Nations Bible

Mateus 7

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Ikpe ndị ọzọ ikpe

1“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. 2Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu.

3“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya? 4Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ. 5Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya.

6“Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-azọtọ ha ma tụgharịakwa dọrie gị.

Rịọọnụ, chọọnụ, kụọnụ aka

7“Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ. 8Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.

9“Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute? 10Maọbụ, nwata ahụ arịọọ azụ, o nye ya agwọ? 11Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe ọ gaghị enye unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya! 12Ya mere, nʼime ihe niile, na-emeso ndị mmadụ dị ka i si chọọ ka ha mesoo gị. Nke a bụ nchịkọta ihe iwu na ndị amụma ziri.

Ụzọ dị warawara na ndị dị obosara

13“Sitenụ nʼọnụ ụzọ dị warawara banye. Nʼihi na ọnụ ụzọ ahụ dị obosara. Mbara ka ụzọ ahụ dịkwa na-eduba nʼịla nʼiyi. Ọtụtụ na-esoro ya. 14Ole na ole na-achọta ụzọ ahụ na-eduba na ndụ, nʼihi na ọ dị warawara, dịkwa nkpagide.

Osisi na mkpụrụ ya

15“Kpachapụnụ anya! Nʼihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nʼụdịdị atụrụ, ma ha bụ agụ. 16A ga-esite na mkpụrụ ha mata ndị ha bụ. Ndị mmadụ ọ na-esite nʼosisi ogwu dị nʼọhịa ghọta mkpụrụ osisi grepu, ka ha na-esite nʼosisi uke gbara nʼọhịa ghọta mkpụrụ fiig? 17Nʼụzọ dị otu a, osisi ọbụla dị mma na-amịpụta mkpụrụ ọma, ma osisi dị njọ na-amịpụta mkpụrụ dị njọ. 18Osisi na-amị mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịghịkwa amị mkpụrụ ọma. 19Ma osisi ọbụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka a ga-egbutu tụnye ya nʼọkụ. 20Ụzọ e si amata osisi ọma bụ site na mkpụrụ ya.

Ndị ga-abanye nʼalaeze

21“Ọ bụghị ndị niile na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-abanye nʼalaeze eluigwe, kama ọ bụ naanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nʼeluigwe na-achọ ka ha mee. 22Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ bụ na anyị ejighị aha gị buo amụma, jiri aha gị chụpụ mmụọ ọjọọ, ma jirikwa aha gị ruo ọtụtụ ọrụ ebube?’ 23Mgbe ahụ aga m agwa ha hoohaa sị ha, ‘Amaghị m unu, sitenụ nʼihu m pụọ, unu ndị ajọ omume!’

Ihe iso Jisọs Pụtara

24“Onye ọbụla ṅara ntị nʼokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume. 25Mmiri zosikwara ike nʼelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara, tie nʼụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nʼihi na e wuru ntọala ya nʼelu oke nkume. 26Ma ndị niile nụrụ okwu ndị a, ma lefuru ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nʼelu aja. 27Ngwangwa mmiri zoro, idee mmiri sọkwara, ifufe fesikwara ike tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala. Ọdịda ya dị ukwuu.”

28Mgbe Jisọs kwuchara okwu ndị a, ozizi ya juru igwe mmadụ ahụ niile anya. 29Nʼihi na o ziri ihe dịka onye nwere ikike. Ọ bụghị dị ka ndị ozizi iwu ha.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

O juízo, o caminho estreito e um alicerce firme

  • O registro do evento data o início do Sermão da Montanha em 28 d.C. e sua duração em um dia. Este capítulo termina com as multidões admiradas com o ensino de Jesus, porque ele ensinava como quem tem autoridade, e não como os escribas deles.Fontes: Sermon on the Mount · o próprio texto bíblico
  • Jesus adverte que o juízo que alguém pronuncia, e a medida que essa pessoa usa, voltarão sobre ela. Ele descreve alguém que repara no cisco no olho do irmão, mas não percebe a trave no próprio olho, e diz que a trave precisa ser removida primeiro.Fontes: o próprio texto bíblico
  • O capítulo chama de essência da Lei e dos Profetas fazer aos outros o que se gostaria que lhe fizessem. Ele contrasta uma porta larga e um caminho espaçoso que leva à destruição, pelo qual muitos entram, com uma porta pequena e um caminho estreito que leva à vida, que poucos encontram, e compara ouvir essas palavras e praticá-las a uma casa construída sobre a rocha, e não sobre a areia.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.