Nations Bible

Números 14

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Nnupu isi nke ụmụ Izrel

1Nʼabalị ahụ, ọgbakọ Izrel niile weliri olu ha bido iti mkpu akwa. Ha kwagidere akwa a abalị niile. 2Ndị Izrel niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. Ọgbakọ ahụ niile sị ha, “Ọ gaara aka mma ma a sị na anyị nwụrụ nʼala Ijipt maọbụ nʼọzara a. 3Gịnị mere Onyenwe anyị ji akpọbata anyị nʼala a ime ka anyị daa nʼihu mma agha. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ga-aghọ ndị a dọtara nʼagha. Ọ garaghị akara anyị mma ịlaghachi azụ nʼIjipt?” 4Ya mere ha kwekọrịtara nʼetiti onwe ha sị, “Ka anyị họpụtaranụ onwe anyị onyendu ga-edughachi anyị azụ nʼIjipt.”

5Mgbe ahụ, Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu ọgbakọ ndị Izrel niile zukọtara nʼebe ahụ. 6Mmadụ abụọ nʼime ndị nledo ahụ, Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune, dọwara uwe ha. 7Ha gwara nzukọ Izrel sị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala mara mma. 8Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ ga-edu anyị bata nʼala ahụ, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. 9Unu enupukwala isi megide Onyenwe anyị. Unu atụkwala egwu ndị bi nʼime ala ahụ, nʼihi na anyị ga-emeri ha. Onyenwe anyị nọnyeere anyị. O wepụkwala aka nchebe ya nʼahụ ha. Unu atụla egwu ha.”

10Ma naanị nzaghachi ọgbakọ ndị Izrel nyere nʼihi okwu nkasiobi ndị a bụ iche uche otu ha ga-esi jiri nkume tugbuo Joshua na Kaleb. Nʼoge a, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nʼụlọ nzute ahụ nye ndị Izrel niile. 11Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ruo ole mgbe ka ndị a ga-anọgide na-eleda m anya? Ruo ole mgbe ka ha ga-anọ ju ikwenye na m, nʼagbanyeghị ọtụtụ ihe ịrịbama nke m mere nʼetiti ha. 12Aga m eji nrịa nrịa nke na-efe efe tigbuo ha. Napụ ha ihe ha nwere. Ma aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu, nke ga-adị ukwuu, dịkwa ike karịa ha.”

13Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị sị ya, “Gịnị ka ndị Ijipt ga-eche banyere nke a, mgbe ha ga-anụ ya? Ha maara nke ọma otu ị sịrị jiri ike gị napụta ndị a site nʼetiti ha. 14Ha agwakwala ndị bi nʼobodo ndị a ihe banyere ya. Ndị obodo ndị a anụla ihe banyere gị Onyenwe anyị, matakwa na ị nọnyeere Izrel, na gị bụ Onyenwe anyị na ndị Izrel na-ekwurịta okwu ihu na ihu. Ha anụkwala na ogidi igwe ojii gị Onyenwe anyị na-eguzo nʼelu, nʼisi anyị. Ha matakwara na ị na-edu anyị nʼime ogidi igwe ojii nʼehihie, na nʼime ogidi na-enwu ọkụ nʼabalị. 15Ma ugbu a, ọ bụrụ na i gbusie ndị gị a dum, mba niile nụrụla akụkọ ndị a banyere gị ga-asị, 16‘ Onyenwe anyị enweghị ike ịkpọbata ndị a nʼala ahụ o kwere nkwa inye ha. Ọ bụ ya mere o ji gbuo ha nʼọzara.’

17“Ugbu a ka Onyenwe anyị gosi ike ya dị ukwuu, dịka i si kwuo. 18Onyenwe anyị bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, onye jupụtara nʼịhụnanya, onye na-agbaghara mmehie na nnupu isi. Ma ọ dịghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ. 19Dịka ịdị ukwuu nke ịhụnanya gị si dị; gbaghara mmehie nke ndị a mere, dịka i si agbaghara ha kemgbe ha hapụrụ Ijipt ruo ugbu a.”

20Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya, “Agbagharala m ha dịka ị rịọrọ. 21Ma dịka m na-adị ndụ na dịka ọ bụ eziokwu na ụwa niile ga-ejupụta nʼebube Onyenwe anyị. 22Ọ dịghị otu onye nʼetiti ndị ikom niile hụrụla ebube m, na ọrụ ịrịbama niile m rụrụ nʼime Ijipt, na nʼime ọzara a, ma bụrụ onye nupuru isi nye m na onye nwaara m ugboro iri ndị a, 23o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-ahụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye nna nna ha. O nweghị onye ọbụla nʼime ndị a lelịrị m ga-ahụ ala ahụ anya. 24Ma ohu m nwoke Kaleb bụ nwoke nwere mmụọ dị iche. O rubeere m isi nʼihe niile. Aga m akpọbata ya nʼala ahụ ọ banyere dịka onye nledo. Ụmụ ụmụ ya niile ga-eketa ya. 25Ma ugbu a, ebe ndị Izrel na-atụ ndị Amalek na ndị Kenan bi nʼime ndagwurugwu ahụ egwu, echi, unu ga-atụgharịa laghachi azụ nʼọzara ahụ; chee ụzọ gaje Osimiri Uhie ahụ ihu.”

26Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị, 27“Ruo ole mgbe ka ọgbakọ ọjọọ a ga-anọgide na-atamu ntamu megide m? Nʼihi na anụla m ntamu niile nke ndị Izrel a. 28Gwa ha si, ‘Dị ka m na-adị ndụ, ka Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso unu mmeso dịka unu kwunyere ya na ntị m. 29Unu niile ga-anwụpịa nʼime ọzara a! Onye ọbụla nʼime unu niile gbarala iri afọ abụọ maọbụ karịa, nke tamuru ntamu megide m. 30O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abanye nʼala ahụ, m sitere nʼaka m welie elu ṅụọ iyi ime ka ọ bụrụ ebe obibi unu, karịa Kaleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun. 31Ma ebe unu tụrụ egwu sị na ụmụ unu na-aga ibu ndị ohu nye ndị bi nʼala ahụ. Lee na aga m edubata ha nʼime ala ahụ. Ha ga-eketakwa ala ahụ unu jụrụ, nke unu ledara anya. 32Ma unu onwe unu, ozu unu ga-ada aghara aghara nʼọzara a. 33Ụmụ unu ga-abụkwa ndị ọzụzụ atụrụ nʼime ọzara a iri afọ anọ, na-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi, ruo mgbe ozu onye ikpeazụ nʼime unu ga-atọgbọrọ nʼime ọzara. 34Iri afọ anọ ka unu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie unu, matakwa ihe ọ pụtara bụ mụ iguzo megide unu, ya bụ otu afọ ga-anọchi otu ụbọchị nʼime iri ụbọchị anọ ahụ unu ji ledoo ala ahụ anya. 35Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya. Nke a ka m na-aghaghị ime ka ọ dakwasị ajọ nzukọ ndị a, bụ ndị gbakọrọ megide m. Ha ga-ezute ọgwụgwụ ha nʼọzara, nʼebe a ka ha ga-anwụ.’ ”

36Ya mere ndị ahụ Mosis zipụrụ iledo ala ahụ, ndị ahụ lọtara mee ka ọgbakọ ụmụ Izrel tamuo ntamu nʼihi akụkọ ọjọọ ha gbasara. 37Ndị ikom ndị ahụ e si nʼọnụ ha gbasaa akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ka e ji nrịa nrịa na-efe efe tigbuo nʼihu Onyenwe anyị. 38Nʼime ndị ikom gara ledoo ala ahụ anya, ọ bụ naanị Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune fọdụrụ ndụ.

39Mgbe Mosis gwara ụmụ Izrel okwu niile si nʼọnụ Onyenwe anyị, ha ruru ụjụ dị ilu. 40Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri nʼoge bulie ije ịga nʼala ugwu ugwu ahụ. Ha sịrị, “Anyị emehiela. Ugbu a anyị ejikerela ije nʼala ahụ Onyenwe anyị kwere anyị nkwa.”

41Ma Mosis zara sị ha, “Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị nyere? Nke a agaghị aga nke ọma. 42Unu arịgokwala, nʼihi na Onyenwe anyị anọghị nʼetiti unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu. 43Nʼihi na ndị Amalek na ndị Kenan nọ na-eche unu nʼebe ahụ! Ebe ọ bụ na unu esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ wezuga onwe unu, ọ gaghị anọnyere unu, unu ga-adakwa nʼihu mma agha.”

44Nʼagbanyeghịkwa nke a, na ha enweghị nkwado. Ha rigooro ruo ebe kachasị elu nʼobodo ahụ dị nʼugwu, ọ bụ ezie na Mosis maọbụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị esighị nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ pụọ. 45Mgbe ahụ, ndị Amalek na ndị Kenan bụ ndị bi nʼobodo ugwu ahụ, rịdatara lụso ha ọgụ. Tidaa ha nʼala ruo Homa.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Rebelião e quarenta anos no deserto

  • A punição de quarenta anos de peregrinação pelo deserto correspondeu diretamente aos quarenta dias em que os espias exploraram Canaã, determinando um ano para cada dia de exploração. De todos os adultos de vinte anos para cima daquela geração, apenas Calebe e Josué tiveram permissão para entrar na Terra Prometida por causa de sua fidelidade.Fontes: o próprio texto bíblico · Caleb · Joshua
  • Quando os israelitas tentaram um ataque não autorizado contra a região montanhosa após ouvirem sua sentença, avançaram sem Moisés e sem a arca da aliança. Os amalequitas e cananeus os derrotaram, perseguindo-os até Horma, nome associado à consagração para a destruição.Fontes: o próprio texto bíblico · Hormah

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 2, 3, 4, 13, 19, 22
  • Way of the Red Sea · Hoje: road between the Dead Sea and the Gulf of Aqaba · 29.727, 34.998 · versículo 25

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.