Marcos 12
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ilu banyere ndị ọrụ ubi ọjọọ
1Mgbe ahụ, ọ bidoro ịgwa ndị ahụ okwu nʼilu sị, “Otu nwoke kụrụ mkpụrụ vaịnị nʼubi ya, jiri mgbidi gbaa ubi ahụ gburugburu. O gwuru ebe ịnara mmanya si na mkpụrụ vaịnị, wuokwa ụlọ elu. Mgbe o mesịrị, o nyefere ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọrụ ubi ilekọta ya ma gaa obodo ọzọ. 2Mgbe oge ịghọ mkpụrụ ruru, o zipụrụ otu onye ohu ya ka o jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata ha ụfọdụ nʼime mkpụrụ vaịnị ahụ. 3Ma ha jidere ya tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu. 4Emesịkwa, o zigakwara onye ohu ọzọ. Ma ha tiwara ya isi, mee ya ihe ihere. 5O zigakwara onye ọzọ, ma ha gburu ya. O zigakwara ọtụtụ ndị ozi, ma ha gburu ụfọdụ, tie ndị ọzọ ihe.
6“O nwere naanị otu onye ọzọ fọdụrụ nke ọ ga-eziga, nke bụ ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya. Nʼikpeazụ o zigara ya, buru nʼuche na ha ga-asọpụrụ ọkpara ya.
7“Ma ndị na-elekọta ubi ahụ sịrịtara onwe ha, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’ 8Ha jidere ya gbuo ya, tufee ozu ya nʼazụ mgbidi ubi vaịnị ahụ.
9“Gịnị ka unu chere onyenwe ubi vaịnị ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa laa ndị ajọ mmadụ ahụ nʼiyi. Ọ ga-enyefekwa ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọzọ. 10Ọ bụ na unu agụbeghị akwụkwọ nsọ a na-asị,
“ ‘Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ
abụrụla nkume isi ntọala ụlọ.
11Ọ bụ Onyenwe anyị rụrụ nke a,
ọ dịkwa ịtụnanya nʼanya anyị’ ?”
12Mgbe ahụ ndịisi nchụaja, ndị nkuzi iwu na ndị okenye chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼihi na ha matara na ilu ahụ ọ tụrụ megidere ha. Ma ha tụrụ egwu igwe ndị mmadụ ahụ, ya mere ha hapụrụ ya pụọ.
Ịtụ ụtụ nye Siza
13Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ site nʼotu ndị Farisii na ndị otu Herọd, ile ma ha ga-esite nʼokwu ọnụ ya jide ya. 14Ha bịakwutere ya, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye eziokwu, ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ, kama ị na-ezi ụzọ Chineke nʼụzọ eziokwu. O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza ka ọ bụ na o zighị ezi? 15Anyị kwesiri ịkwụ ya ka ọ bụ anyị ekwesighị?”
Ma ebe ọ maara ihu abụọ ha, ya mere ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? Wetaranụ m otu mkpụrụ ego ka m lee ya anya.” 16Ha wepụtara otu mkpụrụ ego, Ọ sịrị, “Onye nwe onyinyo a? Aha onye ka e bikwasịrị nʼego a?”
Ha zara sị, “Ọ bụ nke Siza.”
17Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nyenụ Siza ihe bụ nke ya, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke ya.”
Ọsịsa ya jụkwara ha anya.
Ọlụlụ nwunye nʼoge mbilite nʼọnwụ
18Ụfọdụ ndị Sadusii bụ ndị sịrị na mbilite nʼọnwụ adịghị bịakwutere ya jụọ ya sị, 19“Onye ozizi, Mosis nyere anyị iwu na ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwunye nwoke ahụ, mụta ụmụ nʼaha nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ. 20Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, nke mbụ lụrụ nwunye ma ọ nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ọbụla. 21Nke abụọ lụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ma ya onwe ya nwụkwara na-amụtaghị nwa. 22Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha asaa mụtara nwa ọbụla, nʼikpeazụ nwanyị ahụ nwụkwara. 23Nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka ọ ga-abụ, ebe ụmụnne asaa ndị a lụtụchara ya?”
24Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu adịghị ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, maọbụ ike Chineke? 25Mgbe ha ga-esite nʼọnwụ bilie, ọlụlụ di na nwunye agaghị a dị; kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe. 26Ma nʼokwu banyere ndị nwụrụ anwụ isite nʼọnwụ bilie, ọ bụ na unu agụtabeghị nʼakwụkwọ Mosis ebe e dere maka ọhịa ahụ na-ere ọkụ, na otu Chineke si gwa ya, Abụ m Chineke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. 27Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ kama nke ndị dị ndụ. Nʼebe ahụ ka unu dahiere nke ukwuu.”
Iwu kachasị mkpa
28Otu nʼime ndị ozizi iwu bịara nʼoge ahụ ha na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na o nyere ha ezi ọsịsa, ọ jụrụ ya sị, “Nʼime iwu niile olee nke kachasị mkpa?”
29Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. 30Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’ 31Nke abụọ ya bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’ Ọ dịghị iwu ọzọ dị nke karịrị ndị a.”
32Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya. 33Ịhụ ya nʼanya site nʼiji obi gị niile, na nghọta gị niile, nakwa iji ike gị niile, nʼịhụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị, kachasị onyinye aja nsure ọkụ na ịchụ aja niile.”
34Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
Kraịst ọ bụ nwa onye?
35Mgbe Jisọs nọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ, ọ kwuru sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji sị na Kraịst bụ nwa Devid? 36Devid nʼonwe ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ kwuo sị,
“ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị,
“Nọdụ ala nʼaka nri m
ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị
nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’
37Devid nʼonwe ya kpọrọ ya Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ o si bụrụ nwa ya?”
Igwe mmadụ ahụ jiri obi ụtọ na-ege ya ntị.
Ịdọ aka na ntị banyere ndị ozizi iwu
38Dịka ọ na-ezi ihe, ọ siri, “Lezienụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, na ịnara ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa. 39Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla. 40Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.”
Onyinye nwanyị di ya nwụrụ
41Ọ nọdụrụ ala na ncherita ihu ebe igbe onyinye dị, sị ebe ahụ na-ahụ otu igwe mmadụ ahụ si etinye ego ha nʼime igbe onyinye. Ọtụtụ ndị ọgaranya tụnyere ego buru ibu. 42Otu nwanyị bụ ogbenye, nke di ya nwụrụ anwụ, bịara tinye mkpụrụ ego ọla abụọ nke pụtara otu peni.
43Ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nʼezie agwa m unu, nwanyị a di ya nwụrụ anwụ, bụkwa ogbenye, etinyela ego nʼime igbe onyinye a karịa ndị ọzọ. 44Nʼihi na ndị ọzọ sitere nʼịba ụba nke ego ha nwere tinye, ma nwanyị a sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o nwere, ọ bụladị ihe niile o ji biri.”

Você sabia?
Debates no templo
- Os saduceus, que dizem não haver ressurreição, interrogam Jesus sobre sete irmãos e uma viúva, apelando ao que Moisés escreveu. Ele os remete à sarça ardente no Livro de Moisés, onde Deus diz: “Eu sou o Deus de Abraão, o Deus de Isaque e o Deus de Jacó”. Abraão, “pai de uma multidão”, era filho de Terá; Isaque era o único filho de Abraão com Sara; e Jacó era o segundo dos filhos gêmeos de Isaque e Rebeca.Fontes: o próprio texto bíblico · Abraham · Isaac · Jacob (Israel)
- Quando lhe perguntam qual é o mandamento mais importante, Jesus começa: “Ouve, ó Israel, o Senhor, nosso Deus, o Senhor é um”, e acrescenta: “Ama o teu próximo como a ti mesmo”. Israel é outro nome de Jacó, o segundo dos gêmeos de Isaque e Rebeca; o nome Jacó é explicado como aquele que segue nos calcanhares de outro, ou suplantador.Fontes: o próprio texto bíblico · Jacob (Israel)
- Ensinando nos pátios do templo, Jesus pergunta como os escribas podem dizer que o Cristo é o Filho de Davi, se o próprio Davi o chama de “Senhor”. Davi, cujo nome significa “Amado”, era o oitavo e mais novo filho de Jessé, cidadão de Belém, e sua primeira ocupação foi cuidar das ovelhas do pai nas terras altas de Judá.Fontes: o próprio texto bíblico · David
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org