Ihe ọbụla nke ghere oghe, nke na-enweghị ihe mkpuchi eriri e ji kechie elu ya, ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.
16“Onye gara nʼọhịa metụ onye e gburu nʼagha aka, maọbụ onye nwụrụ nʼụzọ ọzọ dị iche, ma ọ bụkwanụ metụ ọkpụkpụ, maọbụ ili onye nwụrụ anwụ aka, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
17“Ma banyere onye ahụ na-adịghị ọcha, kporo ntụ site nʼime aja mmehie ahụ a kpọrọ ọkụ, tinye ya nʼime ite, wụkwasị ya mmiri e si nʼiyi na-eru eru kute. 18Mgbe ahụ, nwoke nke nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha ga-ewere ụfọdụ hisọp, denye ya na mmiri ahụ fesaa ya nʼime ụlọ ikwu ahụ, na ngwongwo niile e ji dozie ụlọ ahụ, na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya nʼahụ onye ọbụla metụrụ ọkpụkpụ, maọbụ onye e gburu egbu, maọbụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ili aka. 19Nwoke ahụ dị ọcha ga-efesakwa ndị ahụ rụrụ arụ nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Nʼụbọchị nke asaa ka ọ ga-eme ka ha dị ọcha. Ndị ahụ a na-edo ọcha ga-asa uwe ha mmiri, saa ahụ ha, nʼuhuruchi ụbọchị ahụ ka ha ga-adị ọcha. 20Ma ọ bụrụ na ndị ahụ merụrụ onwe ha e doghị onwe ha ọcha, aghaghị iwepụ ha site nʼetiti ọgbakọ Izrel. Nʼihi na ha merụrụ ebe nsọ Onyenwe anyị. E fesakwaghị ha mmiri nke ịdị ọcha nʼahụ, nke mere na ha adịghị ọcha. 21Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide mgbe ebighị ebi.
“Nwoke ahụ na-efesa mmiri ahụ e ji edo mmadụ ọcha, aghaghị ịsacha uwe ya niile. Onye ọbụla metụrụ mmiri nke ịdị ọcha ahụ aka, ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. 22Ihe ọbụla kwa onye na-adịghị ọcha metụrụ aka, ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha, onye ọbụla metụkwara ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.”

Você sabia?
A novilha vermelha e a purificação da impureza
- Diferente dos sacrifícios habituais oferecidos no altar do tabernáculo, a novilha vermelha sem defeito e que nunca havia levado jugo era levada para fora do acampamento. Ali era sacrificada na presença do sacerdote Eleazar e queimada por inteiro com madeira de cedro, hissopo e lã carmesim.Fontes: o próprio texto bíblico · Eleazar
- As cinzas da novilha eram guardadas fora do acampamento para o preparo da água de purificação. Paradoxalmente, embora essa mistura purificasse os que haviam se tornado impuros pelo contato com a morte, todos os que manuseavam a novilha, recolhiam as cinzas ou aspergissem a água ficavam cerimonialmente impuros até o entardecer.Fontes: o próprio texto bíblico
- O contato com um cadáver, um osso humano, uma sepultura ou o simples fato de estar em uma tenda onde alguém morresse causava sete dias de impureza cerimonial. Para a purificação, a pessoa precisava ser aspergida com a água de purificação no terceiro e no sétimo dia, além de lavar suas roupas e banhar-se.Fontes: o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org