Mateus 11
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ozi Jọn ziri ka e zie Jisọs
1Mgbe Jisọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ pụọ. Bido na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-ezisa oziọma.
2Jọn omee baptizim nọkwa nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube niile nke Kraịst na-arụ, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya. 3Ọ gwara ha ka ha jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ọbịbịa ya, ka ọ bụ onye ọzọ?”
4Jisọs zara ha sị, “Laghachinụ azụ gwa Jọn banyere ihe unu nụrụ na ihe anya unu hụrụ. 5Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, na-ekwu okwu. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ ya ihe banyere oziọma a na-ezisara ndị ogbenye. 6Ziekwanụ ya ozi a, na ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.”
7Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nʼọzara ịhụ Jọn, gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị? 8Ma ọ bụghị otu a, gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? Ma lee ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa na-anọ nʼụlọ eze. 9Ma gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, asị m unu, ọ bụ onye karịrị onye amụma. 10Onye bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ sị,
“ ‘Lee, aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị,
onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’
11Nʼezie, ọ dịghị nwoke ọbụla nʼetiti ndị nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe dị ukwuu karịa ya. 12Site nʼụbọchị ndị ahụ Jọn omee baptizim malitere ọrụ ya ruo ugbu a, ihe banyere alaeze eluigwe na-agabiga ihe ike. Otu a kwa ndị dị ike na-abagidekwa ya. 13Nʼihi na tupu Jọn abịa, iwu na ndị amụma niile buru amụma banyere alaeze a. 14Ọ bụrụkwa na unu jikeere ịnabata ya, ọ bụ ya bụ Ịlaịja ahụ, nke na a ga ịbịa. 15Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
16“Gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị na-egwuri egwu nʼama, ndị na-asị ibe ha,
17“ ‘Anyị gburu unu ọja,
ma unu ekweghị ete egwu.
Anyị bụụrụ unu abụ ịkwa ozu,
ma unu akwaghị akwa.’
18Jọn bịara na-erighị achịcha maọbụ ihe ọṅụṅụ. Ha sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’ 19Ma Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ. Ha sị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ abịala, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ Ma amamihe na-esite nʼọrụ ya gosiri na ihe o mere dị mma.”
Abụmọnụ nye obodo ndị na-ekwenyeghị
20Mgbe ahụ ọ bidoro ịbụ obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ọnụ, nʼihi na obodo ndị a echegharịghị. 21“Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịkwara gị Betsaida. Nʼihi na a sị na ọ bụ nʼime Taịa na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ nʼime unu, ha gaara echegharị ma gosikwa nchegharị ha site nʼiyi uwe mkpe na ikpokwasị onwe ha ntụ nʼisi. 22Nʼezie asị m unu na ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn. 23Ma gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba, ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na a sị na a rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nʼime gị nʼobodo Sọdọm, a garaghị ala ya nʼiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa. 24Nʼezie asị m unu, ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sọdọm.”
Izuike nye ndị ike gwụrụ
25Nʼoge ahụ, Jisọs kwuru sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị, nʼihi na ị zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị. 26E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a.
27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya.
28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”

Você sabia?
A pergunta de João e as cidades que não se arrependeram
- Da prisão, João enviou seus discípulos para perguntar se Jesus era aquele que havia de vir. Jesus disse às multidões que João era mais do que um profeta — o mensageiro enviado adiante para preparar o caminho — e, se estivessem dispostos a aceitar, o Elias que havia de vir. Um dicionário bíblico chama João de precursor e diz que sua missão já era objeto de profecia, citando Isaías 40:3 e Malaquias 3:1; também apresenta Elias como o Elias do Novo Testamento.Fontes: o próprio texto bíblico · John the Baptist · Elijah
- Em seguida, Jesus denunciou Corazim, Betsaida e Cafarnaum, onde havia realizado a maior parte de seus milagres, porque não se arrependeram. Um dicionário identifica Corazim com a atual Kerazeh, cerca de duas milhas e meia subindo o uádi Kerazeh a partir de Cafarnaum, e diz que Cafarnaum, ausente do Antigo Testamento, tornou-se a própria cidade de Jesus depois que ele deixou Nazaré. Situa Betsaida no lado leste do lago, duas milhas acima ao longo do Jordão, na Gaulanítide, ampliada por Filipe, o tetrarca, e chamada Júlias em honra da filha do imperador, embora alguns tenham suposto que havia apenas uma Betsaida, perto de onde o Jordão entra no lago.Fontes: o próprio texto bíblico · Chorazin · Capernaum · Bethsaida
- Ele contrapôs essas cidades a Tiro e Sidom, que, segundo ele, teriam se arrependido há muito, em pano de saco e cinza, e a Sodoma, que, disse, ainda existiria até hoje. Sidom, na costa do Mediterrâneo, cerca de vinte e cinco milhas ao norte de Tiro, era a mais antiga cidade fenícia dali e a cidade-mãe de Tiro. Um dicionário afirma que o comércio do mundo inteiro se reunia nos armazéns de Tiro e que Sodoma, no vale de Sidim, foi destruída por fogo do céu de modo tão completo que não se encontrou vestígio dela.Fontes: o próprio texto bíblico · Sidon · Tyre · Sodom
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Galilee · 32.760, 35.527 · versículo 1
- Sidon · Hoje: Sandikli archaeological site in Sidon · 33.561, 35.372 · versículos 21, 22
- Tyre · 33.271, 35.196 · versículos 21, 22
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org