Lucas 9
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Jisọs ezipu ndị ozi iri na abụọ
1Mgbe ọ kpọkọtara ndị ozi iri na abụọ ahụ, o nyere ha ike na ịchị isi nʼebe mmụọ ọjọọ niile nọ na ịgwọ ọrịa dị iche iche. 2O nyere ha ikike, zipụ ha ikwusa alaeze Chineke na ịgwọ ndị nrịa nrịa. 3Ọ gwara ha sị, “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, maọbụ mkpanaka maọbụ akpa, maọbụ achịcha maọbụ ego maọbụ uwe abụọ. 4Ụlọ ọbụla unu banyere, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ. 5Ma ebe ọbụla a na-anabataghị unu, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ nʼobodo ahụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.” 6Ha gara nʼobodo nta niile na-ekwusa oziọma na-agwọkwa ndị ọrịa nʼebe niile.
7Mgbe Herọd onye ọchịchị nụrụ akụkọ banyere ihe niile merenụ, ọ gbagwojuru ya anya nʼihi na ụfọdụ mmadụ na-asị, na Jọn omee baptizim esitela na ndị nwụrụ anwụ bilie. 8Ndị ọzọ na-asị na Ịlaịja apụtala, ebe ndị ọzọ na-asị na otu nʼime ndị amụma ochie apụtakwala ndụ ọzọ. 9Ma Herọd sịrị, “Mụ onwe bipụrụ isi Jọn. Onye bụkwa onye a nke m na-anụ ihe banyere ya?” Ọ gụrụ ya agụụ ịhụ ya.
Jisọs enye puku mmadụ ise nri
10Mgbe ndị ozi a lọtara, ha kọọrọ ya ihe niile ha mere. Ọ kpọọrọ ha gaa nʼobodo a na-akpọ Betsaida ebe ha ga-anọ naanị ha. 11Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. Ọ nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma.
12Mgbe anwụ bidoro ịda, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ bịakwutere ya sị ya, “Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼime obodo na nʼobodo nta ndị gbara ebe a gburugburu, ka ha chọtara onwe ha nri na ebe ndina nʼihi na ebe a anyị nọ bụ ọzara.”
13Ọ zara ha sị, “Unu nye ha nri ka ha rie.”
Ha zaghachiri ya sị, “Anyị nwere naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ. Ma ọ bụghị na anyị ga aga zụọra mmadụ ndị a niile nri.” 14Ndị nọ nʼebe ahụ ruru puku ndị nwoke ise.
Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Meenụ ka ha nọdụ ala nʼigwe nʼigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.” 15Ha mere otu ahụ, mee ka ha niile nọdụ ala. 16O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ. 17Ha niile riri rijuokwa afọ, a tụtụkọtara ihe fọdụrụ, tụtụjuo nkata iri na abụọ nʼiberibe achịcha fọdụrụ.
Ọgbụgba ama Pita
18Otu ụbọchị mgbe ọ nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka igwe mmadụ na-asị na m bụ?”
19Ha zara sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ sị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọkwa, sị na ị bụ otu nʼime ndị amụma ochie ahụ si nʼọnwụ bilie.”
20Ma ọ jụrụ ha, “Unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?”
Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst nke Chineke.”
Jisọs ekwuo ihe banyere ọnwụ ya
21Ma ọ dọrọ ha aka na ntị, nyesiekwa ha iwu ike ka ha ghara ịgwa onye ọbụla nke a, 22na-asị, “Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche. Ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya. Aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.”
23Mgbe ahụ ọ sịkwara ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m nʼazụ, ọ ghaghị ịjụ onwe ya ma buru obe ya kwa ụbọchị na-eso m. 24Nʼihi na onye ọbụla chọrọ ịzọpụta ndụ ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla nke tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-azọpụta ya. 25Uru gịnị ka mmadụ nwere ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya, maọbụ bụrụ onye a napụrụ ndụ ya? 26Onye ọbụla ihere m na ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa Nwa nke Mmadụ mgbe ọ ga-abịa nʼebube ya, na nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.
27“Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke.”
Nnwogha Jisọs
28Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ọ kpọọrọ Pita na Jọn na Jemis gaa nʼelu ugwu ikpe ekpere. 29Mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere, ụdịdị ihu ya gbanwere. Uwe ya bidoro ịchaa ọcha nke ukwuu. 30Nʼotu ntabi anya, ha hụrụ ndị ikom abụọ ka ha na ya na-ekwu okwu. Ha bụ Mosis na Ịlaịja. 31Ha pụtara nʼebube eluigwe dị ukwu na-ekwu banyere nlaghachi ya, nke ọ na-aga imezu na Jerusalem. 32Pita na ndị ya na ha nọ na-arahụ ụra. Mgbe ha tetara, ha hụrụ ebube ya na ndị ikom abụọ ya na ha nọ na-ekwurịta okwu. 33Mgbe ha na-ahapụ ya, Pita sịrị Jisọs, “Nna anyị ukwu, ọ ga-adị mma ka anyị nọrọ ebe a ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ, otu ga-abụ nke gị, otu ga-abụ nke Mosis, otu ga-abụkwa nke Ịlaịja.” Ọ mataghị ihe ọ na-ekwu.
34Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Egwu tụkwara ha dị ka ha na-aba nʼigwe ojii ahụ. 35Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họpụtara; geenụ ya ntị.” 36Mgbe olu ahụ kwusiri okwu, ha chọpụtara na Jisọs nọ naanị ya. Ndị na-eso ụzọ ya kpuchiri ọnụ ha, debe ihe niile nʼobi ha, ọ dịkwaghị onye ọbụla ha gwara ihe ha hụrụ.
Ọgwụgwọ nwa nwoke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya
37Nʼechi ya, mgbe ha si nʼugwu ahụ rịdata, oke igwe mmadụ bịara zute ya. 38Otu nwoke si nʼetiti igwe mmadụ ahụ jiri oke olu tie mkpu sị, “Onye ozizi, arịọ m gị ka i lee nwa m nwoke anya, nʼihi na naanị ya bụ nwa m nwere. 39Mmụọ ọjọọ na-ejide ya mee ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-atụda ya nʼala, na-ese ya ese, na-adọkwa ya adọ mee ka ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ. Ọ dịghị mgbe ọ na-ahapụ ya kama ọ na-echihịasị ya ahụ. 40Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike.”
41Jisọs zara sị, “Leenụ ọgbọ rụrụ arụ, nke na-enweghị okwukwe! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ, ruokwa olee mgbe ka m ga-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwa gị nwoke ahụ nʼebe a!”
42Mgbe ọ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwadara ya nʼala sesie ya ike, ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba. Ọ gwọrọ nwata ahụ kpọnyekwa ya nna ya. 43Ebube ukwu nke Chineke tụrụ ha nʼanya.
Jisọs ekwuo ihe banyere ọnwụ ya ọzọ
Ma mgbe onye ọbụla nọ na mgbagwoju anya nʼihi ọrụ ọ rụrụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, 44“Geenụ ntị nke ọma banyere ihe m chọrọ ịgwa unu. A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ.” 45Ma ha aghọtaghị okwu a. E zonarịrị ya nʼebe ha nọ ka ha ghara ịghọta ya. Egwu tụkwara ha ịjụ ya ihe ọ pụtara.
Onye karịrị ibe ya ukwuu?
46Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha banyere onye karịrị ibe ya ukwuu. 47Ebe Jisọs ma ihe ha na-eche, ọ kpọtara otu nwantakịrị mee ka o guzo nʼakụkụ ya. 48Ọ gwara ha sị, “Onye ọbụla nabatara nwata a nʼaha m, nabatara m. Onye ọ bụlakwa nabatara m, nabatara onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nʼetiti unu bụ onye kachasị ukwuu.”
49Jọn a zaa sị, “Nna anyị ukwu, anyị hụrụ otu onye ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị anyị, anyị gbochiri ya.”
50Jisọs sịrị ya, “Unu egbochila ya. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide unu dịnyeere unu.”
Nguzogide site nʼaka ndị Sameria
51Mgbe oge o ji alaghachi na-abịaru nso, o chere ihu ya ịga Jerusalem. 52O zipụrụ ndị ozi, ka ha buru ya ụzọ gawa. Ka ha na-aga ha batara nʼotu obodo nta nke ndị Sameria ịkwado ihe niile tupu ọ bịa; 53ma ha jụrụ ịnabata ya nʼihi na o chere ihu ịga Jerusalem. 54Mgbe Jemis na Jọn ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nʼeluigwe bịa laa ha nʼiyi?” 55Ọ tụgharịrị bara ha mba. 56Ma ha pụrụ banye nʼobodo nta ọzọ.
Ihe ọ ga-efu iso Jisọs
57Mgbe ha nọ na-aga ije a, otu nwoke sịrị ya, “Aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.”
58Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ, ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe ọ na-atụkwasị isi.”
59Ọ gwara onye ọzọ sị, “Soro m.”
Ma ọ sịrị ya. Onyenwe anyị, “Biko, nye m ohere ka m gaa buru ụzọ lie nna m.”
60Ma ọ sịrị ya, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha. Ma gị gaa kwusaa alaeze nke Chineke.”
61Ma onye ọzọkwa, sịrị ya, “Aga m eso gị, Onyenwe m, ma kwere ka m buru ụzọ gaa sị ndị ezinaụlọ m nọdụnụ nke ọma.”
62Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla jidere aka nʼọgụ anụ ụlọ na-adọkpụ ma na-ele anya nʼazụ ekwesighị alaeze Chineke.”

Você sabia?
Missão, identidade e o caminho para Jerusalém
- Herodes, o tetrarca, perplexo com o que se dizia de Jesus, é Herodes Antipas, filho de Herodes com Malthace. Ele disse que tinha decapitado João, enquanto alguns afirmavam que João havia ressuscitado dos mortos, outros que Elias, o tesbita, o "Elias" do Novo Testamento, tinha aparecido, e outros ainda que um antigo profeta havia surgido. Uma cronologia desses acontecimentos data a decapitação de João em 29 d.C.Fontes: Herod Antipas · Elijah · John Beheaded · o próprio texto bíblico
- Depois que os apóstolos voltaram, Jesus retirou-se com eles para uma cidade chamada Betsaida, onde acolheu as multidões, falou do reino de Deus e alimentou cerca de cinco mil homens com cinco pães e dois peixes. O dicionário bíblico de Easton (1897) situa essa Betsaida no lado leste do lago, a duas milhas rio Jordão acima, na região de Gaulonitis; Filipe, o tetrarca, ampliou-a e chamou-a Julias, por causa da filha do imperador. Alguns supuseram que havia apenas uma Betsaida, construída dos dois lados do lago, perto de onde o Jordão nele entra; o verbete identifica as ruínas como et-Tel.Fontes: Bethsaida · o próprio texto bíblico
- Pedro, chamado originalmente Simão, respondeu que Jesus é "o Cristo de Deus". Cerca de oito dias depois, Jesus levou Pedro, Tiago e João a um monte para orar; Moisés e Elias apareceram em glória e falaram da partida que Jesus estava para cumprir em Jerusalém. Tiago, irmão mais velho de João e pescador em sociedade com Pedro, estava com eles; ele e João eram chamados Boanerges, "filhos do trovão", provavelmente por causa de sua ousadia e energia, e mais tarde perguntaram se deviam fazer descer fogo do céu sobre uma aldeia de samaritanos que não quis receber Jesus, porque ele seguia para Jerusalém.Fontes: Simon Peter · James (Son of Zebedee) · o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org