Mateus 4
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ọnwụnwa a nwara Jisọs nʼọzara
1Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisọs baa nʼọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. 2Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. 3Mgbe ahụ onye ọnwụnwa ahụ bịakwutere ya sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.”
4Ma Jisọs zara, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.’ ”
5Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu, 6sị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị,
“ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,
ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha
ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’”
7Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa.’ ”
8Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha. 9Ọ sịrị ya, “Aga m enye gị ha niile ma ọ bụrụ na ị daa nʼala kpọọ isiala nye m.”
10Ma Jisọs sịrị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ”
11Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ya, nọnyere ya, na-ejere ya ozi.
Jisọs ebido ọrụ nkwusa
12Mgbe Jisọs nụrụ na e tinyela Jọn nʼụlọ mkpọrọ, ọ pụrụ gaa Galili. 13Emesịa, ọ hapụrụ Nazaret gaa biri na Kapanọm, bụ obodo dị nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ dị nso nʼoke ala Zebụlọn na Naftalị. 14Nʼụzọ dị otu a, amụma ahụ Aịzaya buru mezuru. Amụma nke sịrị,
15“Ala Zebụlọn na ala Naftalị,
nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan,
Galili nke ndị mba ọzọ,
16ndị nọ nʼọchịchịrị
ahụla ìhè dị ukwuu.
Ndị bi nʼala onyinyo ọnwụ
ka ìhè nwukwasịrị.”
17Site nʼoge ahụ gaa nʼihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.”
Ọkpụkpọ ndị na-eso ụzọ ya
18Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ. 19Ọ sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” 20Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya.
21Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha, 22ngwangwa ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya.
Jisọs agwọọ ndị ọrịa
23Jisọs jegharịrị nʼobodo niile nke Galili, na-akụzi ihe nʼụlọ nzukọ niile ha, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche nʼetiti ndị ahụ. 24Akụkọ banyere ya gbasara jezuo akụkụ Siria niile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha niile. 25Ọtụtụ mmadụ sitere na Galili, Dekapọlịs, Jerusalem, Judịa na nʼofe osimiri Jọdan, soro ya.

Você sabia?
Do deserto às margens da Galileia
- O tentador neste capítulo é chamado tanto de diabo como de Satanás, nome que significa "adversário" ou "acusador". Um dicionário bíblico observa que, no Novo Testamento, Satanás é usado de forma intercambiável com o diabo, e que ele tentou Jesus no deserto. Depois de jejuar quarenta dias e quarenta noites, Jesus recusou as exigências de transformar pedras em pão, de lançar-se do pináculo do templo e de adorar Satanás em troca dos reinos do mundo, respondendo com as Escrituras até que o diabo o deixou e anjos o serviram.Fontes: o próprio texto bíblico · Satan
- Quando Jesus soube que João tinha sido preso, retirou-se para a Galileia, deixou Nazaré e foi morar em Cafarnaum, à beira-mar, na região de Zebulom e Naftali, mudança que Mateus liga a palavras ditas por meio do profeta Isaías. Uma nota geográfica explica que a Galileia permaneceu por muito tempo ocupada por seus antigos habitantes e por isso passou a ser chamada "Galileia dos gentios". Cafarnaum não é mencionada no Antigo Testamento; um verbete sobre o lugar diz que, depois de Jesus ser expulso de Nazaré, ela se tornou a sua própria cidade.Fontes: o próprio texto bíblico · Galilee · Capernaum
- Caminhando à beira do mar da Galileia — um lago que o Evangelho de João também chama de mar de Tiberíades, com cerca de doze milhas e meia de comprimento —, Jesus chamou dois pares de irmãos que trabalhavam como pescadores. Simão, chamado Pedro, e André estavam lançando uma rede; um dicionário bíblico observa que André, de Betsaida, fora primeiro discípulo de João Batista, e que os dois irmãos só se tornaram acompanhantes habituais de Jesus depois da prisão de João. Mais adiante, Tiago e João, filhos de Zebedeu, estavam num barco com o pai consertando redes; Jesus os chamou, e os dois pares deixaram o trabalho e o seguiram.Fontes: o próprio texto bíblico · Andrew · James (Son of Zebedee) · Sea of Galilee
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 5, 25
- Galilee · 32.760, 35.527 · versículos 12, 13, 15, 23, 25
- Judea · Hoje: Judea 1 · 31.777, 35.234 · versículos 12, 25
- Nazareth · 32.702, 35.298 · versículo 13
- Jordan · Hoje: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículos 15, 25
- Sea of Galilee · 32.819, 35.590 · versículo 18
- Syria · Hoje: Syria 2 · 33.511, 36.306 · versículo 24
- Decapolis · 32.717, 35.800 · versículo 25
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org