Marcos 9
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
1Ma ọ gwara ha sị, “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a, agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke mgbe ọ ga-abịa nʼike.”
Nnwogha Jisọs
2Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro nʼelu ugwu dị elu. Nʼebe ahụ ka ha nọdụrụ naanị ha. Nʼebe ahụ, a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha. 3Uwe ya na-enwu ọcha karịa ụdị ọcha ọbụla anya hụrụla. Ọ dịkwa ọcha karịa nke onye ọbụla nʼụwa nwere ike ime ka ihe dị ọcha. 4Ha hụrụ Ịlaịja na Mosis ka ha pụtara soro Jisọs na-ekwu okwu.
5Pita gwara Jisọs sị, “Onye ozizi, ọ dị mma ka anyị nọdụ nʼebe a. Ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ. Otu ga-abụ nke gị, otu a bụrụ nke Mosis, nke ọzọkwa a bụrụ nke Ịlaịja.” 6(Ọ makwaghị ihe ọ ga-ekwu nʼihi na oke egwu tụrụ ha.)
7Mgbe ahụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Geenụ ya ntị.”
8Na mberede, mgbe ha lere anya gburugburu, ọ dịkwaghị onye ọzọ ha hụrụ, karịa naanị Jisọs.
Ajụjụ banyere Ịlaịja
9Mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe ha hụrụ, tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie. 10Ha zobere ihe a nʼetiti onwe ha, na-ekwurịtara okwu na-atule ihe isi nʼọnwụ bilie pụtara.
11Ma ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu jiri sị na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”
12Ọ gwara ha sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa, na-emekwa ka ihe dị ka ọ dị na mbụ. Ma gịnị mere e jiri dee na Nwa nke Mmadụ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ, bụrụkwa onye a jụrụ ajụ? 13Ka m gwa unu, Ịlaịja abịalarị. Ma ha mesokwara ya mmeso otu ha chọrọ dị ka e dere banyere ya.”
Jisọs agwọọ nwa mmụọ ọjọọ bi nʼime ya
14Mgbe ha bịarutere nʼebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ha hụrụ oke igwe mmadụ ka ha gbara ha gburugburu, hụkwa ụfọdụ ndị ozizi iwu ka ha na ha na-arụrịta ụka. 15Ngwangwa, mmadụ ahụ niile hụrụ ya, ụdịdị ya juru ha anya. Ha gbaara ọsọ gaa kelee ya.
16Ọ jụrụ ha sị, “Unu na ha ọ na-arụrịta ụka banyere gịnị?”
17Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onye ozizi akpọtaara m gị nwa m nwoke, nke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya, nke mekwara ka ọ daa ogbi. 18Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ malitere isogbu ya, ọ na-atụda ya nʼala. Mgbe ahụ, ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ ya, na-ata ikikere eze, anụ ahụ ya na-esikwa ike. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ a, ma ha enweghị ike.”
19Ọ zaghachiri ha sị, “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anagide unu? Kpọtaranụ m ya!”
20Ya mere, ha kpọtaara ya nwata ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ ya, ngwangwa, o nugharịrị nwata ahụ nke ukwuu, ọ daa nʼala na-atụrụ onwe ya nʼala, na-agbọkwa ụfụfụ nʼọnụ ya.
21Jisọs jụrụ nna nwata ahụ sị, “Olee mgbe ihe a bidoro?”
Ọ zara sị, “Site na mgbe ọ bụ nwata nta. 22Ọ na-eme ya ka ọ daba nʼọkụ, maọbụ na mmiri, ka ọ laa ya nʼiyi. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka.”
23Jisọs sịrị ya, “ ‘Ọ bụrụ na i nwere ike’? Ihe niile pụrụ ime nʼebe onye kwere ekwe nọ.”
24Ngwangwa, nna nwata ahụ tiri mkpu sị, “Ekweere m, biko nyere ekweghị ekwe m aka!”
25Mgbe Jisọs hụrụ na igwe mmadụ na-agba ọsọ na-abịa nʼebe ahụ, ọ baara mmụọ ahụ na-adịghị ọcha mba sị, “Gị mmụọ ọjọọ ntị ike na ịda ogbi, ana m enye gị iwu, site nʼime nwata a pụta! Abanyekwala nʼime ya ọzọ!”
26O tiri mkpu nʼoke olu, nugharịa nwata ahụ nke ukwuu ma site nʼime ya pụta. Nwata ahụ tọgbọrọ nʼala dị ka onye nwụrụ anwụ nke mere na ndị niile nọ nʼebe ahụ sịrị, “Ọ nwụọla!” 27Ma Jisọs jidere ya nʼaka selite ya elu, mee ka o guzo nʼụkwụ ya. O guzokwara.
28Ma mgbe ọ banyere nʼime ụlọ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya na nzuzo sị, “Gịnị mere o jiri siere anyị ike ịchụpụ ya?”
29Ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị site nʼike ekpere ka a pụrụ ịchụpụ ụdị a.”
Jisọs ekwuokwa okwu ọzọ banyere ọnwụ ya
30Ha siri nʼebe ahụ pụọ gafee Galili. Ọ chọghị ka onye ọbụla mata maka ya, 31nʼihi na ọ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ sịrị ha, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ, ha ga-egbukwa ya ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe mkpụrụ ụbọchị atọ gasịrị.” 32Ma ha aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha. Egwu tụkwara ha ị jụ banyere ya.
Onye kachasị ukwuu
33Emesịa, ha bịaruru Kapanọm. Mgbe ọ banyere nʼụlọ, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka banyere ya nʼokporoụzọ?” 34Ma ha gbara nkịtị, nʼihi na ha rụrịtara ụka nʼokporoụzọ banyere onye dị ukwuu karịa ibe ya.
35Ọ nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ, sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ghaghị ịbụ onye ikpeazụ, bụrụkwa onye na-ejere mmadụ niile ozi.”
36Mgbe ahụ o kuuru otu nwantakịrị mee ka o guzoro nʼetiti ha. O kuuru nwata ahụ nʼaka ya sị ha, 37“Onye ọbụla nabatara otu nʼime ụmụntakịrị ndị a nʼaha m, na-anabata m. Ma onye ọbụla nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ na-anabata onye zitere m.”
Onye na-emegideghị anyị dịnyeere anyị
38Jọn sịrị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼaha gị, ma anyị gbalịrị igbochi ya nʼihi na ọ bụghị otu onye nʼime anyị.”
39Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu egbochila ya, nʼihi na onye ọbụla ji aha m na-arụ ọrụ ebube agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m. 40Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị. 41Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nʼaha m, nʼihi na unu bụ ndị nke Kraịst, ga-anatakwa ụgwọ ọrụ ya.
Iduba na mmehie
42“Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri. 43Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ; 44ebe
“ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ,
ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
45Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ; 46ebe
“ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ,
ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
47Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ, 48ebe
“ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ,
ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
49A ga-eji ọkụ nụchaa onye ọbụla dị ka nnu.
50“Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, olee ka ị ga-esi mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ya mere, nweenụ nnu nʼime onwe unu. Unu na ibe unu biri nʼudo.”
Você sabia?
A transfiguração e o ensino no caminho
- Seis dias depois, Jesus levou Pedro, Tiago e João sozinhos a um alto monte, e foi transfigurado diante deles. Pedro, originalmente chamado Simão, era pescador de Betsaida, no mar da Galileia. Tiago, irmão mais velho de João e filho de Zebedeu, também era pescador e esteve presente com Pedro e João na transfiguração.Fontes: o próprio texto bíblico · Simon Peter · James (Son of Zebedee)
- No alto monte, Elias, o tesbita e o Elias do Novo Testamento, apareceu com Moisés, conversando com Jesus. Enquanto desciam, os discípulos perguntaram por que os escribas dizem que Elias deve vir primeiro. Jesus respondeu que Elias de fato vem primeiro e que ele já veio.Fontes: o próprio texto bíblico · Elijah
- Jesus e os discípulos passaram pela Galileia, mas ele não queria que ninguém soubesse, porque os estava ensinando, e chegaram a Cafarnaum. Cafarnaum, a cidade de Naum, era uma cidade da Galileia que se tornou a própria cidade de Jesus depois de sua expulsão de Nazaré. Os judeus chamavam Galil a uma planície elevada entre as montanhas de Naftali, e a região passou a ser chamada Galileia dos gentios.Fontes: o próprio texto bíblico · Capernaum · Galilee
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Galilee · 32.760, 35.527 · versículo 30
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org