Marcos 2
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Jisọs agwọọ onye ahụ ya kpọnwụrụ
1Mgbe ụbọchị ole na ole gafesịrị, ọ bataghachiri na Kapanọm. Ndị mmadụ nụrụ na ọ lọghachila. 2Igwe mmadụ zukọtara nʼime ụlọ ahụ nke mere na ohere afọdụghị ọ bụladị nʼọnụ ụzọ. O kwusakwaara ha oziọma. 3Ndị ikom ụfọdụ buteere ya otu nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ bụ mmadụ anọ bu ya. 4Ebe ha na-enweghị ike ibutere ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere nʼelu ụlọ ebe ahụ ọ nọ. Mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼute o jiri dina. 5Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Nwa m nwoke, agbagharala gị mmehie gị.”
6Ma ụfọdụ ndị ozizi iwu nọdụrụ ala nʼebe ahụ na-eche nʼime obi ha sị, 7“Gịnị mere onye a ji na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmehie ma ọ bụghị naanị Chineke?”
8Ngwangwa Jisọs matara nʼime mmụọ ya na ha na-atule okwu a nʼime obi ha. Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe dị otu a nʼobi unu? 9Olee nke ka mfe: ọ bụ ịgwa onye a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ i sị, ‘Bilie chịrị ute gị jegharịa?’ 10Ma igosi unu na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, 11“Ana m asị gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị.” 12O biliri, chịrị ute ya pụọ nʼihu mmadụ niile. Nke a juru ndị niile nọ nʼebe ahụ anya. Ha toro Chineke na-asị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a mbụ!”
Ọkpụkpọ Livayị
13Emesịa, Jisọs pụrụ gaa nʼakụkụ osimiri ahụ. Igwe mmadụ bịakwutere ya. Ọ malitere izi ha ihe. 14Mgbe ọ na-aga nʼihu, ọ hụrụ Livayị nwa Alfiọs ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m,” o biliri sooro ya.
15Mgbe ọ na-eri nri uhuruchi nʼụlọ Livayị, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ ebe ahụ, nʼihi na ndị na-esogharị ya dị ọtụtụ. 16Mgbe ndị ozizi iwu nke ndị Farisii hụrụ ya ka o so ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere o ji eso ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-erikọ nri?”
17Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị ha, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike. Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume kama ndị mmehie.”
Ajụjụ banyere ibu ọnụ
18Nʼoge a, ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị Farisii na-ebu ọnụ. Ndị mmadụ bịara jụọ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị nke gị adịghị ebu ọnụ?”
19Jisọs sịrị ha, “O kwesiri na ndị a kpọrọ oriri ọlụlụ di na nwunye ga-ebu ọnụ mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ nʼetiti ha? Ha apụghị ibu ọnụ ogologo oge ya na ha nọ. 20Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Nʼụbọchị ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.
21“Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa. Ọ bụrụ na o mee nke a, akwa ọhụrụ ahụ ga-adọkapụ site na nke ochie mee ka ndọka ya dị njọ karịa. 22Ọ dịghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ na karama akpụkpọ ochie. O mee nke a, mmanya ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ ochie ahụ, mee ka karama na mmanya laa nʼiyi. Ee, a na-agbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.”
Onyenwe ụbọchị izuike
23Otu ụbọchị izuike, ya na ndị na-eso ụzọ ya na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Dị ka ha na-agafe, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọ ụfọdụ ogbe ọka nʼime ọka ndị ahụ. 24Ndị Farisii siri ya, “Lee, gịnị mere ha ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike.”
25Ma ọ sịrị ha, “Unu agụtaghị ihe Devid na ndị so ya mere mgbe agụụ gụrụ ha? 26Nʼoge Abịata bụ onyeisi nchụaja, ọ banyere nʼụlọ Chineke taa achịcha e chere nʼihu ya, nke ziri ezi na ọ bụ naanị ndị nchụaja kwesiri ịta ya. O nyetụkwara ndị ya na ha so.”
27Mgbe ahụ, ọ gwakwara ha sị, “E mere ụbọchị izuike maka mmadụ, emeghị mmadụ maka ụbọchị izuike.” 28Ya mere, Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ọ bụladị ụbọchị izuike.

Você sabia?
Perdão, um cobrador de impostos e o sábado
- Cafarnaum, a “cidade de Naum”, era uma cidade da Galileia que não é mencionada no Antigo Testamento. O dicionário bíblico de Easton (1897) diz que, depois de Jesus ser expulso de Nazaré, ela se tornou a “sua própria cidade”, o que combina com o relato de Marcos de que o povo soube que ele estava em casa e encheu a casa até não haver lugar nem fora da porta. Quatro homens então destelharam o telhado, abriram uma passagem e desceram um paralítico em sua maca.Fontes: Capernaum · o próprio texto bíblico
- O homem na coletoria era Levi, filho de Alfeu, cobrador de impostos em Cafarnaum. O dicionário bíblico de Easton (1897) diz que ele era conhecido como Levi e adotou o nome Mateus — um nome judeu comum depois do Exílio, que significa “dom de Deus” — possivelmente em grata lembrança do seu chamado. No mesmo dia, segundo o dicionário, ele ofereceu um grande banquete de despedida para Jesus e seus discípulos, e provavelmente para muitos antigos companheiros, o encontro que Marcos descreve com cobradores de impostos e pecadores.Fontes: Matthew · Alphaeus · o próprio texto bíblico
- Questionado porque seus discípulos colhiam espigas no sábado, Jesus falou de Davi entrando na casa de Deus e comendo os pães consagrados, lícitos apenas para os sacerdotes, “durante o sumo sacerdócio de Abiatar”, e compartilhando-os com seus companheiros famintos. O dicionário bíblico de Easton (1897) identifica Abiatar como filho do sumo sacerdote Aimeleque, que escapou quando seu pai e os sacerdotes de Nobe foram mortos, levou o éfode e se juntou a Davi na caverna de Adulão.Fontes: Abiathar · o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org